1 Pita 3:1-22
3 Otú ahụkwa,+ unu ndị bụ́ nwunye, doonụ onwe unu n’okpuru+ di unu, ka e wee rite ha n’uru+ n’ekwughị okwu ọ bụla site n’omume nwunye ha,+ ma ọ bụrụ na ụfọdụ n’ime ha adịghị erube isi+ n’okwu Chineke,
2 ebe ha ji anya ha hụ omume unu nke dị ọcha,+ ya na nkwanye ùgwù dị ukwuu.
3 Unu ekwekwala ka mma unu na-achọ bụrụ ịkpa isi efu+ na iyi ihe ịchọ mma ọlaedo+ ma ọ bụ iyi uwe elu,
4 kama ka ọ bụrụ mmadụ zoro ezo+ nke dị n’ime obi, nke yi uwe na-apụghị imebi emebi,+ bụ́ mmụọ dị jụụ,+ nke dịkwa nwayọọ, nke bara uru nke ukwuu n’anya Chineke.
5 N’ihi na n’oge gara aga, otú ahụ ka ụmụ nwaanyị dị nsọ ndị nwere olileanya n’ebe Chineke nọ si na-achọ onwe ha mma, na-edo onwe ha n’okpuru di ha,
6 dị ka Sera si na-erubere Ebreham isi, na-akpọ ya “onyenwe m.”+ Unu aghọwokwa ụmụ ya, ma ọ bụrụhaala na unu ana-eme ihe ọma, gharakwa ịtụ egwu ihe ọ bụla na-akpata oké ụjọ.+
7 Unu ndị bụ́ di, ka unu na ndị nwunye unu na-ebi otú ahụ+ dị ka ihe ọmụma si dị,+ na-enyenụ nwaanyị nsọpụrụ+ dị ka arịa na-esighị ike, ebe unu na ha bụ ndị nketa+ nke ihu ọma na-erughịrị mmadụ nke bụ́ ndụ, ka e wee ghara igbochi ekpere unu.+
8 N’ikpeazụ, unu niile, nweenụ otu obi,+ ka ihe banyere onye ọzọ na-emetụ unu n’obi, nweenụ ịhụnanya ụmụnna, nweenụ obi ọmịiko,+ dịrịnụ umeala n’obi,+
9 unu ejila ihe ọjọọ akwụ ụgwọ ihe ọjọọ,+ unu ejila nkwujọ akwụ ụgwọ nkwujọ,+ kama nke ahụ, na-agọzinụ+ ndị mmadụ, n’ihi na a kpọrọ unu ka unu soro ụzọ a, ka unu wee keta ngọzi.
10 N’ihi na, “onye chọrọ ịhụ ndụ n’anya, chọọkwa iji anya ya hụ ezi ụbọchị,+ ya gbochie ire+ ya ikwu ihe ọjọọ, gbochiekwa egbugbere ọnụ ya ikwu okwu aghụghọ,+
11 kama, ya si n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya,+ meekwa ezi ihe; ya chọọ udo, chụsookwa ya.+
12 N’ihi na anya+ Jehova na-elekwasị ndị ezi omume, ntị ya dịkwa n’arịrịọ ha na-arịọsi ike;+ ma ihu Jehova na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ.”+
13 N’ezie, ònye bụ mmadụ nke ga-emerụ unu ahụ́ ma ọ bụrụ na unu aghọọ ndị na-anụ ọkụ n’obi maka ezi ihe?+
14 Ma ọ bụrụgodị na unu ataa ahụhụ n’ihi ezi omume, unu ga-enwe obi ụtọ.+ Otú ọ dị, ka ihe ha na-atụ egwu ghara ịtụ unu egwu,+ obi alọkwala unu mmiri.+
15 Kama doonụ Kraịst nsọ dị ka Onyenwe anyị n’obi unu,+ dịrịnụ njikere mgbe niile ịzara ọnụ unu+ n’ihu onye ọ bụla nke na-ajụ unu ihe mere unu ji nwee olileanya ahụ unu nwere, ma jirinụ obi dị nwayọọ+ na nkwanye ùgwù dị ukwuu na-eme otú ahụ.
16 Nweenụ ezi akọ na uche,+ ka ihere wee mee ha n’ihe ahụ ha na-ekwugide unu n’ihi ya,+ ya bụ, ndị na-ekwu okwu mkparị banyere omume ọma unu n’ime Kraịst.+
17 N’ihi na ọ dị mma ịta ahụhụ n’ihi na unu na-eme ihe ọma,+ ma ọ bụrụ uche Chineke, karịa ịta ahụhụ n’ihi na unu na-eme ihe ọjọọ.+
18 Ọbụna Kraịst nwụrụ naanị otu ugboro n’ihe banyere mmehie,+ onye ezi omume n’ihi ndị ajọ omume,+ ka o wee duga unu n’ebe Chineke nọ,+ ebe e mere ka ọ nwụọ n’anụ ahụ́,+ ma e mere ka ọ dị ndụ na mmụọ.+
19 Ọ nọkwa n’ọnọdụ a gaa kwusaara ndị mmụọ nọ n’ụlọ mkpọrọ okwu,+
20 bụ́ ndị nupụrụ isi n’oge gara aga,+ mgbe Chineke ji ndidi+ na-echere n’ụbọchị Noa, mgbe a nọ na-ewu ụgbọ+ ahụ nke e ji buru mmadụ ole na ole, ya bụ, mkpụrụ obi asatọ, gafee mmiri ahụ n’enweghị ihe mere ha.+
21 Ihe ya na ihe a yiri na-azọpụtakwa unu ugbu a,+ ya bụ, baptizim, (ọ bụghị iwepụ unyi dị n’anụ ahụ́, kama ọ bụ arịrịọ a na-arịọ Chineke maka ezi akọ na uche,)+ site ná mbilite n’ọnwụ Jizọs Kraịst.+
22 Ọ nọ n’aka nri Chineke,+ n’ihi na ọ gara eluigwe; e mekwara ka ndị mmụọ ozi+ na ndị na-achị achị na ndị dị ike nọrọ n’okpuru ya.+