2 Ihe E Mere 11:1-23
11 Mgbe Rehoboam rutere Jeruselem,+ ọ kpọkọtara ụlọ Juda na Benjamin ozugbo,+ otu narị puku ndị ikom na iri puku asatọ ndị gbasiri ike a họrọ ahọ maka ibu agha,+ ka ha gaa buso Izrel agha iji mee ka Rehoboam nwetaghachi alaeze ahụ.
2 Okwu Jehova wee ruo Shemaya+ bụ́ onye nke ezi Chineke ntị, sị:
3 “Gwa Rehoboam nwa Sọlọmọn eze Juda+ na ndị Izrel niile bi na Juda nakwa na Benjamin, sị:
4 ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Unu agbagola ibuso ụmụnne unu agha.+ Laghachinụ, onye ọ bụla n’ụlọ ya, n’ihi na ihe a na-emenụ si m n’aka.”’”+ Ha wee rube isi n’ihe Jehova kwuru wee ghara ịga buso Jeroboam agha.+
5 Rehoboam wee biri na Jeruselem ma wuo obodo ndị siri ike na Juda.
6 O wee wughachi Betlehem+ na Itam+ na Tekoa,+
7 na Bet-zọọ na Soko+ na Adọlam,+
8 na Gat+ na Marisha na Zif,+
9 na Adoreyim na Lekish+ na Azika,+
10 na Zora na Aịjalọn na Hibrọn,+ bụ́ obodo ndị e wusiri ike, ndị dị na Juda nakwa na Benjamin.
11 O mekwara ka ebe ndị e wusiri ike sikwuo ike+ ma debe ndị ndú+ na ihe oriri na mmanụ na mmanya n’ime ha,
12 o debekwara ọta ukwu+ na ube+ n’obodo niile; o wee mee ka ha sikwuo ike nke ukwuu. Juda na Benjamin wee bụrụ nke ya.
13 Ndị nchụàjà na ndị Livaị, ndị nọ n’Izrel dum, si n’ókèala ha niile bịa kwado ya.
14 N’ihi na ndị Livaị hapụrụ ala ịta ahịhịa ha+ na ala ha+ wee bịa na Juda na Jeruselem,+ n’ihi na Jeroboam+ na ụmụ ya kwụsịrị ha ịrụ ọrụ+ dị ka ndị nchụàjà Jehova.
15 O wee họpụtara onwe ya ndị nchụàjà maka ebe ndị dị elu+ nakwa maka ndị mmụọ ọjọọ yiri ewu+ nakwa maka ụmụ ehi o mere.+
16 Ndị ji obi ha na-achọ Jehova bụ́ Chineke Izrel si n’ebo niile nke Izrel soro ha bịa na Jeruselem+ ịchụrụ+ Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha àjà.
17 Ha wee na-eme ka alaeze Juda+ dị ike, na-akwadokwa Rehoboam nwa Sọlọmọn ruo afọ atọ, n’ihi na ha gbasoro ụzọ Devid na Sọlọmọn ruo afọ atọ.+
18 Rehoboam wee lụọ Mehalat ada Jerimọt nwa Devid, onye bụkwa nwa Abihel bụ́ ada Elayab+ nwa Jesi.
19 O wee mụọrọ ya ụmụ ndị ikom, bụ́ Jiọsh na Shemaraya na Zeham.
20 Mgbe ọ lụsịrị ya, ọ lụrụ Meaka+ nwa nwa Absalọm.+ Ka oge na-aga, ọ mụụrụ ya Abaịja+ na Ataị na Zaịza na Shelomit.
21 Rehoboam hụrụ Meaka nwa nwa Absalọm n’anya karịa ndị nwunye ya niile ọzọ+ na ndị iko ya; n’ihi na ọ lụrụ ụmụ nwaanyị iri na asatọ, nweekwa ndị iko iri isii, nke mere na ọ mụrụ ụmụ nwoke iri abụọ na asatọ na ụmụ nwaanyị iri isii.
22 N’ihi ya, Rehoboam mere Abaịja nwa Meaka onyeisi, ka ọ bụrụ onye ndú n’etiti ụmụnne ya, n’ihi na o bu n’obi ime ya eze.
23 Otú ọ dị, o ji nghọta mee ihe+ wee kesasịa ụfọdụ n’ime ụmụ ya ndị ikom n’ala niile nke Juda na Benjamin, n’obodo niile e wusiri ike,+ nyekwa ha ihe oriri n’ụba+ ma lụtara ha ọtụtụ ụmụ nwaanyị.+