1 Jọn 4:1-21

4  Ndị m hụrụ n’anya, unu ekwerela okwu dum si n’aka mmụọ,+ kama nwaleenụ okwu si n’aka mmụọ, ka unu wee chọpụta ma ò si n’aka Chineke,+ n’ihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha abanyewo n’ime ụwa.+  Nke a bụ ihe unu ga-eji mata okwu si n’aka Chineke:+ Okwu ọ bụla nke si n’aka mmụọ, nke na-ekwupụta na Jizọs Kraịst bịara n’anụ ahụ́, si n’aka Chineke,+  ma okwu ọ bụla nke si n’aka mmụọ, nke na-adịghị ekwupụta Jizọs, esighị n’aka Chineke.+ Ọ bụ ya bụ okwu si n’aka mmụọ nke onye ahụ na-emegide Kraịst, onye unu nụrụ na ọ na-abịa,+ ugbu a, ọ nọrọlarị n’ụwa.+  Ụmụntakịrị, unu sitere na Chineke, unu emeriwokwa ndị ahụ,+ n’ihi na onye ahụ unu na ya dị n’otu+ karịrị+ onye ahụ ya na ụwa dị n’otu.+  Ha sitere n’ụwa;+ ọ bụ ya mere ha ji na-ekwu ihe sitere n’ụwa, ụwa na-egekwa ha ntị.+  Anyị sitere na Chineke.+ Onye nwere ihe ọmụma banyere Chineke na-ege anyị ntị;+ onye na-esiteghị na Chineke adịghị ege anyị ntị.+ Ọ bụ otú a ka anyị si amata okwu si n’aka mmụọ, ma nke bụ́ eziokwu ma nke bụ́ njehie.+  Ndị m hụrụ n’anya, ka anyị na-ahụrịta ibe anyị n’anya,+ n’ihi na ịhụnanya+ si n’aka Chineke, onye ọ bụla nke nwere ịhụnanya, a mụrụ ya site na Chineke,+ o nwekwara ihe ọmụma banyere Chineke.+  Onye na-enweghị ịhụnanya amaghị Chineke, n’ihi na Chineke bụ ịhụnanya.+  Ọ bụ site n’ihe a ka e mere ka ịhụnanya Chineke pụta ìhè n’ebe anyị nọ,+ n’ihi na Chineke zitere Ọkpara ọ mụrụ naanị+ ya n’ụwa ka anyị nwee ike inweta ndụ site n’aka ya.+ 10  Ịhụnanya ahụ si otú a dịrị, ọ bụghị na ọ bụ anyị hụrụ Chineke n’anya, kama na ọ bụ ya hụrụ anyị n’anya wee zite Ọkpara ya ka ọ bụrụ àjà+ ime udo+ maka mmehie anyị.+ 11  Ndị m hụrụ n’anya, ọ bụrụ otú a ka Chineke si hụ anyị n’anya, anyị onwe anyị ji ụgwọ ịhụrịta ibe anyị n’anya.+ 12  Ọ dịghị mgbe onye ọ bụla hụtụworo Chineke.+ Ọ bụrụ na anyị na-ahụrịta ibe anyị n’anya, Chineke ga-anọgide n’ime anyị, a ga-emekwa ka ịhụnanya ya zuo okè n’ime anyị.+ 13  Anyị si otú a mata na anyị na ya dị n’otu,+ ya onwe ya na anyị onwe anyị adịrịkwa n’otu,+ n’ihi na o nyewo anyị mmụọ ya.+ 14  Ihe ọzọ bụ na anyị onwe anyị ahụwo+ ma na-agba àmà+ na Nna ahụ zitere Ọkpara ya ka ọ bụrụ Onye Nzọpụta nke ụwa.+ 15  Onye ọ bụla nke na-ekwupụta na Jizọs Kraịst bụ Ọkpara Chineke,+ Chineke na onye ahụ na-adị n’otu, onye ahụ n’onwe ya na Chineke na-adịkwa n’otu.+ 16  Anyị onwe anyị amarawokwa ma kwere n’ịhụnanya ahụ+ Chineke nwere n’ebe anyị nọ. Chineke bụ ịhụnanya,+ Chineke na onye nọgidere n’ịhụnanya+ na-adị n’otu, onye ahụ n’onwe ya na Chineke na-adịkwa n’otu.+ 17  Otú a ka e si mee ka ịhụnanya zuo okè n’ebe anyị nọ, ka anyị wee nwee nkwuwa okwu+ n’ụbọchị ikpe,+ n’ihi na, dị nnọọ ka onye ahụ dị, otú ahụ ka anyị onwe anyị dị n’ụwa a.+ 18  Egwu ọ bụla adịghị n’ịhụnanya,+ kama ịhụnanya nke zuru okè na-achụpụ egwu n’èzí,+ n’ihi na egwu na-eweta ihe mgbochi. N’ezie, e mebeghị ka onye na-atụ egwu zuo okè n’ịhụnanya.+ 19  Ma anyị onwe anyị nwere ịhụnanya, n’ihi na o bu ụzọ hụ anyị n’anya.+ 20  Ọ bụrụ na onye ọ bụla asị: “Ahụrụ m Chineke n’anya,” ma ọ kpọrọ nwanna ya asị, ọ bụ onye ụgha.+ N’ihi na onye na-ahụghị nwanna ya n’anya,+ bụ́ onye ọ na-ahụ anya, apụghị ịhụ Chineke n’anya, bụ́ onye ọ na-adịghị ahụ anya.+ 21  Iwu a ka anyị sikwa n’ebe ọ nọ nweta,+ na onye hụrụ Chineke n’anya kwesịkwara ịhụ nwanna ya n’anya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji