2 Ihe E Mere 12:1-16
12 O wee ruo na ozugbo e mere ka ọbụbụeze Rehoboam guzosie ike,+ nakwa ozugbo ọ dịrị ike, ọ hapụrụ iwu Jehova,+ ya na Izrel niile.+
2 O wee ruo n’afọ nke ise nke ọchịchị Eze Rehoboam+ na Shaịshak+ eze Ijipt busoro Jeruselem agha, (n’ihi na ha mesoro Jehova omume ekwesịghị ntụkwasị obi,)+
3 o ji narị ụgbọ ịnyịnya iri na abụọ+ na puku mmadụ iri isii ndị na-agba ịnyịnya; a pụghị ịgụta ndị si Ijipt soro ya bịa ọnụ+—ndị Libia,+ ndị Sọkiyim na ndị Itiopia.+
4 O wee weghara obodo ndị e wusiri ike nke Juda+ ma mesịa rute Jeruselem.+
5 Ma Shemaya+ onye amụma bịakwutere Rehoboam na ndị isi Juda bụ́ ndị gbakọtara na Jeruselem n’ihi Shaịshak wee sị ha: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Unu onwe unu ahapụwo m,+ mụ onwe m ahapụwokwa unu+ n’aka Shaịshak.’”
6 Ndị isi Izrel na eze wee weda onwe ha ala+ wee sị: “Jehova bụ onye ezi omume.”+
7 Mgbe Jehova hụrụ+ na ha ewedawo onwe ha ala, okwu Jehova ruru Shemaya+ ntị, sị: “Ha ewedawo onwe ha ala.+ Agaghị m ebibi ha, n’oge na-adịghị anya, m ga-eme ka ha lanahụ, agaghịkwa m awụkwasị Jeruselem ọnụma m site n’aka Shaịshak.+
8 Kama ha ga-aghọ ndị na-ejere ya ozi,+ ka ha wee mara ihe dị iche n’ijere m ozi+ na ijere alaeze nke ala dị iche iche ozi.”+
9 Shaịshak+ eze Ijipt wee buso Jeruselem agha, o bukọkwaara akụ̀ dị n’ụlọ Jehova+ nakwa akụ̀ dị n’ụlọ eze.+ O buuru ihe niile; o wee buru ọta ọlaedo ndị Sọlọmọn rụrụ.+
10 Eze Rehoboam wee were ọla kọpa rụọ ọta iji dochie ha, o wee nyefee ha n’aka ndị isi ndị ọgba ọsọ,+ bụ́ ndị nche+ ọnụ ụzọ ụlọ eze.+
11 Mgbe ọ bụla eze bịara n’ụlọ Jehova, ndị ọgba ọsọ na-abata buru ha, ha na-ebughachikwa ha n’ụlọ nche nke ndị ọgba ọsọ.+
12 Iwe Jehova na-eweso ya dajụrụ+ n’ihi na o wedara onwe ya ala, o cheghịkwa echiche ịla ha n’iyi kpamkpam.+ E wezụgakwa nke ahụ, e nwere ezi ihe a na-eme na Juda.+
13 Eze Rehoboam wee na-eme ka ọchịchị ya sie ike na Jeruselem, o wee na-achị; Rehoboam+ gbara afọ iri anọ na otu mgbe ọ malitere ịchị, afọ iri na asaa ka ọ chịrị na Jeruselem, bụ́ obodo+ Jehova họọrọ n’ime ebo niile nke Izrel ka aha ya dịrị na ya.+ Aha nne ya bụ Neama,+ nwaanyị Amọn.+
14 Ma o mere ihe ọjọọ,+ n’ihi na o tinyeghị obi ya n’ịchọ Jehova.+
15 Ma ihe ndị metụtara Rehoboam, ndị mbụ na ndị ikpeazụ,+ ọ̀ bụ na e deghị ha n’okwu Shemaya+ onye amụma nakwa na nke Ido+ onye ọhụụ, bụ́ ndị e dere dị ka ihe ndekọ usoro ọmụmụ si dị? Rehoboam+ na Jeroboam+ nọkwa na-alụ agha oge niile.
16 N’ikpeazụ, Rehoboam sooro nna nna ya hà dinaa,+ e wee lie ya n’Obodo Devid;+ Abaịja+ nwa ya wee malite ịchị n’ọnọdụ ya.