2 Ihe E Mere 13:1-22
13 Ọ bụ n’afọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Eze Jeroboam ka Abaịja malitere ịchị Juda.+
2 Afọ atọ ka ọ chịrị na Jeruselem; aha nne ya bụ Mịkaya,+ nwa Yurayel onye Gibia.+ Agha dakwara n’etiti Abaịja na Jeroboam.+
3 Abaịja wee chịrị narị puku ndị agha anọ bụ́ ndị dike a họrọ ahọ buo agha.+ Jeroboam wee chịrị narị puku dimkpa asatọ bụ́ ndị dike a họrọ ahọ. O wee hazie ha n’usoro ma buso ya agha.+
4 Abaịja wee guzoro n’Ugwu Zemareyim, nke dị n’ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu, wee sị: “Geenụ m ntị, Jeroboam na Izrel dum.
5 Ọ̀ bụ na unu ekwesịbeghị ịmata na Jehova bụ́ Chineke Izrel sitere n’ọgbụgba ndụ nnu+ nye Devid+ na ụmụ ya alaeze+ ka ha na-achị Izrel ruo mgbe ebighị ebi?+
6 Jeroboam+ nwa Nibat, bụ́ onye na-ejere Sọlọmọn nwa Devid ozi,+ wee bilie nupụrụ onyenwe ya+ isi.+
7 Ndị ikom na-enweghị ihe ha na-arụ,+ bụ́ ndị na-abaghị n’ihe,+ wee sonyere ya. N’ikpeazụ, ike ha karịrị nke Rehoboam nwa Sọlọmọn, mgbe Rehoboam+ ka bụ nwata obi na-esighị ike,+ o nweghị ike iguzogide ha.
8 “Ugbu a, unu na-eche echiche imegide alaeze Jehova nke dị n’aka ụmụ Devid,+ ebe unu bụ nnukwu ìgwè mmadụ+ ma nwee ụmụ ehi ọlaedo Jeroboam meere unu ka ha bụrụ chi.+
9 Ọ̀ bụ na unu achụpụbeghị ndị nchụàjà Jehova,+ bụ́ ụmụ Erọn, na ndị Livaị, ọ̀ bụ na unu adịghị emere onwe unu ndị nchụàjà dị ka ndị ala ọzọ?+ Onye ọ bụla nke bịara mee onwe ya onye nchụàjà site n’iweta nwa oké ehi na ebule asaa, ya aghọọ onye nchụàjà nke ihe ndị na-abụghị chi.+
10 Ma anyị onwe anyị, ọ bụ Jehova bụ Chineke anyị,+ anyị ahapụghị ya; ndị nchụàjà, bụ́ ụmụ Erọn, na-ejere Jehova ozi, ndị Livaị na-arụkwa ọrụ ha.+
11 Ha na-esurekwara Jehova àjà nsure ọkụ nakwa ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ+ kwa ụtụtụ na mgbede;+ achịcha ndị e doro n’usoro dịkwa n’elu tebụl e ji ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ,+ e nwekwara ihe ndọba oriọna e ji ọlaedo rụọ+ na oriọna ha maka ịmụnye ọkụ kwa mgbede;+ n’ihi na anyị na-erubere Jehova bụ́ Chineke anyị isi,+ ma unu ahapụwo ya.+
12 Ma, lee! ọ bụ ezi Chineke bụ onyeisi anyị,+ tinyere ndị nchụàjà ya, anyị jikwa opi mgbaàmà+ ndị anyị ga-eji fụọ opi agha megide unu. Ụmụ Izrel, unu ebusola Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà agha,+ n’ihi na unu agaghị enwe ihe ịga nke ọma.”+
13 Ma Jeroboam zipụrụ ndị agha ka ha gaa zoo n’azụ ha, ha wee nọrọ ndị Juda n’ihu, ndị agha ahụ zoro ezo anọrọkwa ha n’azụ.
14 Mgbe ndị Juda tụgharịrị, lee, e si n’ihu na azụ na-ebuso ha agha. Ha wee malite itiku Jehova,+ ka ndị nchụàjà nọ na-afụsi opi ike.
15 Ndị ikom Juda wee malite iti mkpu agha.+ O wee ruo na mgbe ndị ikom Juda tiri mkpu agha, ezi Chineke meriri+ Jeroboam na Izrel dum n’ihu Abaịja+ na ndị Juda.
16 Ụmụ Izrel wee si n’ihu Juda gbaa ọsọ. Chineke wee nyefee ha n’aka ha.+
17 Abaịja na ndị ya wee sụọ ha akwụ; narị puku ndị ikom ise a họrọ ahọ bụ́ ndị Izrel e gburu egbu wee daa.
18 E wee si otú a weda ndị Izrel ala n’oge ahụ, ma ụmụ Juda meriri ha n’ihi na ha dabeere+ n’ebe Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha nọ.
19 Abaịja wee chụrụ Jeroboam na-aga wee nara ya obodo dị iche iche, Betel+ na obodo nta ya niile, na Jeshana na obodo nta ya niile, na Ifren na obodo nta ya niile.+
20 Ike adịkwaghị+ Jeroboam n’ụbọchị Abaịja; kama Jehova tiri ya ihe otiti,+ o wee nwụọ.
21 Abaịja wee na-esiwanye ike.+ Ka oge na-aga, ọ lụrụ ụmụ nwaanyị iri na anọ,+ o wee mụọ ụmụ nwoke iri abụọ na abụọ+ na ụmụ nwaanyị iri na isii.
22 Ma ihe ndị ọzọ metụtara Abaịja, ọbụna ụzọ ya na ihe ndị o kwuru, e dere ha n’akwụkwọ nkọwa Ido onye amụma.+