2 Ndị Kọrịnt 7:1-16
7 Ya mere, ebe anyị nwere nkwa ndị a,+ ndị m hụrụ n’anya, ka anyị sachapụ+ onwe anyị mmerụ niile nke anụ ahụ́ na nke mmụọ,+ wee mee ka ịdị nsọ anyị zuo okè n’egwu Chineke.+
2 Kwenụ ka anyị nọrọ.+ Ọ dịghị onye anyị mejọrọ, ọ dịghị onye anyị merụrụ, ọ dịghị onye anyị rigburu.+
3 Adịghị m ekwu ihe a iji katọọ unu. N’ihi na ekwuwo m na mbụ na unu nọ n’obi anyị ma ànyị nwụrụ anwụ ma ànyị dị ndụ.+
4 Enwere m nkwuwa okwu dị ukwuu n’ebe unu nọ. Eji m unu anya isi nke ukwuu.+ A kasiwo m obi nke ukwuu,+ ana m enwe ọṅụ dị ukwuu n’ime mmekpa ahụ́ anyị niile.+
5 N’eziokwu, mgbe anyị bịarutere na Masedonia,+ ahụ́ anyị ezughị ike ọ bụla,+ kama a nọ na-emekpa anyị ahụ́+ n’ụzọ niile—e nwere ọgụ n’èzí, nwee egwu n’ime.
6 Otú o sina dị, Chineke, bụ́ onye na-akasi+ ndị e wedara n’ala obi, kasiri anyị obi site n’ọnụnọ Taịtọs nọ ya;
7 ma ọ bụghị naanị site n’ọnụnọ ọ nọ ya, kamakwa site n’obi a kasiri ya n’ihi unu, ebe ọ kọkwaara+ anyị ọzọ banyere agụụ unu nwere, iru uju unu, ịnụ ọkụ n’obi unu nwere maka m; nke mere na m ṅụrịkwuru ọṅụ.
8 N’ihi ya, ọ bụrụgodị na m mere ihe wutere unu site n’akwụkwọ ozi m,+ adịghị m akwa ụta ya. Ọ bụrụgodị na m kwara ụta ya na mbụ, (ahụrụ m na akwụkwọ ozi ahụ wutere unu, ọ bụ ezie na ọ bụ ruo nwa oge,)
9 ugbu a, m na-aṅụrị ọṅụ, ọ bụghị naanị n’ihi na o wutere unu, kama n’ihi na o wutere unu, unu wee chegharịa;+ n’ihi na o wutere unu dị ka uche Chineke si dị,+ ka ihe ọ bụla wee ghara imebinahụ unu n’ihi anyị.
10 N’ihi na inwe mwute dị ka uche Chineke si dị na-eme ka e nwee nchegharị nke na-eduga ná nzọpụta nke a na-agaghị akwara ụta;+ ma mwute nke ụwa na-arụpụta ọnwụ.+
11 N’ihi na lee ihe mwute unu nwere dị ka uche Chineke si dị+ rụpụtara: ọ rụpụtara n’ime unu oké ịdị ọkụ n’obi, ee, iwepụ onwe unu n’ụta, ee, iwe, ee, egwu, ee, inwe agụụ siri ike, ee, ịnụ ọkụ n’obi, ee, imezi ihe e mejọrọ!+ N’ihe niile, unu gosiri na unu bụ ndị dị ọcha n’okwu a.
12 N’ezie, n’agbanyeghị na m detaara unu akwụkwọ, edere m ya, ọ bụghị n’ihi onye ahụ nke mere ihe ọjọọ,+ ọ bụghịkwa n’ihi onye ahụ nke e mejọrọ, kama ọ bụ ka e wee mee ka ịdị ọkụ n’obi unu nwere maka anyị pụta ìhè n’etiti unu n’anya Chineke.
13 Ọ bụ ya mere e ji kasie anyị obi.
Otú ọ dị, tụkwasị ná nkasi obi anyị, anyị ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu karị n’ihi ọṅụ Taịtọs nwere, n’ihi na unu niile emewo ka mmụọ+ ya dị ọhụrụ.
14 N’ihi na ọ bụrụ na mụ ejiwo unu nyaara ya isi, e mebeghị ka ihere mee m; ma dị ka anyị gwara unu ihe niile n’eziokwu, otú ahụkwa ka ịnya isi anyị+ n’ihu Taịtọs bụ eziokwu.
15 Obi ọmịiko ya dị ukwuu karị n’ebe unu nọ, ebe ọ na-echeta nrubeisi+ nke unu niile, otú unu si jiri egwu na ịma jijiji nabata ya.
16 Ana m aṅụrị ọṅụ na m ga-enwe obi ike n’ụzọ niile n’ihi unu.+