Ọrụ Ndịozi 13:1-52
13 N’Antiọk, e nwere ndị amụma+ na ndị ozizi n’ọgbakọ dị n’ebe ahụ, Banabas ya na Simiọn onye a kpọrọ Naịja, na Lushiọs+ onye Saịrini, na Manen onye ya na Herọd onye na-achị ógbè ahụ gụkọrọ akwụkwọ, tinyere Sọl.
2 Ka ha nọ na-ejere Jehova ozi n’ihu ọha+ ma na-ebu ọnụ, mmụọ nsọ sịrị: “N’etiti mmadụ niile, dooro m Banabas na Sọl+ iche maka ọrụ m kpọrọ ha ka ha rụọ.”
3 Mgbe ahụ ha buru ọnụ ma kpee ekpere wee bikwasị ha aka+ n’isi wee hapụ ha ka ha gawa.
4 Ya mere, ndị ikom a, bụ́ ndị mmụọ nsọ zipụrụ, gbadara Seliushia, ha sikwa n’ebe ahụ jiri ụgbọ mmiri gaa Saịprọs.
5 Mgbe ha rutere Salamis, ha malitere ikwusa okwu Chineke n’ụlọ nzukọ ndị Juu. Ọ bụ Jọn+ na-ejere ha ozi.
6 Mgbe ha gazuru agwaetiti ahụ dum ruo Pefọs, ha zutere otu nwoke, bụ́ dibịa afa, onye amụma ụgha,+ onye Juu aha ya bụ Baa-Jizọs,
7 ya na onye na-achị ógbè ahụ bụ́ Sajiọs Pọlọs, bụ́ nwoke maara ihe, nọkwa. Mgbe nwoke a kpọrọ Banabas na Sọl ka ha bịakwute ya, ọ chọsiri ike ịnụ okwu Chineke.
8 Ma Elimas onye bụ́ dibịa afa (n’ezie, nke ahụ bụ otú e si asụgharị aha ya) malitere imegide ha,+ na-achọ ime ka onye ahụ na-achị ógbè ahụ ghara inwe okwukwe n’Onyenwe anyị.
9 Ma ebe Sọl, onye bụkwa Pọl, jupụtara na mmụọ nsọ, o legidere ya anya
10 wee sị: “Gị onye jupụtara n’ụdị aghụghọ ọ bụla na ụdị arụrụala ọ bụla, gị nwa Ekwensu,+ gị onye iro nke ihe ọ bụla ziri ezi, ị́ gaghị akwụsị ịgbagọ ụzọ ziri ezi nke Jehova?
11 Ugbu a kwa, lee! aka Jehova na-adịkwasị gị, ị ga-ekpukwa ìsì, n’ahụghị ìhè anyanwụ ruo oge ụfọdụ.” N’otu ntabi anya, oké alụlụụ na ọchịchịrị dakwasịrị ya, o wee na-agagharị na-achọ ndị ga-ejide ya n’aka wee na-edu ya.+
12 Mgbe onye ahụ na-achị ógbè+ ahụ hụrụ ihe mere, ọ ghọrọ onye kwere ekwe, n’ihi na ozizi Jehova juru ya anya.
13 Ndị ikom ahụ na Pọl wee banye n’ụgbọ mmiri na Pefọs, rute Paga nke dị na Pamfilia.+ Ma Jọn+ hapụrụ ha wee laghachi+ Jeruselem.
14 Otú ọ dị, ha si na Paga gaa n’ihu wee bịa Antiọk dị na Pisidia, ka ha banyere n’ụlọ nzukọ+ n’ụbọchị izu ike, ha nọdụrụ ọdụ.
15 Mgbe a gụsịrị Iwu+ ahụ na Akwụkwọ Ndị Amụma n’ihu ọha, ndị isi oche+ ụlọ nzukọ zigaara ha ozi, sị: “Ụmụnna anyị, ọ bụrụ na unu nwere okwu agbamume ọ bụla unu ga-agwa ndị a, kwuonụ ya.”
16 Ya mere, Pọl biliri, fee aka,+ sị:
“Ụmụ Izrel na unu ndị ọzọ na-atụ egwu Chineke, nụrụnụ.+
17 Chineke nke ndị a bụ́ ndị Izrel họọrọ nna nna anyị hà, o bulikwara ha elu n’oge ha biri dị ka ndị ala ọzọ n’ala Ijipt ma jiri ogwe aka dị ike kpọpụta ha na ya.+
18 O diri ụzọ ha si mee omume n’ala ịkpa ruo ihe dị ka afọ iri anọ.+
19 Mgbe o bibisịrị mba asaa n’ala Kenan, o kere ala ha site n’ife nza:+
20 ihe ahụ niile mere n’ime ihe dị ka narị afọ anọ na iri ise.
“Mgbe ihe ndị a gasịkwara, o nyere ha ndị ikpe ruo n’oge Samuel onye amụma.+
21 Ma malite n’oge ahụ gaa n’ihu, ha kwuru ka e nye ha eze,+ Chineke wee nye ha Sọl nwa Kish, nwoke si n’ebo Benjamin,+ ruo afọ iri anọ.
22 Mgbe o wepụsịrị ya,+ o mere ka Devid bụrụ eze ha,+ bụ́ onye ọ gbara àmà banyere ya, sị, ‘Ahọrọwo m Devid nwa Jesi,+ nwoke obi m nabatara,+ onye ga-eme ihe niile m na-achọ.’+
23 Chineke si n’ụmụ+ nwoke a wetara Izrel onye nzọpụta,+ bụ́ Jizọs, dị ka o kwere ná nkwa,
24 mgbe Jọn+ kwusasịịrị ndị Izrel niile baptizim n’ihu ọha dị ka ihe na-egosi nchegharị, tupu Onye+ ahụ abata.
25 Ma mgbe ozi Jọn na-agwụcha, ọ sịrị, ‘Gịnị ka unu chere na m bụ? Ọ bụghị m bụ ya. Kama, lee! e nwere onye na-abịa n’azụ m nke m na-erughị eru ịtọpụ akpụkpọ ụkwụ ya.’+
26 “Ụmụnna m, unu ndị si n’agbụrụ Ebreham nakwa ndị ọzọ n’ime unu bụ́ ndị na-atụ egwu Chineke, ọ bụ anyị ka e ziteere ozi nzọpụta a.+
27 N’ihi na ndị bi na Jeruselem na ndị na-achị ha amaghị Onye a,+ ma mgbe ha na-ekpe ya ikpe, ha mezuru ihe Ndị Amụma kwuru,+ bụ́ ihe a na-agụpụta kwa Ụbọchị Izu Ike,
28 ọ bụ ezie na ha ahụghị ihe kwesịrị ọnwụ o mere,+ ha gwara Paịlet ka e gbuo ya.+
29 Mgbe ha mezuru ihe niile e dere banyere ya,+ ha si n’elu osisi budata+ ya ma lie ya n’ili ncheta.+
30 Ma Chineke mere ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie;+
31 o mere ka ndị ha na ya si na Galili gaa Jeruselem na-ahụ ya ruo ọtụtụ ụbọchị. Ọ bụ ha na-agbara ndị Juu àmà banyere ya ugbu a.+
32 “N’ihi ya, anyị na-ezisara unu ozi ọma banyere nkwa ahụ e kwere nna nna anyị hà,+
33 na Chineke emezuworo ya anyị kpamkpam, anyị bụ́ ụmụ ha, ebe ọ bụ na ọ kpọlitere Jizọs n’ọnwụ;+ ọbụna dị ka e dere n’abụ ọma nke abụọ, sị, ‘Ị bụ ọkpara m, aghọwo m Nna gị taa.’+
34 Chineke mere ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie. Ọ gaghị alaghachi ọzọ n’ire ure. O gosiri nke a site n’ikwu, sị, ‘M ga-egosi unu obiọma* na-adịghị ada ada m nwere n’ebe Devid nọ.’+
35 Ya mere, o kwukwara n’abụ ọma ọzọ, sị, ‘Ị gaghị ekwe ka onye na-eguzosi ike n’ebe ị nọ ree ure.’+
36 N’ihi na n’ọgbọ nke ya, Devid+ mezuru uche Chineke nke Chineke kwupụtara ekwupụta, ọ dakwara n’ụra ọnwụ, e wee lie ya n’ebe e liri nna nna ya hà, o wee ree ure.+
37 N’aka nke ọzọ, onye ahụ nke Chineke kpọlitere ereghị ure.+
38 “Ya mere, maranụ, ụmụnna m, na a na-ekwusara unu mgbaghara mmehie site n’Onye a;+
39 marakwanụ na site n’Onye a, a na-akpọ onye ọ bụla kwere ekwe onye ikpe na-amaghị+ n’ihe niile a na-apụghị isite n’iwu Mozis+ kpọọ unu ndị ikpe na-amaghị.
40 N’ihi ya, hụnụ na ihe e kwuru n’Akwụkwọ Ndị Amụma emeghị unu,
41 ‘Hụnụ ya, unu ndị nlelị, ya jukwa unu anya, pụọkwanụ n’anya, n’ihi na ọ dị ọrụ m na-arụ n’ụbọchị unu, bụ́ ọrụ nke unu na-agaghị ekwere ma ọlị ọ bụrụgodị na mmadụ akọọrọ ya unu n’ụzọ zuru ezu.’”+
42 Mgbe ha na-apụ, ndị Juu malitere ịrịọsi ha arịrịọ ike ka ha gwa ha okwu banyere ihe ndị a n’ụbọchị izu ike na-abịanụ.+
43 Ya mere, mgbe ndị zukọrọ n’ụlọ nzukọ gbasara, ọtụtụ n’ime ndị Juu na ndị a tọghatara atọghata, bụ́ ndị na-efe Chineke, sooro Pọl na Banabas.+ Ha gwara ha okwu, malitekwa ịgba ha ume+ ka ha jigidesie obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ ike.+
44 N’ụbọchị izu ike nke sochirinụ, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ obodo ahụ dum zukọtara ka ha nụrụ okwu Jehova.+
45 Mgbe ndị Juu hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, ekworo juru ha obi,+ ha wee malite ikwu okwu iji gbaghaa ihe Pọl na-ekwu.+
46 Pọl na Banabas wee kwuo okwu n’atụghị egwu, sị: “Ọ dị mkpa na unu bụ ndị mbụ a gwara okwu Chineke.+ Ebe ọ bụ na unu na-ajụ ya,+ ebe ọ bụkwa na unu na-ewere onwe unu ná ndị na-erughị eru inweta ndụ ebighị ebi, lee! anyị na-agakwuru ndị mba ọzọ.+
47 N’eziokwu, Jehova enyewo anyị iwu site n’ikwu, sị, ‘Ahọpụtawo m gị ka ị bụrụ ìhè nke ndị mba ọzọ,+ ka i wee bụrụ nzọpụta ruo nsọtụ ụwa.’”+
48 Mgbe ndị mba ọzọ nụrụ ihe a, ha malitere ịṅụrị ọṅụ na ito okwu Jehova,+ ndị niile nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi wee ghọọ ndị kwere ekwe.+
49 E wee buru okwu Jehova na-agazu mba ahụ dum.+
50 Ma ndị Juu+ kpaliri ụmụ nwaanyị a na-akwanyere ùgwù, bụ́ ndị na-efe Chineke, ha na ndị isi obodo, ha wee mee ka a malite ịkpagbu+ Pọl na Banabas ma chụpụ ha n’ókèala ha.
51 Ha tichapụụrụ ha ájá dị ha n’ụkwụ+ ma jee Aịkoniọm.
52 Ndị na-eso ụzọ Jizọs jupụtakwara n’ọṅụ+ na mmụọ nsọ.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”