Ọpụpụ 8:1-32
8 Jehova wee gwa Mozis, sị: “Bakwuru Fero, ị ga-asị ya, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Hapụ ndị m ka ha gaa jeere m ozi.+
2 Ọ bụrụ na ị na-ajụ ịhapụ ha, lee, m ga-eji mbàrá tie ókèala gị niile ihe otiti.+
3 Osimiri Naịl ga-ejupụtakwa nnọọ na mbàrá, ha ga-apụtakwa banye n’ụlọ gị nakwa n’ụlọ ndina ime ime gị nakwa n’elu ihe ndina gị nakwa n’ime ụlọ ndị na-ejere gị ozi nakwa n’ebe ndị gị nọ nakwa n’ime ekwú gị nakwa n’ihe i ji agwọ achịcha.+
4 Ọ bụkwa n’ahụ́ gị nakwa n’ahụ́ ndị gị nakwa n’ahụ́ ndị niile na-ejere gị ozi ka mbàrá ndị ahụ ga-amagoro.”’”+
5 E mesịa Jehova sịrị Mozis: “Gwa Erọn, sị, ‘Jiri mkpara gị setịa aka+ n’elu osimiri dị iche iche, ọwa mmiri niile nke Naịl nakwa ọdọ mmiri ndị jupụtara n’ahịhịa amị wee mee ka mbàrá jupụta n’ala Ijipt.’”
6 Erọn wee setịa aka n’elu mmiri ndị dị n’Ijipt, mbàrá wee malite ịpụta wee kpuchie ala Ijipt.
7 Otú ọ dị, ndị dibịa anwansi ahụ mere otu ihe ahụ site n’anwansi ha wee mee ka mbàrá kpuchie ala Ijipt.+
8 Ka oge na-aga, Fero kpọrọ Mozis na Erọn wee sị: “Rịọsienụ Jehova arịrịọ ike+ ka o wepụrụ mụ na ndị m mbàrá ndị a, n’ihi na m chọrọ ịhapụ ndị unu ka ha gaa chụọrọ Jehova àjà.”+
9 Mozis wee gwa Fero, sị: “Biko, kwuo n’onwe gị mgbe m ga-arịọrọ gị arịrịọ, rịọkwara ndị na-ejere gị ozi na ndị gị iji wepụrụ gị na ụlọ gị mbàrá ndị ahụ. Naanị n’Osimiri Naịl ka ha ga-afọdụ.”
10 Fero wee sị: “Echi.” O wee sị: “Ọ ga-adị ka i kwuru, ka i wee mara na ọ dịghị onye ọ bụla ọzọ dị ka Jehova bụ́ Chineke anyị,+
11 n’ihi na mbàrá ndị ahụ ga-apụ n’ebe ị nọ, pụọkwa n’ụlọ gị nakwa n’ebe ndị na-ejere gị ozi nọ nakwa n’ebe ndị gị nọ. Naanị n’Osimiri Naịl ka ha ga-afọdụ.”+
12 Mozis na Erọn wee si n’ebe Fero nọ pụọ, Mozis wee kpọkuo Jehova+ n’ihi mbàrá ndị ahụ O wetaara Fero.
13 Jehova wee mee dị ka okwu Mozis si dị,+ mbàrá ndị ahụ malitere ịnwụsị n’ụlọ ha, n’ogige ha nakwa n’ala ha.
14 Ha wee kpokọta ha n’ikpo n’ikpo, ala ahụ wee malite isi ísì.+
15 Mgbe Fero hụrụ na ahụ́ eruola ha ala, ọ kpọchiri obi ya;+ o geghịkwa ha ntị, dị nnọọ ka Jehova kwuru.+
16 Jehova wee sị Mozis: “Gwa Erọn, sị, ‘Setịa mkpara+ gị kụọ ájá dị n’ala, ọ ga-aghọkwa anwụnta n’ala Ijipt dum.’”
17 Ha wee mee nke a. Erọn wee jiri mkpara ya setịa aka kụọ ájá dị n’ala, anwụnta wee tawa mmadụ na anụmanụ. Ájá niile dị n’ala wee ghọọ anwụnta n’ala Ijipt dum.+
18 Ndị dibịa anwansi ahụ wee nwaa iji anwansi ha mee otu ihe ahụ,+ iji mee ka anwụnta pụta, ma ha enweghị ike.+ Anwụnta ndị ahụ wee na-ata ma mmadụ ma anụmanụ.
19 Ndị dibịa anwansi ahụ wee gwa Fero, sị: “Ọ bụ mkpịsị aka+ Chineke!”+ Ma obi Fero ka kpọchiri akpọchi,+ o geghị ha ntị, dị nnọọ ka Jehova kwuru.
20 Jehova wee gwa Mozis, sị: “Bilie n’isi ụtụtụ gaa guzo n’ihu Fero.+ Lee! Ọ na-apụta ịga ná mmiri! Ị ga-asịkwa ya, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Hapụ ndị m ka ha gaa jeere m ozi.+
21 Ma ọ bụrụ na i kweghị ịhapụ ndị m, lee, m na-ezitere gị na ndị na-ejere gị ozi na ndị gị odudu, zitekwa ya n’ụlọ gị;+ odudu ga-ejupụta n’ụlọ ndị Ijipt, jupụtakwa n’ala nke ha nọ na ya.
22 N’ụbọchị ahụ, m ga-eme ka ala Goshen bụ́ ebe ndị m guzo dị iche, ka odudu ghara ịdị n’ebe ahụ;+ ka i wee mara na mụ onwe m bụ Jehova n’ụwa dum.+
23 N’ezie, m ga-akpa ókè n’etiti ndị m na ndị gị.+ Ihe ịrịba ama a ga-eme echi.”’”
24 Jehova wee mee otú ahụ; ọtụtụ ìgwè odudu wee malite inubata n’ụlọ Fero nakwa n’ụlọ ndị na-ejere ya ozi nakwa n’ala Ijipt dum.+ Ala ahụ wee bibie n’ihi odudu ahụ.+
25 N’ikpeazụ, Fero kpọrọ Mozis na Erọn wee sị: “Gawanụ chụọrọ Chineke unu àjà n’ala a.”+
26 Ma Mozis sịrị: “Ọ dịghị mma ime otú ahụ, n’ihi na ihe anyị ga-achụrụ Jehova bụ́ Chineke anyị n’àjà bụ ihe arụ n’anya ndị Ijipt.+ Ọ bụrụkwanụ na ihe anyị ga-achụ n’àjà bụ ihe arụ n’anya ndị Ijipt; ọ̀ bụ na ha agaghị atụ anyị nkume?
27 Anyị ga-aga njem ga-ewe ụbọchị atọ n’ala ịkpa, anyị ga-achụkwara Jehova bụ́ Chineke anyị àjà dị nnọọ ka ọ gwaworo anyị.”+
28 Fero wee sị: “Mụ onwe m ga-ahapụ unu,+ unu ga-achụkwara Jehova bụ́ Chineke unu àjà n’ala ịkpa.+ Kama, unu emela ka ebe unu ga-aga dị oké anya. Rịọsierenụ m arịrịọ ike.”+
29 Mozis wee sị: “Lee, apụwala m n’ebe ị nọ, m ga-arịọsikwara gị Jehova arịrịọ ike, odudu ahụ ga-ahapụ Fero na ndị na-ejere ya ozi nakwa ndị ya echi. Kama, ka Fero ghara igwu egwu ọzọ site n’ịjụ ịhapụ ndị anyị ka ha gaa chụọrọ Jehova àjà.”+
30 E mesịa, Mozis si n’ebe Fero nọ pụọ wee rịọsie Jehova arịrịọ ike.+
31 Jehova wee mee dị ka okwu Mozis si dị,+ odudu ndị ahụ wee hapụ Fero na ndị na-ejere ya ozi nakwa ndị ya.+ Otu afọdụghị.
32 Otú ọ dị, Fero kpọchiri obi ya n’oge a kwa, ọ hapụghịkwa ndị Izrel ka ha laa.+