Ọpụpụ 9:1-35
9 N’ihi ya, Jehova gwara Mozis, sị: “Bakwuru Fero, sị ya,+ ‘Nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke ndị Hibru kwuru: “Hapụ ndị m ka ha gaa jeere m ozi.
2 Ma ọ bụrụ na ị na-ajụ ịhapụ ha, i wee na-ejichi ha,+
3 lee! aka Jehova+ na-abịakwasị anụ ụlọ+ gị ndị nọ n’ọhịa. Ọrịa na-efe efe nke dị oké njọ+ ga-ejide ịnyịnya, ịnyịnya ibu, kamel, ìgwè ehi na ìgwè atụrụ unu.
4 Jehova ga-akpakwa ókè n’agbata anụ ụlọ ụmụ Izrel na anụ ụlọ ndị Ijipt, ọ dịghị otu n’ime ihe niile bụ́ nke ụmụ Izrel gaje ịnwụ.”’”+
5 Jehova kwukwara oge nke a ga-eme, sị: “Jehova ga-eme ihe a n’ala a echi.”+
6 Jehova wee mee ihe a n’echi ya, ụdị anụ ụlọ niile nke ndị Ijipt wee malite ịnwụ;+ ma ọ dịghị otu n’ime anụ ụlọ ụmụ Izrel nwụrụnụ.
7 Fero wee zipụ ndị ozi, ma, lee! ọbụna otu anụ ụlọ ụmụ Izrel anwụghị. N’agbanyeghị nke a, obi Fero ka kpọchiri akpọchi,+ ọ hapụghịkwa ndị Izrel.
8 E mesịa, Jehova gwara Mozis na Erọn, sị: “Kpojuonụ ntụ si n’ekwú n’aka unu abụọ,+ Mozis ga-awụlikwa ya elu n’anya Fero.
9 Ọ ga-aghọ uzuzu n’ala Ijipt dum, ọ ga-aghọkwa etuto ọjọọ nke na-eto+ n’ahụ́ mmadụ na anụmanụ n’ala Ijipt dum.”
10 Ha wee kporo ntụ si n’ekwú wee guzo n’ihu Fero, Mozis wee wụlie ya elu, o wee ghọọ etuto ọjọọ,+ nke na-eto n’ahụ́ mmadụ na anụmanụ.
11 Ndị dibịa anwansi ahụ enweghị ike iguzo n’ihu Mozis n’ihi etuto ahụ, n’ihi na etuto ahụ toro ndị dibịa anwansi ahụ, tookwa ndị Ijipt niile.+
12 Ma Jehova kwere ka obi Fero kpọchie, o geghịkwa ha ntị, dị nnọọ ka Jehova gwara Mozis.+
13 Jehova wee sị Mozis: “Bilie n’isi ụtụtụ gaa guzo n’ihu Fero,+ gwa ya, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke ndị Hibru kwuru: “Hapụ ndị m ka ha gaa jeere m ozi.+
14 N’ihi na n’oge a, m ga-eme ka ihe otiti m niile bịakwasị gị na ndị na-ejere gị ozi na ndị gị, ka i wee mara na ọ dịghị onye dị ka m n’ụwa dum.+
15 N’ihi na m gaara esetịworị aka m ka m wee tie gị na ndị gị ọrịa na-efe efe, ka e wee kpochapụ gị n’ụwa.+
16 Kama, n’eziokwu, ọ bụ nke a mere m ji debe gị ndụ,+ iji gosi gị ike m nakwa iji mee ka a kpọsaa aha m n’ụwa dum.+
17 Ị̀ ka na-emere ndị m mpako wee ghara ịhapụ ha ka ha laa?+
18 Lee, m ga-eme ka oké akụ́ mmiri ígwé zoo n’ụdị ugbu a echi, nke ụdị ya na-ezotụbeghị n’Ijipt malite n’ụbọchị ọ malitere ruo ugbu a.+
19 Ugbu a, zipụ ndị mmadụ ka ha mee ka anụ ụlọ gị niile na ndị gị niile nọ n’ọhịa bata n’ụlọ. Mmadụ ọ bụla na anụmanụ ọ bụla nọ n’ọhịa bụ́ ndị a na-emeghị ka ha banye n’ụlọ, akụ́ mmiri ígwé ahụ aghaghị ịdagbu ha.”’”
20 Onye ọ bụla nke tụrụ egwu okwu Jehova n’etiti ndị na-ejere Fero ozi mere ka ndị na-ejere ya ozi na anụ ụlọ ya gbaba n’ime ụlọ,+
21 ma onye ọ bụla ọ na-emetụghị n’obi iji okwu Jehova kpọrọ ihe hapụrụ ndị na-ejere ya ozi na anụ ụlọ ya n’ọhịa.+
22 Jehova wee gwa Mozis, sị: “Setịa aka+ gị chee n’eluigwe, ka akụ́ mmiri ígwé+ wee daa n’ala Ijipt dum, dakwasị mmadụ na anụ ọhịa na ahịhịa ndụ niile nke ubi n’ala Ijipt.”
23 Mozis wee setịa mkpara ya chee n’eluigwe; Jehova wee mee ka e nwee égbè eluigwe na akụ́ mmiri ígwé,+ ọkụ ana-awụdatakwa n’ala, Jehova wee mee ka akụ́ mmiri ígwé na-ezo n’ala Ijipt.
24 Akụ́ mmiri ígwé wee dawa, ọkụ na-enwukwa ka akụ́ mmiri ígwé ahụ na-ada. Ọ dị nnọọ ukwuu, nke na ọ dịbeghị nke dị ka ya n’ala Ijipt dum malite n’oge ọ ghọrọ mba.+
25 Akụ́ mmiri ígwé wee na-ada n’ala Ijipt dum. Akụ́ mmiri ígwé ahụ wee dagbuo ihe ọ bụla nọ n’ọhịa, malite na mmadụ ruo n’anụmanụ, bibiekwa ụdị ahịhịa ndụ niile nke ubi; o wee gbajisịa ụdị osisi niile dị n’ọhịa.+
26 Ọ bụ naanị n’ala Goshen, bụ́ ebe ụmụ Izrel nọ, ka akụ́ mmiri ígwé ahụ na-adaghị.+
27 E mesịa, Fero ziri ozi wee kpọọ Mozis na Erọn wee gwa ha, sị: “Emehiewo m ugbu a.+ Jehova bụ onye ezi omume,+ ọ bụ mụ na ndị m mejọrọ.
28 Rịọsienụ Jehova arịrịọ ike ka égbè eluigwe na akụ́ mmiri ígwé+ a nke si n’aka Chineke kwụsị. Mgbe ahụ, m ga-ahapụ unu ka unu laa, unu agakwaghị anọ ebe a.”
29 Mozis wee sị ya: “Ozugbo m pụrụ n’obodo a, m ga-agbasapụrụ Jehova aka m.+ Égbè eluigwe a ga-akwụsị, akụ́ mmiri ígwé a agaghịkwa ada ọzọ, ka i wee mara na ọ bụ Jehova nwe ụwa.+
30 Ma ama m ama na o ruo mgbe ahụ na gị na ndị na-ejere gị ozi agaghịdị atụ egwu Jehova bụ́ Chineke.”+
31 Dị ka o si dị, e bibiri ogho na ọka bali, n’ihi na ọka bali amịala oko, ogho amawokwa ifuru.+
32 Ma e bibighị ọka wit na ọka spelt,+ n’ihi na oge ha ji amị erubeghị.
33 Mozis wee si n’obodo ahụ Fero nọ pụọ gaa gbasapụrụ Jehova aka ya, égbè eluigwe ahụ na akụ́ mmiri ígwé ahụ wee malite ịkwụsị, mmiri kwụsịkwara izo n’ala ahụ.+
34 Mgbe Fero hụrụ na mmiri ozuzo ahụ na akụ́ mmiri ígwé ahụ na égbè eluigwe ahụ akwụsịwo, o mehiere ọzọ wee kpọchie obi ya,+ ya na ndị na-ejere ya ozi.
35 Obi Fero ka kpọchiri akpọchi, ọ hapụghịkwa ụmụ Izrel ka ha laa, dị nnọọ ka Jehova kwuru site n’ọnụ Mozis.+