2 Ihe E Mere 1:1-17

1  Aka wee na-esi Sọlọmọn nwa Devid ike n’ọbụbụeze ya,+ Jehova bụ́ Chineke ya nọnyeere ya+ ma na-eme ka ọ dị nnọọ ukwuu.+  Sọlọmọn wee gwa Izrel dum okwu, gwakwa ndị isi nke otu puku otu puku ndị agha+ na ndị isi nke otu narị otu narị ndị agha+ nakwa ndị ikpe+ na ndị isi niile nke Izrel dum,+ bụ́ ndị isi nke ọnụmara dị iche iche.+  Sọlọmọn na ọgbakọ ahụ dum ya na ha nọ wee gaa n’ebe dị elu nke dị na Gibiọn;+ n’ihi na ọ bụ n’ebe ahụ ka ụlọikwuu nzute+ nke ezi Chineke dị, bụ́ nke Mozis ohu+ Jehova wuru n’ala ịkpa.  Otú ọ dị, Devid esiwo na Kiriat-jierim+ bugote igbe+ ezi Chineke n’ebe Devid kwadebeere ya,+ n’ihi na ọ maara ya ụlọikwuu na Jeruselem.+  A dọbakwara ebe ịchụàjà e ji ọla kọpa rụọ,+ nke Bezalel+ nwa Yuraị nwa Họọ+ rụrụ, n’ihu ụlọikwuu Jehova; Sọlọmọn na ọgbakọ ahụ jụkwara ase n’ihu ya, dị ka ha na-emebu.  Sọlọmọn wee chụọ àjà n’ihu Jehova n’ebe ahụ n’elu ebe ịchụàjà ahụ e ji ọla kọpa rụọ nke dị n’ụlọikwuu nzute, o wee jiri otu puku anụ chụọ àjà nsure ọkụ n’elu ya.+  N’abalị ahụ, Chineke pụtara ìhè n’ihu Sọlọmọn wee sị ya: “Rịọ m! Gịnị ka m ga-enye gị?”+  Sọlọmọn wee sị Chineke: “Ọ bụ gị gosiri Devid nna m+ obiọma* dị ukwuu, ọ bụkwa gị mere m eze n’ọnọdụ ya.+  Ugbu a, Jehova Chineke, ka nkwa i kwere Devid nna m mezuo,+ n’ihi na ọ bụ gị mere m eze+ ka m chịwa ndị dị ọtụtụ dị ka ájá dị n’ala.+ 10  Nye m amamihe na ihe ọmụma+ ka m wee na-apụ, na-abata n’ihu ndị a,+ n’ihi na ònye pụrụ ikpe ndị gị nke a dị ọtụtụ ikpe?”+ 11  Chineke wee sị Sọlọmọn: “Ebe ọ bụ nke a bụ ihe dị gị n’obi,+ ị rịọghịkwa ka m nye gị akụnụba na nsọpụrụ ma ọ bụ ka m nye gị mkpụrụ obi nke ndị kpọrọ gị asị, ị rịọghịkwa ọbụna ka m nye gị ogologo ndụ,+ kama ị rịọrọ ka m nye gị amamihe na ihe ọmụma ka i wee na-ekpe ndị m ikpe, bụ́ ndị m mere ka ị bụrụ eze ha,+ 12  m ga-enye gị amamihe na ihe ọmụma;+ m ga-enyekwa gị akụnụba na nsọpụrụ n’ókè ọ na-enweghị ndị eze bu gị ụzọ nwere ya+ nakwa n’ókè ọ na-enweghị onye ga-enwe ya mgbe ị nwụsịrị.”+ 13  Sọlọmọn wee si n’ebe dị elu nke dị na Gibiọn,+ n’ihu ụlọikwuu nzute,+ lọta na Jeruselem wee na-achị Izrel.+ 14  Sọlọmọn wee na-enweta ụgbọ ịnyịnya na ịnyịnya agha, o wee nwee otu puku ụgbọ ịnyịnya na narị anọ nakwa puku ịnyịnya agha iri na puku abụọ.+ O wee debe ha n’obodo dị iche iche a na-edebe ụgbọ ịnyịnya+ nakwa n’ebe dị eze nso na Jeruselem. 15  Eze wee mee ka ọlaọcha na ọlaedo dịrị ọtụtụ ka nkume+ na Jeruselem; o mekwara ka osisi sida dịrị ọtụtụ ka osisi sịkamọ+ ndị dị na Shefila.+ 16  Sọlọmọn sikwa n’Ijipt+ na-azụbata ịnyịnya, ọ bụkwa ndị na-azụrụ eze ahịa na-azụbata ìgwè ịnyịnya ndị ahụ.+ 17  Ha na-eji narị mkpụrụ ego ọlaọcha isii esi n’Ijipt azụbata otu ụgbọ ịnyịnya, ha na-ejikwa otu narị mkpụrụ ego ọlaọcha na iri ise azụbata otu ịnyịnya; ọ bụkwa otú ahụ ka ndị eze niile nke ndị Het na ndị eze Siria+ si azụbata ha. Ọ bụ n’aka ndị eze a ka ha si azụbata ha.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”