1 Ndị Kọrịnt 14:1-40
14 Na-achụsonụ ịhụnanya, ma jirinụ ịnụ ọkụ n’obi na-achọ onyinye nke mmụọ nsọ,+ ma ọ ka mma ka unu na-ebu amụma.+
2 N’ihi na onye na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche na-agwa Chineke okwu, ọ bụghị mmadụ, n’ihi na ọ dịghị onye na-anụ ihe ọ na-ekwu,+ kama ọ na-ekwu ihe nzuzo ndị dị nsọ+ site n’ike mmụọ nsọ.
3 Otú ọ dị, onye na-ebu amụma na-ewuli ndị mmadụ elu,+ na-agbakwa ha ume ma na-agụgụ ha obi site n’okwu ya.
4 Onye na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche na-ewuli onwe ya elu, ma onye na-ebu amụma na-ewuli ọgbakọ elu.
5 Ya mere, achọrọ m ka unu niile na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche,+ ma achọrọ m karị ka unu na-ebu amụma.+ N’ezie, onye na-ebu amụma ka onye na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche,+ ọ gwụla, n’eziokwu, ma ọ̀ sụgharịrị ya, ka e wee wulie ọgbakọ elu.
6 Ma ugbu a, ụmụnna m, ọ bụrụ na mụ abịa na-agwa unu okwu n’asụsụ dị iche iche, olee ihe ọma m ga-emere unu ma ọ bụrụ na mụ ejighị mkpughe+ ma ọ bụ ihe ọmụma+ ma ọ bụ amụma ma ọ bụ ozizi gwa unu okwu?
7 Dị ka o si adị, ihe ndị na-adịghị ndụ na-adapụta ụda,+ ma ọ̀ bụ ọjà ma ọ bụ ụbọ akwara; olee otú a ga-esi mara ihe e ji ọjà ahụ na-egbu ma ọ bụ ihe e ji ụbọ akwara ahụ na-akpọ, ma ọ bụrụ na ọ dịghị ihe dị iche n’ụda ha?
8 N’ihi na n’ezie, ọ bụrụ na e jiri opi kpọọ òkù na-edoghị anya, ònye ga-ejikere ije agha?+
9 Otú ahụkwa, ọ bụrụ na unu ejighị ire unu kwuo okwu dị mfe nghọta,+ olee otú a ga-esi mata ihe unu na-ekwu? N’eziokwu, unu ga na-agwa ikuku okwu.+
10 Ọ pụrụ ịbụ na e nwere ọtụtụ ụdị olu okwu n’ụwa, ma ọ dịghị nke na-enweghị ihe ọ pụtara.
11 Ya mere, ọ bụrụ na aghọtaghị m ihe olu okwu ahụ pụtara, m ga-abụrụ onye na-ekwu ya onye mba ọzọ,+ onye na-ekwu okwu ahụ ga-abụkwara m onye mba ọzọ.
12 Otú ahụkwa, unu onwe unu, ebe unu ji ịnụ ọkụ n’obi na-achọ onyinye nke mmụọ nsọ,+ na-achọnụ ka unu nwee ya nke ukwuu maka iwuli ọgbakọ elu.+
13 Ya mere, onye na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche, ya kpee ekpere ka ọ sụgharịa ya.+
14 N’ihi na ọ bụrụ na m na-ekpe ekpere n’asụsụ dị iche, ọ bụ onyinye mmụọ nsọ e nyere m na-ekpe ekpere,+ ma obi m adịghị amị mkpụrụ.
15 Gịnịzi ka a ga-eme? M ga-eji onyinye nke mmụọ nsọ na-ekpe ekpere, ma m ga-eji obi m na-ekpe ekpere. M ga-eji onyinye nke mmụọ nsọ na-abụ abụ otuto,+ ma m ga-eji obi m na-abụ abụ otuto.+
16 Ma ọ́ bụghị otú ahụ, ọ bụrụ na i jiri onyinye nke mmụọ nsọ na-enye otuto, olee otú onye nọ n’ọnọdụ ndị nkịtị ga-esi asị “Amen”+ mgbe i nyesịrị ekele, ebe ọ na-amaghị ihe ị na-ekwu?
17 N’ezie, ị na-enye ekele n’ụzọ dị mma, ma ị dịghị ewuli onye nke ọzọ elu.+
18 Ana m ekele Chineke na ana m ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche karịa otú unu niile na-ekwu.+
19 Otú o sina dị, n’ime ọgbakọ, m ga-ahọrọ iji obi m kwuo mkpụrụ okwu ise, ka m wee jirikwa ọnụ kụziere ndị ọzọ ihe, kama ikwu puku okwu iri n’asụsụ dị iche.+
20 Ụmụnna m, unu abụla ụmụaka n’ike ịghọta ihe,+ kama bụrụnụ ụmụ ọhụrụ n’ebe ihe ọjọọ dị;+ ma bụrụnụ dimkpa n’ike ịghọta ihe.+
21 N’Iwu ahụ, e dere, sị: “‘M ga-eji asụsụ ndị ala ọzọ na egbugbere ọnụ ndị mba ọzọ+ gwa ndị a okwu,+ ma ha agaghịdị aṅa m ntị mgbe ahụ,’ ka Jehova kwuru.”+
22 Ya mere, asụsụ dị iche iche bụ maka ihe ịrịba ama,+ ọ bụghị n’ebe ndị kwere ekwe nọ, kama n’ebe ndị na-ekweghị ekwe nọ,+ ma ibu amụma abụghị maka ndị na-ekweghị ekwe, kama ọ bụ maka ndị kwere ekwe.+
23 Ya mere, ọ bụrụ na ọgbakọ dum abịakọta n’otu ebe, ha dum ana-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche,+ ma, ọ bụrụ na ndị nkịtị ma ọ bụ ndị na-ekweghị ekwe abata, ọ̀ bụ na ha agaghị asị na ara na-agba unu?
24 Ma ọ bụrụ na unu niile na-ebu amụma, onye ọ bụla na-ekweghị ekwe ma ọ bụ onye nkịtị ewee bata, ha niile na-adọ ya aka ná ntị,+ ha niile na-enyocha ya nke ọma;
25 ihe zoro ezo ndị dị n’obi ya na-apụta ìhè,+ nke mere na ọ ga-egbu ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala, wee kpọọrọ Chineke isiala, sị: “N’ezie, Chineke nọ n’etiti unu.”+
26 Ụmụnna m, gịnịzi ka a ga-eme? Mgbe unu zukọtara, otu onye nwere abụ ọma, onye ọzọ enwee ozizi, onye ọzọ enwee mkpughe, onye ọzọ enwee asụsụ dị iche, onye ọzọ enwee nkọwa.+ Ka e mee ihe niile maka iwuli mmadụ niile elu.+
27 Ọ bụrụkwa na ndị mmadụ na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche, ka ọ bụrụ mmadụ abụọ, ma ọ bụ, ya akarịla mmadụ atọ, onye kwusịa, ibe ya ekwuo; ka otu onye na-asụgharị ihe a na-ekwu.+
28 Ma ọ bụrụ na e nweghị onye nsụgharị, ya gbachie nkịtị n’ọgbakọ ma na-agwa onwe ya+ na Chineke okwu.
29 Ka ndị amụma abụọ ma ọ bụ atọ+ kwuokwa okwu, ka ndị ọzọ chọpụtakwa ihe ọ pụtara.+
30 Ma ọ bụrụ na e kpugheere onye nke ọzọ+ ihe mgbe ọ nọ ala n’ebe ahụ, ka onye nke mbụ gbachie nkịtị.
31 N’ihi na unu niile pụrụ ibu amụma,+ otu onye busịa, ibe ya ebuo, ka mmadụ niile wee mụta ihe, e wee gbaa mmadụ niile ume.+
32 Ọ bụ ndị amụma ga-achịkwa onyinye mmụọ nsọ nke ndị amụma.
33 N’ihi na Chineke abụghị Chineke nke aghara,+ kama nke udo.+
Dị ka ọ dị n’ọgbakọ niile nke ndị nsọ,
34 ka ụmụ nwaanyị na-agbachi nkịtị+ n’ọgbakọ, n’ihi na e nyeghị ha ike ikwu okwu, kama ka ha nọrọ n’okpuru ndị ikom,+ ọbụna dị ka Iwu+ ahụ si kwuo.
35 Ya mere, ọ bụrụ na ha chọrọ ịmụta ihe, ka ha jụọ di ha n’ụlọ, n’ihi na ọ bụ ihe ihere+ nwaanyị ikwu okwu n’ọgbakọ.
36 Gịnị? Ọ̀ bụ n’ebe unu nọ ka okwu Chineke si pụta,+ ka ọ̀ bụ naanị n’ebe unu nọ ka o ruru?
37 Ọ bụrụ na onye ọ bụla echee na ya bụ onye amụma ma ọ bụ na ya nwere onyinye nke mmụọ nsọ, ya nabata ihe m na-edetara unu, n’ihi na ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị nyere n’iwu.+
38 Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla amaghị ihe ndị a, ọ ga-anọgide n’amaghị ha.
39 Ya mere, ụmụnna m, jirinụ ịnụ ọkụ n’obi na-achọ ibu amụma,+ ma unu amachibidokwala ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche+ iwu.
40 Ma ka e mee ihe niile n’ụzọ kwesịrị ekwesị nakwa n’usoro.+