1 Ndị Kọrịnt 15:1-58
15 Ụmụnna m, m na-eme ka unu mara ozi ọma+ m zisaara unu,+ nke unu nabatara, nke unu nọgidesikwara ike na ya.+
2 A na-azọpụta+ unu site n’okwu m kwuru mgbe zisaara unu ozi ọma, ma ọ bụrụ na unu ejidesie ya ike, ọ gwụla, n’eziokwu, ma ùnu ghọrọ ndị kwere ekwe n’efu.+
3 N’ihi na enyefere m unu, n’ime ihe ndị mbụ, ihe ahụ m natakwara,+ na Kraịst nwụrụ maka mmehie anyị dị ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo;+
4 nakwa na e liri ya,+ ee, na a kpọlitere ya+ n’ụbọchị nke atọ+ dị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru;+
5 na ọ pụtakwara n’ihu Sifas,+ e mesịa, ọ pụtara n’ihu ndị ozi iri na abụọ+ ahụ.
6 Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ pụtara n’ihu ihe karịrị narị ụmụnna ise n’otu mgbe, bụ́ ndị ihe ka ọtụtụ n’ime ha ka nọ ruo ugbu a,+ ma ụfọdụ adawo n’ụra ọnwụ.
7 Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ pụtara n’ihu Jems,+ e mesịa, ọ pụtara n’ihu ndịozi niile;+
8 ma n’ikpeazụ, n’ime ha niile, ọ pụtara n’ihu m+ dị ka ọ̀ bụ n’ihu onye a mụkworo amụkwo.
9 N’ihi na abụ m onye kasị nta+ n’ime ndịozi, ekwesịghịkwa m ka a kpọọ m onyeozi, n’ihi na akpagburu+ m ọgbakọ Chineke.
10 Ma site n’obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ,+ abụ m ihe m bụ. Obiọma ya na-erughịrị mmadụ nke dịkwa n’ebe m nọ aghọghị ihe efu,+ kama adọgburu m onwe m n’ọrụ karịa ha niile,+ ma ọ bụghị m, kama ọ bụ obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ, nke dịnyeere m.+
11 Otú ọ dị, ma ọ̀ bụ m ma ọ̀ bụ ha, otú ahụ ka anyị na-ekwusa, otú ahụkwa ka unu kweere.+
12 Ma ọ bụrụ na a na-ekwusa na e si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite Kraịst,+ olee ihe mere ụfọdụ n’ime unu ji ekwu na mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ adịghị?+
13 N’ezie, ọ bụrụ na mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ adịghị, a kpọliteghị Kraịst.+
14 Ma ọ bụrụ na a kpọliteghị Kraịst, ozi ọma anyị na-ekwusa bụ ihe efu n’ezie, okwukwe anyị bụkwa ihe efu.+
15 Ọ pụtakwara na anyị bụ ndị àmà ụgha nke Chineke,+ n’ihi na anyị agbawo àmà+ megide Chineke na ọ kpọlitere Kraịst,+ bụ́ onye ọ na-akpọliteghị ma ọ bụrụ n’ezie na a gaghị akpọlite ndị nwụrụ anwụ.+
16 N’ihi na ọ bụrụ na a gaghị akpọlite ndị nwụrụ anwụ, a kpọliteghị Kraịst.
17 Ọ bụrụkwa na a kpọliteghị Kraịst, okwukwe unu abaghị uru; unu ka nọ ná mmehie unu.+
18 N’eziokwu, ndị dara n’ụra ọnwụ n’ime+ Kraịst lakwara n’iyi.+
19 Ọ bụrụ naanị ná ndụ a ka anyị nwere olileanya na Kraịst,+ anyị bụ ndị e kwesịrị imere ebere karịa mmadụ niile.
20 Ma, ugbu a, e siwo ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite Kraịst,+ bụ́ mkpụrụ mbụ+ nke ndị dara n’ụra ọnwụ.+
21 N’ihi na ebe ọnwụ+ si n’aka otu onye, mbilite n’ọnwụ+ nke ndị nwụrụ anwụ sikwa n’aka otu onye.
22 N’ihi na dị nnọọ ka mmadụ niile na-anwụ n’ime Adam,+ otú ahụkwa ka a ga-eme ka mmadụ niile dị ndụ n’ime Kraịst.+
23 Ma onye ọ bụla n’ọnọdụ nke ya: Kraịst mkpụrụ mbụ,+ e mesịakwa, ndị nke Kraịst n’oge ọnụnọ ya.+
24 Mgbe nke ahụ gasịrị, ọgwụgwụ ga-abịa, mgbe ọ ga-enyefe alaeze ahụ n’aka Chineke na Nna ya, mgbe o meworo ka ọchịchị niile na ikike na ike+ niile ghara ịdị irè.
25 N’ihi na ọ ghaghị ịchị dị ka eze ruo mgbe Chineke debere ndị iro ya niile n’okpuru ụkwụ ya.+
26 Dị ka onye iro ikpeazụ, a ga-eme ka ọnwụ ghara ịdị irè.+
27 N’ihi na Chineke “doro ihe niile n’okpuru ụkwụ ya.”+ Ma mgbe ọ sịrị na ‘e dowo ihe niile n’okpuru ya,’+ o doro anya na onye ahụ nke doro ihe niile n’okpuru ya+ esoghị.
28 Ma mgbe a ga-edoworị ihe niile n’okpuru ya,+ mgbe ahụ, Ọkpara ahụ n’onwe ya ga-edokwa onwe ya n’okpuru Onye+ ahụ nke doro ihe niile n’okpuru ya, ka Chineke wee bụrụ ihe niile n’ebe onye ọ bụla nọ.+
29 Ma ọ́ bụghị ya, gịnị ka ha ga-eme bụ́ ndị a na-eme baptizim ka ha wee ghọọ ndị nwụrụ anwụ?+ Ọ bụrụ na a gaghị akpọlite ndị nwụrụ anwụ ma ọlị,+ gịnị mere e ji na-emekwa ha baptizim+ ka ha wee ghọọ ndị dị otú ahụ?
30 Gịnịkwa mere anyị ji nọrọ n’ihe ize ndụ n’oge awa ọ bụla?+
31 Kwa ụbọchị, ana m eche ọnwụ ihu.+ Ana m ekwusi ihe a ike site n’inwe aṅụrị+ n’ihi unu, ụmụnna m, bụ́ nke m nwere n’ime Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.
32 Ọ bụrụ na, dị ka ụmụ mmadụ, mụ na anụ ọhịa lụrụ ọgụ n’Efesọs,+ olee uru ọ baara m? Ọ bụrụ na a gaghị akpọlite ndị nwụrụ anwụ, “ka anyị rie ma ṅụọ, n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ.”+
33 Unu ekwela ka e duhie unu. Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.+
34 Meenụ ka uche unu zuo okè+ n’ụzọ ezi omume, unu anọkwala na-eme mmehie, n’ihi na ụfọdụ amaghị Chineke.+ Ana m ekwu ihe a ka ihere mee unu.+
35 Otú o sina dị, mmadụ ga-asị: “Olee otú a ga-esi kpọlite ndị nwụrụ anwụ? Ee, olee ụdị ahụ́ ha ga-ebu pụta?”+
36 Gị onye na-enweghị uche! A dịghị eme ka ihe ị kụrụ dị ndụ ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ nwụọ;+
37 n’ihe banyere ihe ị na-akụ, ọ bụghị ahụ́ nke ga-etolite ka ị na-akụ, kama ọ bụ mkpụrụ nkịtị,+ ma eleghị anya, nke ọka wit ma ọ bụ otu n’ime mkpụrụ ndị ọzọ;
38 ma Chineke na-enye ya ahụ́,+ dị nnọọ ka o si dị ya mma,+ nyekwa nke ọ bụla n’ime mkpụrụ ndị ahụ ahụ́ nke ya.
39 Anụ ahụ́ niile abụghị otu anụ ahụ́, kama e nwere anụ ahụ́ nke mmadụ, e nwekwara anụ ahụ́ nke anụ ụlọ, na anụ ahụ́ nke ụmụ nnụnụ, na anụ ahụ́ ọzọ nke azụ̀.+
40 E nwere ahụ́ nke eluigwe+ na ahụ́ nke ụwa;+ ma ebube+ ahụ́ nke eluigwe bụ otu ụdị, ahụ́ nke ụwa bụkwa ụdị dị iche.
41 Ebube nke anyanwụ+ bụ otu ụdị, ebube nke ọnwa+ bụkwa ụdị ọzọ, ebube nke kpakpando+ bụkwa ụdị ọzọ; n’eziokwu, ebube otu kpakpando dị iche n’ebube kpakpando ọzọ.
42 Otú ahụkwa ka mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ+ dị. A na-akụ ya n’ire ure, a na-akpọlite ya n’ereghị ure.+
43 A na-akụ ya n’ihe ihere,+ a na-akpọlite ya n’ebube.+ A na-akụ ya n’adịghị ike,+ a na-akpọlite ya n’ịdị ike.+
44 A na-akụ ya dị ka anụ ahụ́,+ a na-akpọlite ya dị ka ahụ́ nke mmụọ.+ Ọ bụrụ na e nwere anụ ahụ́, e nwekwara ahụ́ nke mmụọ.
45 E dere ọbụna otú a, sị: “Nwoke mbụ ahụ bụ́ Adam ghọrọ mkpụrụ obi dị ndụ.”+ Adam ikpeazụ ghọrọ mmụọ+ na-enye ndụ.+
46 Otú o sina dị, nke mbụ bụ nke bụ́ anụ ahụ́, ọ bụghị nke bụ́ mmụọ, e mesịa, nke bụ́ mmụọ+ sochiri.
47 Nwoke mbụ ahụ si n’ala, e jikwa ájá kpụọ ya;+ nwoke nke abụọ si n’eluigwe.+
48 Otú ahụ onye e ji ájá+ mee dị, otú ahụkwa ka ndị e ji ájá kpụọ dị; otú ahụ onye nke eluigwe+ ahụ dị, otú ahụkwa ka ndị eluigwe dị.+
49 Dịkwa nnọọ ka anyị yiiri onyinyo+ nke onye ahụ e ji ájá mee, anyị ga-eyirikwa onyinyo+ nke onye eluigwe ahụ.
50 Otú ọ dị, nke a ka m na-ekwu, ụmụnna m, na anụ ahụ́ na ọbara apụghị iketa alaeze Chineke,+ ire ure adịghịkwa eketa ereghị ure.+
51 Lee! Ana m agwa unu otu ihe nzuzo dị nsọ: Anyị niile agaghị ada n’ụra ọnwụ, kama a ga-agbanwe anyị niile,+
52 n’ime ntakịrị oge, n’otu ntabi anya, n’oge a ga-afụ opi ikpeazụ. N’ihi na opi+ ahụ ga-ada, a ga-akpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ n’ọnọdụ nke apụghị ire ure, a ga-agbanwekwa anyị.
53 N’ihi na ahụ́ a nke pụrụ ire ure aghaghị iyikwasị ereghị ure,+ ahụ́ a nke pụkwara ịnwụ anwụ+ aghaghị iyikwasị anwụghị anwụ.
54 Ma mgbe ahụ́ a nke pụrụ ire ure yikwasịrị ereghị ure, ahụ́ a nke pụrụ ịnwụ anwụ eyikwasịkwa anwụghị anwụ, mgbe ahụ ka okwu ahụ e dere ga-emezu, nke sịrị: “E lodawo ọnwụ+ ruo mgbe ebighị ebi.”+
55 “Ọnwụ, olee mmeri gị? Ọnwụ, olee ebe ihe i ji agba mmadụ dị?”+
56 Ihe ọgbụgba+ nke na-akpata ọnwụ bụ mmehie, ma ike mmehie bụ Iwu+ ahụ.
57 Ma ekele dịrị Chineke, n’ihi na ọ na-enye anyị mmeri site n’aka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst!+
58 Ya mere, ụmụnna m m hụrụ n’anya, guzosienụ ike,+ bụrụnụ ndị kwụ chịm, ndị nwere ọtụtụ ihe ha na-arụ mgbe niile n’ọrụ Onyenwe anyị,+ ebe unu maara na ndọgbu unu na-adọgbu onwe unu n’ọrụ abụghị n’efu+ n’ime Onyenwe anyị.