1 Ndị Kọrịnt 8:1-13
8 N’ihe banyere ihe oriri e ji chụọrọ arụsị+ àjà: anyị maara na anyị niile nwere ihe ọmụma.+ Ihe ọmụma na-afụli elu, ma ịhụnanya na-ewuli elu.+
2 Ọ bụrụ na onye ọ bụla echee na ya amatawo ihe ọ bụla,+ ọ mabeghị ya otú o kwesịrị ịmara ya.+
3 Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla hụrụ Chineke n’anya,+ onye a bụ onye Ọ maara.+
4 N’ihe banyere iri+ ihe oriri e ji chụọrọ arụsị àjà, anyị maara na arụsị abụghị ihe ọ bụla+ n’ụwa, na e nweghịkwa Chineke ọ bụla ma ọ bụghị otu.+
5 N’ihi na ọ bụ ezie na e nwere ndị a na-akpọ “chi,”+ ma ọ̀ bụ n’eluigwe+ ma ọ bụ n’ụwa,+ dị nnọọ ka e nwere ọtụtụ “chi” na ọtụtụ “ndị nwe mmadụ,”+
6 n’ebe anyị nọ, otu Chineke dị,+ bụ́ Nna,+ onye ihe niile si n’aka ya dịrị, anyị onwe anyị dịkwaara ya;+ otu Onyenwe anyị dịkwa,+ bụ́ Jizọs Kraịst,+ onye e si n’aka ya mee ka ihe niile dịrị,+ anyị onwe anyị sikwa n’aka ya.
7 Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ niile nwere ihe ọmụma a;+ ma ụfọdụ ndị, ebe ọ bụ na arụsị maara ha ahụ́ ruo ugbu a, ha na-eri ihe oriri dị ka ihe e ji chụọrọ arụsị àjà,+ e merụwokwa+ akọ na uche ha, ebe ọ na-adịghị ike.
8 Ma ihe oriri agaghị eme ka anyị nweta ihu ọma Chineke;+ ọ bụrụ na anyị erighị ihe, anyị abụghị ndị na-erughị eru, ọ bụrụ na anyị erie ihe, ọ dịghịkwa uru ọ bụla anyị ritere.+
9 Ma na-elezinụ anya ka ikike a unu nwere ghara isi n’ụzọ ọ bụla ghọọrọ ndị na-adịghị ike+ ihe ịsụ ngọngọ.
10 N’ihi na ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ gị, gị onye nwere ihe ọmụma, ka ị nọ na-eri nri n’ụlọ arụsị, ọ̀ bụ na a gaghị akpali akọ na uche onye ahụ na-adịghị ike nke ga-eme ka o rie ihe oriri e ji chụọrọ arụsị àjà?+
11 N’ezie, site n’ihe ọmụma gị, a na-ebibi onye ahụ na-adịghị ike, bụ́ nwanna gị onye Kraịst nwụrụ n’ihi ya.+
12 Ma mgbe unu si otú a na-emehie ụmụnna unu, na-emebikwa akọ na uche+ ha nke na-adịghị ike, unu na-emehie Kraịst.
13 Ya mere, ọ bụrụ na ihe oriri na-eme ka nwanna m sụọ ngọngọ,+ m gaghị atakwa anụ ọzọ ma ọlị, ka m wee ghara ime ka nwanna m sụọ ngọngọ.+