1 Samuel 17:1-58
17 Ndị Filistia+ wee kpọkọta ndị agha ha maka agha. Mgbe ha zukọtara na Soko+ nke Juda, ha mara ụlọikwuu ha n’agbata Soko na Azika,+ n’Ifes-damim.+
2 Ma Sọl na ndị Izrel zukọtara wee maa ụlọikwuu ha na ndagwurugwu Ila,+ ha wee hazie onwe ha n’usoro iji buso ndị Filistia agha.
3 Ndị Filistia guzokwa n’ugwu dị n’otu akụkụ, ndị Izrel wee guzo n’ugwu dị n’akụkụ nke ọzọ, ndagwurugwu dị n’etiti ha.
4 Otu dike n’agha wee malite isi n’ebe ndị Filistia mara ụlọikwuu na-apụta, aha ya bụ Golayat,+ onye si Gat,+ ọ dị kubit isii na otu ntụ ọbụ aka n’ogo.+
5 O kpukwa okpu agha e ji ọla kọpa mee, yirikwa uwe agha nke nwere akpịrịkpa ndị dị n’elu ibe ha, uwe agha+ ahụ dịkwa puku shekel ọla kọpa ise n’ịdị arọ.
6 O yi ihe mkpuchi ụkwụ e ji ọla kọpa mee n’ụkwụ ya, árọ̀+ ọla kọpa dịkwa n’etiti ubu ya abụọ.
7 Osisi ube ya dị ka okporo osisi nke ndị na-ekwe ákwà,+ ọnụ ube ya dị narị shekel ígwè isii; onye bu ọta ukwu ya na-agakwa n’ihu ya.
8 O wee kwụrụ otu ebe, malite ịkpọ ndị agha Izrel,+ sị ha: “Gịnị mere unu ji pụta hazie onwe unu n’usoro ibu agha? Ọ̀ bụ na mụ abụghị onye Filistia, unu abụrụkwa ndị na-ejere Sọl ozi?+ Họpụtaranụ onwe unu otu nwoke, ka ọ gbadata zute m.
9 Ọ bụrụ na o nwee ike ịlụso m ọgụ ma gbuo m, anyị ga-aghọ ndị na-ejere unu ozi. Ma ọ bụrụ na ọ kaghị m ike m wee gbuo ya, unu ga-aghọ ndị na-ejere anyị ozi, unu ga na-ejekwara anyị ozi.”+
10 Onye Filistia ahụ wee sị: “Mụ onwe m na-ama ndị agha Izrel aka+ taa. Nyenụ m otu nwoke, ka anyị lụọ ọgụ!”+
11 Mgbe Sọl+ na ndị Izrel niile nụrụ ihe ndị a onye Filistia ahụ kwuru, ụjọ jidere ha, egwu tụkwara ha nke ukwuu.+
12 Devid bụ nwa otu onye Efrata+ nke si Betlehem nke Juda, onye aha ya bụ Jesi. Ọ mụrụ ụmụ ndị ikom asatọ.+ N’ụbọchị Sọl, nwoke ahụ emeworị agadi.
13 Ụmụ Jesi ndị ikom atọ, bụ́ ndị kasị mee okenye, wee gaa. Ha so Sọl gaa agha,+ aha ụmụ ya ndị ikom atọ gara agha bụ Elayab,+ nke ọkpara, na nwa ya nke abụọ bụ́ Abinadab,+ nakwa nke atọ bụ́ Shama.+
14 Devid bụ ọdụdụ nwa,+ atọ ndị kasị mee okenye sokwa Sọl.
15 Devid nọkwa na-aga n’ụlọ Sọl ma na-alọta iji lekọta ìgwè atụrụ+ nna ya na Betlehem.
16 Ruo ụbọchị iri anọ, onye Filistia ahụ na-apụta n’isi ụtụtụ nakwa n’uhuruchi gaa guzoro otu ebe.
17 Jesi wee sị Devid nwa ya: “Biko, buru ọka* a a ṅara n’ọkụ+ nke dị otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa na ogbe achịcha iri a bugara ụmụnne gị, buru ha ngwa ngwa bugara ụmụnne gị n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu.
18 Burukwa òkè iri a nke mmiri ara ehi bugara ọchịagha otu puku ndị agha;+ gaakwa leta ụmụnne gị ka ị mara otú ha mere,+ natakwa ha ihe àmà.”
19 N’oge ahụ, ha na Sọl na ndị Izrel ndị ọzọ nọ na ndagwurugwu Ila,+ na-ebuso ndị Filistia agha.+
20 Devid wee bilie n’isi ụtụtụ hapụ ìgwè atụrụ ahụ n’aka onye na-elekọta atụrụ, buru ihe ndị ahụ gawa dị nnọọ ka Jesi nyere ya n’iwu.+ Mgbe ọ batara n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu,+ ìgwè ndị agha nọ na-aga n’ọgbọ agha,+ ha wee tie mkpu agha.
21 Izrel na ndị Filistia wee malite ịhazi ndị agha ha ka ha buso ibe ha agha.
22 Ozugbo ahụ, Devid hapụrụ ibu+ ahụ n’aka onye na-elekọta ibu+ wee gbara gawa n’ọgbọ agha. Mgbe o rutere, ọ malitere ịjụ otú ụmụnne ya mere.+
23 Ka ya na ha nọ na-ekwu okwu, lee, dike ahụ, nke aha ya bụ Golayat,+ onye Filistia nke si Gat,+ si n’ebe ndị agha ndị Filistia nọ na-agbagote, o wee malite ikwu ihe ndị ahụ o kwuru na mbụ,+ Devid wee nụpere ya.
24 Ma mgbe ndị Izrel niile hụrụ nwoke ahụ, lee, ha gbara ọsọ n’ihi ya, egwu tụkwara ha nke ukwuu.+
25 Ndị Izrel wee malite ịsị: “Ùnu hụrụ nwoke a nke na-agbagote? Ọ bụ ka ọ maa Izrel aka+ mere o ji na-agbagote. Ọ ga-erukwa na onye ọ bụla nke ga-egbu ya, eze ga-eme ka ọ baa ọgaranya site n’inye ya akụnụba dị ukwuu, ọ ga-akpọnyekwa ya nwa ya nwaanyị,+ ọ ga-emekwa ka ụlọ nna ya nwere onwe ha n’Izrel.”+
26 Devid wee malite ịgwa ndị guzo ya nso, sị: “Gịnị ka a ga-emere onye ọ bụla nke gburu onye Filistia+ ahụ ma wepụ nkọcha a na-akọcha Izrel?+ N’ihi na, ònye bụ onye Filistia nke a a na-ebighị úgwù+ nke na ọ ga-ama ndị agha nke Chineke dị ndụ+ aka?”+
27 Ha wee gwa ya otu ihe ahụ e kwuru na mbụ, sị: “Otú a ka a ga-emere onye gburu ya.”
28 Elayab+ bụ́ ọkpara nne ya wee nụ ka ọ na-agwa ndị ahụ okwu, Elayab wee weso Devid iwe+ dị ọkụ, nke mere na ọ sịrị: “Gịnị mere i ji bịa? Ọ̀ bụkwa onye ka ị hapụụrụ atụrụ ole na ole ahụ n’ala ịkpa?+ Mụ onwe m maara na ị dị mpako, nweekwa obi ọjọọ,+ n’ihi na ihe mere i ji bịa bụ ka ị hụ agha a.”+
29 Devid wee sị: “Gịnịkwa ka m mere ugbu a? Ọ́ bụghị naanị okwu ka m kwuru?”+
30 O wee si n’akụkụ ya tụgharịa chee onye ọzọ ihu ma kwuo otu ihe ahụ o kwuru na mbụ,+ ha zakwara ya otu ihe ahụ ha zara ya na mbụ.+
31 E wee nụ ihe ahụ Devid kwuru, ha wee kọọrọ ya Sọl. O wee kpọrọ ya.
32 Devid wee sị Sọl: “Ka obi ghara ịwụba onye ọ bụla n’afọ.+ Ohu gị ga-aga lụso onye Filistia nke a ọgụ.”+
33 Ma Sọl sịrị Devid: “Ị gaghị enwe ike ịga zute onye Filistia nke a lụso ya ọgụ,+ n’ihi na ị ka bụ nwata,+ ma ya onwe ya bụ dike n’agha malite n’oge ọ bụ nwata.”
34 Devid wee sị Sọl: “Ohu gị ghọrọ onye na-azụ ìgwè atụrụ nna ya, otu ọdụm wee bịa,+ otu anụ ọhịa bea bịakwara, nke ọ bụla buuru otu atụrụ n’ìgwè atụrụ ahụ.
35 M wee chụwa ya kụgbuo+ ya ma napụta ya n’ọnụ ya. Mgbe ọ malitere ịlụso m ọgụ, m jidere ya n’ọzà wee kụgbuo ya.
36 Ohu gị kụgburu ma ọdụm ahụ ma anụ ọhịa bea ahụ; onye Filistia nke a a na-ebighị úgwù+ ga-adị ka otu n’ime ha, n’ihi na ọ mawo ndị agha+ nke Chineke dị ndụ+ aka.”+
37 Devid kwukwara, sị: “Jehova, bụ́ onye napụtara m n’aka ọdụm nakwa n’aka anụ ọhịa bea, ọ bụ ya ga-anapụta m n’aka onye Filistia nke a.”+ Sọl wee sị Devid: “Gawa, ka Jehova nọnyekwara gị.”+
38 Sọl wee yiwe Devid uwe nke ya, kpuwekwa ya okpu agha e ji ọla kọpa mee, yiwezie ya uwe agha.
39 Devid wee kegide mma agha ya n’uwe ya wee chọọ ịgawa, ma o nweghị ike, n’ihi na o yitụbeghị ha. N’ikpeazụ, Devid sịrị Sọl: “Enweghị m ike iyi ihe ndị a gaa, n’ihi na eyitụbeghị m ha.” Devid wee yipụ ha.+
40 O wee were mkpara ya, họrọkwa nkume ise ndị kasị kwọọ mụrụmụrụ n’iyi ndagwurugwu wee wụnye ha n’akpa o ji azụ atụrụ nke o ji mere ihe ntinye ihe, o jikwa èbè+ ya n’aka. O wee gawa izute onye Filistia ahụ.
41 Onye Filistia ahụ wee bịawa, na-abịaru Devid nso karị, nwoke nke bu ọta ukwu ya nọkwa na-aga ya n’ihu.
42 Mgbe onye Filistia ahụ lere anya hụ Devid, ọ malitere ileda ya anya+ n’ihi na ọ bụ nwata,+ na-achakwa ọbara ọbara+ ma maa mma ile anya.+
43 Onye Filistia ahụ wee sị Devid: “M̀ bụ nkịta,+ mere i ji jiri mkpara na-abịa izute m?” Onye Filistia ahụ wee jiri aha chi+ ya kọchaa Devid.
44 Onye Filistia ahụ sịkwara Devid: “Bịa m nso, m ga-ewere anụ gị nye anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa.”+
45 Devid wee gwa onye Filistia ahụ, sị: “I ji mma agha na ube na árọ̀+ na-abịa izute m, ma m ji aha Jehova nke ụsụụ ndị agha,+ bụ́ Chineke nke ndị agha Izrel, onye ị maworo aka,+ na-abịa izute gị.
46 Taa, Jehova ga-enyefe gị n’aka m,+ m ga-egbukwa gị ma bepụ gị isi; taa, m ga-ewerekwa ozu ndị agha Filistia nye anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa nke ụwa;+ ndị bi n’ụwa dum ga-amarakwa na Izrel nwere Chi.+
47 Ìgwè mmadụ a dum ga-amara na Jehova adịghị eji mma agha ma ọ bụ ube eweta nzọpụta,+ n’ihi na ọ bụ Jehova nwe agha a,+ ọ ga-enyefekwa unu n’aka anyị.”+
48 O wee ruo na onye Filistia ahụ biliri bịawa, na-abịa nso izute Devid, Devid wee mee ngwa ngwa gbara gawa n’ọgbọ agha izute onye Filistia ahụ.+
49 Devid wee tinye aka n’akpa ya wepụta otu nkume, gbapụ ya, o wee gbaa+ ya onye Filistia ahụ n’egedege ihu, nkume ahụ wee bamie n’egedege ihu ya, o wee daa kpuo ihu n’ala.+
50 Devid wee jiri èbè na nkume merie onye Filistia ahụ, o wee gbatuo onye Filistia ahụ, gbuo ya; ọ dịghịkwa mma agha ọ bụla Devid ji.+
51 Devid wee gbara ọsọ gaa guzoro n’akụkụ onye Filistia ahụ. O wee were mma agha nwoke ahụ,+ mịpụta ya n’ọbọ ya ma gbunyụọ ya anya mgbe o ji ya gbupụ ya isi.+ Ndị Filistia wee hụ na dike ha anwụọla, ha wee gbaa ọsọ.+
52 Ndị Izrel na ndị Juda wee bilie tiwe mkpu ma chụrụ+ ndị Filistia ruo na ndagwurugwu,+ ruo n’ọnụ ụzọ ámá Ekrọn, ndị Filistia e merụrụ ahụ́ nke ukwuu wee na-ada n’ụzọ malite na Shearem ruo Gat na Ekrọn.
53 E mesịa, ụmụ Izrel si n’ajọ ọsọ ha chụrụ ndị Filistia lọta wee malite ịkwakọrọ+ ihe dị n’ebe ha mara ụlọikwuu.
54 Devid wee buru isi+ onye Filistia ahụ bute ya Jeruselem, o bubakwara ngwá ọgụ ya n’ụlọikwuu ya.+
55 Ozugbo Sọl hụrụ Devid ka ọ na-aga ibuso onye Filistia ahụ agha, ọ jụrụ Abna+ onyeisi ndị agha, sị: “Abna, nwa ònye+ ka nwa okoro+ a bụ?” Abna wee zaa, sị: “Dị nnọọ ka mkpụrụ obi gị dị ndụ, eze, amaghị m ma ọlị!”
56 Eze wee sị: “Jụta onye nwa okoro ahụ bụ nwa ya.”
57 N’ihi ya, ngwa ngwa Devid si n’igbu onye Filistia ahụ lọta, Abna kpọtara ya n’ihu Sọl, o bukwa isi+ onye Filistia ahụ n’aka.
58 Sọl wee sị ya: “Nwa m, ị̀ bụ nwa onye?” Devid wee zaa, sị: “Abụ m nwa ohu gị bụ́ Jesi+ onye Betlehem.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.