Ọpụpụ 40:1-38
40 Jehova wee gwa Mozis, sị:
2 “N’abalị mbụ n’ọnwa,+ n’ọnwa mbụ, ị ga-ewu ụlọikwuu ahụ, ya bụ, ụlọikwuu nzute.+
3 Ị ga-edebe igbe ihe àmà+ ahụ n’ime ya ma were ákwà mgbochi gbochie Igbe ahụ ka a ghara ịbịa ya nso.+
4 Ị ga-ebubata tebụl+ ahụ ma debe ya otú o kwesịrị ịdị, ị ga-ebubatakwa ihe ndọba oriọna+ ahụ ma mụnye ọkụ n’oriọna ya.+
5 Ị ga-edebe ebe ịchụàjà ahụ e ji ọlaedo rụọ maka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ+ n’ihu igbe ihe àmà ahụ, gebichiekwa ákwà ngebichi nke ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ.+
6 “Ị ga-edebe ebe ịchụàjà+ nke àjà nsure ọkụ ahụ n’ihu ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ, ya bụ, ụlọikwuu nzute,
7 ị ga-adọbakwa efere ahụ n’agbata ụlọikwuu nzute na ebe ịchụàjà ahụ ma gbanye ya mmiri.+
8 Ị ga-agba ya ogige+ gburugburu, gebichiekwa ákwà ngebichi+ nke ọnụ ụzọ ogige ahụ.
9 Ị ga-ewere mmanụ ahụ e ji ete mmadụ mmanụ+ tee ụlọikwuu ahụ na ihe niile dị n’ime ya,+ ị ga-edo ya na arịa ya niile nsọ, ọ ga-aghọkwa ihe dị nsọ.
10 Ị ga-ete ebe ịchụàjà nke àjà nsure ọkụ ahụ mmanụ, ya na arịa ya niile, wee doo ebe ịchụàjà ahụ nsọ,+ ọ ga-aghọkwa ebe ịchụàjà kasị nsọ.+
11 Ị ga-ete efere ahụ mmanụ, ya na ihe ndọkwasị ya, wee doo ya nsọ.
12 “Ị ga-akpọta Erọn na ụmụ ya ndị ikom n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute ma were mmiri saa ha ahụ́.+
13 Ị ga-eyiwe Erọn uwe nsọ+ ndị ahụ, tee ya mmanụ+ ma doo ya nsọ, ọ ga-abụkwa onye nchụàjà m.
14 I mesịa, ị ga-akpọta ụmụ ya, ị ga-eyiwekwa ha uwe mwụda.+
15 Ị ga-etekwa ha mmanụ dị ka i tere nna ha mmanụ,+ ha ga-abụ ndị nchụàjà m, mmanụ ị ga-ete ha ga-eme ka ha na-eje ozi dị ka ndị nchụàjà ruo mgbe a na-akaghị aka n’ọgbọ ha niile.”+
16 Mozis wee mee ihe niile Jehova nyere ya n’iwu.+ O mere nnọọ otú ahụ.
17 O wee ruo n’ọnwa mbụ, n’afọ nke abụọ, n’abalị mbụ n’ọnwa, na e wuru ụlọikwuu ahụ.+
18 Mgbe Mozis wuru ụlọikwuu ahụ, o debere ntọala ya ndị nwere oghere+ ma kwụnye awara osisi ya,+ tinyekwa osisi ntụhie+ ya ma guzobe ogidi ya.+
19 O wee gbasaa ákwà ụlọikwuu+ ahụ n’elu ụlọikwuu ahụ ma were ihe mkpuchi+ ụlọikwuu ahụ kpuchie ya n’elu, dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu.
20 E mesịa, o weere Ihe Àmà+ ahụ tinye n’Igbe ahụ,+ tinyekwa okporo osisi+ ndị ahụ n’Igbe ahụ ma were ihe mkpuchi+ Igbe ahụ kpuchie ya.+
21 Mgbe ahu, o bubatara Igbe ahụ n’ụlọikwuu ahụ ma konye ákwà mgbochi+ ahụ ka a ghara ịbịa igbe ihe àmà+ ahụ nso, dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu.
22 Ọzọ, o debere tebụl+ ahụ n’ụlọikwuu nzute, n’akụkụ ụlọikwuu ahụ, n’ebe ugwu, ná mpụga ákwà mgbochi ahụ,
23 o wee doo achịcha+ ndị ahụ n’usoro n’elu ya n’ihu Jehova, dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu.
24 O wee debe ihe ndọba oriọna+ ahụ n’ụlọikwuu nzute n’ihu tebụl ahụ, n’akụkụ ụlọikwuu ahụ n’ebe ndịda.
25 O wee mụnye ọkụ n’oriọna+ ha n’ihu Jehova, dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu.
26 Ọzọ, ọ dọbara ebe ịchụàjà+ ahụ e ji ọlaedo rụọ n’ụlọikwuu nzute n’ihu ákwà mgbochi ahụ,
27 ka o wee na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’elu ya,+ dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu.
28 N’ikpeazụ, o gebichiri ákwà ngebichi+ nke ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ.
29 O wee dọba ebe ịchụàjà+ nke àjà nsure ọkụ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ, ya bụ, ụlọikwuu nzute, ka o wee na-achụ àjà nsure ọkụ+ na àjà ọka* n’elu ya, dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu.
30 O wee dọba efere ahụ n’agbata ụlọikwuu nzute na ebe ịchụàjà ahụ ma gbanye ya mmiri maka ịsa aka na ụkwụ.+
31 Mozis na Erọn na ụmụ ya ndị ikom wee na-asa aka ha na ụkwụ ha na ya.
32 Mgbe ha na-abanye n’ụlọikwuu nzute ahụ, mgbe ha na-agarukwa nso n’ebe ịchụàjà ahụ, ha na-asa aka na ụkwụ ha,+ dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu.
33 N’ikpeazụ, ọ gbara ụlọikwuu ahụ na ebe ịchụàjà ahụ ogige+ gburugburu ma gebichie ákwà ngebichi nke ọnụ ụzọ ogige ahụ.+
Mozis wee rụchaa ọrụ ahụ.
34 Ígwé ojii+ wee malite ikpuchi ụlọikwuu nzute, ebube Jehova wee jupụta n’ụlọikwuu ahụ.
35 Mozis enweghịkwa ike ịbanye n’ụlọikwuu nzute, n’ihi na ígwé ojii+ ahụ kwụ n’elu ya, ebube Jehova jupụtakwara n’ụlọikwuu ahụ.+
36 Mgbe ígwé ojii ahụ si n’ụlọikwuu ahụ kwụlie, ụmụ Izrel na-akwali na njem niile ha mere ná nkebi ná nkebi.+
37 Otú ọ dị, ọ bụrụ na ígwé ojii ahụ akwụlighị, ha adịghị akwali ruo ụbọchị ọ kwụliri.+
38 N’ihi na ígwé ojii Jehova na-adị n’elu ụlọikwuu ahụ n’ehihie, ọkụ na-adịgidekwa n’elu ya n’abalị, ụlọ Izrel dum na-ahụkwa ya na njem niile ha mere ná nkebi ná nkebi.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.