Ọpụpụ 6:1-30
6 Jehova wee gwa Mozis, sị: “Ugbu a, ị ga-ahụ ihe m gaje ime Fero,+ n’ihi na ọ bụ aka dị ike ga-eme ka ọ hapụ ha ka ha laa, ọ bụkwa aka dị ike ga-eme ka ọ chụpụ ha n’ala ya.”+
2 Chineke wee gaa n’ihu ịgwa Mozis okwu wee sị ya: “Abụ m Jehova.+
3 M na-apụta n’ihu Ebreham,+ Aịzik+ na Jekọb+ dị ka Chineke bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,+ ma emeghị m ka ha mara+ m n’aha m bụ́ Jehova.+
4 Mụ na ha gbara ndụ na m ga-enye ha ala Kenan, ala ha biri na ya dị ka ndị ọbịa.+
5 Ma mụ onwe m anụwo ịsụ ude ụmụ Izrel,+ bụ́ ndị ndị Ijipt mere ndị ohu, m na-echetakwa ọgbụgba ndụ m.+
6 “Ya mere, gwa ụmụ Izrel, sị, ‘Abụ m Jehova, m ga-akpọpụta unu n’ibu arọ ndị Ijipt, napụtakwa unu n’ohu unu na-agbara ha,+ n’ezie, m ga-eji ogwe aka a gbatịrị agbatị na oké ikpe gbapụta unu.+
7 M ga-akpọta unu n’ebe m nọ dị ka otu ndị,+ m ga-egosikwa na mụ onwe m bụ Chineke unu;+ unu ga-amara na mụ onwe m bụ Jehova bụ́ Chineke unu onye na-akpọpụta unu n’ibu arọ Ijipt.+
8 M ga-akpọbata unu n’ala ahụ m weliri aka ṅụọ iyi+ na m ga-enye Ebreham, Aịzik na Jekọb; n’ezie, m ga-enye ya unu ka ọ bụrụ ihe onwunwe unu.+ Abụ m Jehova.’”+
9 E mesịa, Mozis gwara ụmụ Izrel ihe ndị a, ma ha egeghị Mozis ntị n’ihi nkụda mmụọ nakwa n’ihi ohu ha na-agba bụ́ nke tara akpụ.+
10 Jehova wee gwa Mozis okwu, sị:
11 “Gaa gwa Fero, bụ́ eze Ijipt,+ ka ọ hapụ ụmụ Izrel ka ha si n’ala ya pụọ.”+
12 Otú ọ dị, Mozis kwuru n’ihu Jehova, sị: “Lee! Ụmụ Izrel egeghị m ntị;+ olee otú Fero ga-esi getụdị m ntị,+ ebe m bụ onye a na-ebighị úgwù n’egbugbere ọnụ?”+
13 Ma Jehova gara n’ihu ịgwa Mozis na Erọn okwu ma si n’ọnụ ha nye ụmụ Izrel nakwa Fero, eze Ijipt, iwu, ka o wee kpọpụta ụmụ Izrel n’ala Ijipt.+
14 Ndị a bụ ndị isi ụlọ nna ha: Ụmụ ndị ikom Ruben, bụ́ ọkpara Izrel,+ bụ Henọk na Palu, Hezrọn na Kamaị.+ Ndị a bụ ezinụlọ nke ebo Ruben.+
15 Ụmụ ndị ikom Simiọn bụ Jemuel na Jemin na Ohad na Jekin na Zoha nakwa Sheọl nke nwaanyị Kenan mụrụ.+ Ndị a bụ ezinụlọ nke ebo Simiọn.+
16 Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Livaị,+ dị ka agbụrụ ezinụlọ ha si dị:+ Geshọn na Kohat na Meraraị.+ Livaị dịrị ndụ otu narị afọ na iri atọ na asaa.
17 Ụmụ ndị ikom Geshọn bụ Libnaị na Shimiaị,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ.+
18 Ụmụ ndị ikom Kohat bụ Amram na Izha na Hibrọn na Ọziel.+ Kohat dịrị ndụ otu narị afọ na iri atọ na atọ.
19 Ụmụ ndị ikom Meraraị bụ Malaị na Mushaị.+
Ndị a bụ ezinụlọ nke ndị Livaị, dị ka agbụrụ ezinụlọ ha si dị.+
20 Amram wee lụrụ+ Jokebed nwanne nna ya. E mesịa, ọ mụụrụ ya Erọn na Mozis.+ Amram dịrị ndụ otu narị afọ na iri atọ na asaa.
21 Ụmụ ndị ikom Izha bụ Kora+ na Nefeg na Zikraị.
22 Ụmụ ndị ikom Ọziel bụ Mishel na Elzefan na Sitraị.+
23 Erọn wee lụrụ Elaịsheba nwa Aminadab, nwanne nwaanyị Nashọn.+ E mesịa, ọ mụụrụ ya Nedab na Abaịhu, Elieza na Ịtama.+
24 Ụmụ ndị ikom Kora bụ Asịa na Elkena na Abayasaf.+ Ndị a bụ ezinụlọ nke ndị si n’agbụrụ Kora.+
25 Elieza, nwa Erọn,+ lụụrụ otu n’ime ụmụ ndị inyom Putiel. E mesịa, ọ mụụrụ ya Finihas.+
Ọ bụ ndị a bụ ndị isi nke ndị bụ́ nna ụmụ Livaị, n’ezinụlọ n’ezinụlọ.+
26 Ọ bụ ndị a bụ Erọn na Mozis ahụ Jehova gwara, sị:+ “Kpọpụtanụ ụmụ Izrel n’ala Ijipt dị ka ụsụụ ha si dị.”+
27 Ọ bụ ha bụ ndị nọ na-agwa Fero, eze Ijipt,+ okwu iji kpọpụta ụmụ Izrel n’Ijipt. Ọ bụ ha bụ Mozis na Erọn.
28 O wee ruo n’ụbọchị ahụ Jehova gwara Mozis okwu n’ala Ijipt,+
29 na Jehova gara n’ihu ịgwa Mozis, sị: “Abụ m Jehova.+ Gwa Fero eze Ijipt ihe niile m na-agwa gị.”
30 Mozis wee kwuo n’ihu Jehova, sị: “Lee! Abụ m onye a na-ebighị úgwù n’egbugbere ọnụ, olee otú Fero ga-esi getụdị m ntị?”+