Ọpụpụ 7:1-25

7  Ya mere, Jehova gwara Mozis, sị: “Lee, emewo m ka ị bụụrụ Fero Chineke,+ Erọn nwanne gị ga-abụkwa onye amụma gị.+  Gị onwe gị ga-ekwu ihe niile m ga-enye gị n’iwu;+ Erọn nwanne gị ga na-agwa Fero okwu,+ ọ ga-ahapụkwa ụmụ Izrel ka ha si n’ala ya pụọ.+  Ma mụ onwe m, m ga-ekwe ka obi Fero kpọchie,+ m ga-emekwa ka ihe ịrịba ama m na ọrụ ebube m mụbaa n’ala Ijipt.+  Fero agaghị ege unu ntị;+ m ga-ebi Ijipt aka wee jiri oké ikpe+ kpọpụta ụsụụ m,+ bụ́ ndị m,+ ụmụ Izrel,+ n’ala Ijipt.  Ndị Ijipt ga-amara na mụ onwe m bụ Jehova mgbe m setịrị aka m mee Ijipt+ ihe, n’ezie, m ga-akpọpụta ụmụ Izrel n’etiti ha.”+  Mozis na Erọn wee gaa n’ihu na-eme dị ka Jehova nyere ha n’iwu.+ Ha mere nnọọ otú ahụ.+  Mozis gbara afọ iri asatọ, Erọn agbaakwa afọ iri asatọ na atọ n’oge ha gwara Fero okwu.+  Jehova wee gwa Mozis na Erọn, sị:  “Ọ bụrụ na Fero agwa unu, sị, ‘Rụọnụ ọrụ ebube,’+ mgbe ahụ, ị ga-asị Erọn, ‘Were mkpara+ gị tụpụ n’ala n’ihu Fero.’ Ọ ga-aghọ nnukwu agwọ.”+ 10  Mozis na Erọn wee bakwuru Fero wee mee kpọmkwem dị ka Jehova nyere n’iwu. Erọn wee tụpụ mkpara ya n’ala n’ihu Fero nakwa n’ihu ndị na-ejere ya ozi, o wee ghọọ nnukwu agwọ. 11  Otú ọ dị, Fero kpọkwara ndị amamihe ya na ndị dibịa afa ya;+ ndị dibịa anwansi nke Ijipt jikwa anwansi ha mee otu ihe ahụ.+ 12  Onye ọ bụla n’ime ha wee tụpụ mkpara ya n’ala, mkpara ha wee ghọọ nnukwu agwọ; ma mkpara Erọn loro mkpara ha. 13  N’agbanyeghị ya, Fero kpọchiri obi ya, o geghị ha ntị,+ dị nnọọ ka Jehova kwuru. 14  Jehova wee gwa Mozis, sị: “Obi Fero akpọchiela.+ Ọ jụwo ịhapụ ndị m ka ha laa.+ 15  Gakwuru Fero n’ụtụtụ. Lee! Ọ na-apụta ịga na mmiri!+ Ị ga-anọrọ n’ọnụ ọnụ Osimiri Naịl+ ka i wee zute ya, ị ga-ejikwa mkpara ahụ nke ghọrọ agwọ.+ 16  Ị ga-asị ya, ‘Jehova bụ́ Chineke ndị Hibru eziwo m ka m bịakwute gị,+ sị: “Hapụ ndị m ka ha gaa jeere m ozi n’ala ịkpa,”+ ma, lee, i gebeghị ntị ruo ugbu a. 17  Nke a bụ ihe Jehova kwuru:+ “Ị ga-eji nke a mara na mụ onwe m bụ Jehova.+ Lee, m ga-akụ mkpara m ji ná mmiri dị n’Osimiri Naịl,+ ọ ga-aghọkwa ọbara.+ 18  Azụ̀ ndị dị n’Osimiri Naịl ga-anwụ,+ Osimiri Naịl ga na-esi ísì,+ mmiri Osimiri Naịl agaghị ekwe ndị Ijipt ọṅụṅụ.”’”+ 19  E mesịa, Jehova sịrị Mozis: “Gwa Erọn, sị, ‘Were mkpara gị, setịa aka+ gị n’elu mmiri nke Ijipt, n’elu osimiri ha, n’elu ọwa mmiri niile nke Naịl nakwa n’elu ọdọ mmiri ha ndị jupụtara n’ahịhịa amị+ nakwa n’elu mmiri niile ha na-adịghị asọ asọ, ka ha wee ghọọ ọbara.’ Ọbara ga-adị n’ala Ijipt dum nakwa n’arịa ndị e ji osisi mee nakwa n’arịa ndị e ji nkume mee.” 20  Mozis na Erọn mere otú ahụ ozugbo,+ dị nnọọ ka Jehova nyere n’iwu,+ o wee welie mkpara ahụ kụọ mmiri Osimiri Naịl n’ihu Fero nakwa n’ihu ndị na-ejere ya ozi,+ mmiri niile dị n’Osimiri Naịl wee ghọọ ọbara.+ 21  Azụ̀ ndị dị n’Osimiri Naịl wee nwụọ,+ Osimiri Naịl wee malite isi ísì; ndị Ijipt enweghịkwa ike ịṅụ mmiri Osimiri Naịl;+ ọbara wee jupụta n’ala Ijipt dum. 22  Otú o sina dị, ndị dibịa anwansi nke Ijipt ji anwansi+ ha mee otu ihe ahụ; obi Fero ka kpọchiri akpọchi,+ o geghịkwa ha ntị, dị nnọọ ka Jehova kwuru.+ 23  Fero wee tụgharịa laa n’ụlọ ya, o metụghịkwa ya n’obi ichebara ihe a echiche.+ 24  Ndị Ijipt niile wee na-egwu olulu gburugburu Osimiri Naịl ka ha nweta mmiri ha ga-aṅụ, n’ihi na ha enweghị ike ịṅụ mmiri ọ bụla si n’Osimiri Naịl.+ 25  Ụbọchị asaa wee gabiga ka Jehova tisịrị Osimiri Naịl ihe otiti.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji