Ọpụpụ 4:1-31

4  Otú ọ dị, Mozis zara, sị: “Ọ bụrụkwanụ na ha ekwetaghị ihe m kwuru wee ghara ige ntị n’olu m,+ n’ihi na ha gaje ịsị, ‘Jehova apụtaghị ìhè n’ihu gị.’”  Jehova wee sị ya: “Gịnị bụ ihe ahụ i ji n’aka?” o wee sị: “Ọ bụ mkpara.”+  Ọzọ, ọ sịrị: “Tụpụ ya n’ala.” O wee tụpụ ya n’ala, o wee ghọọ agwọ;+ Mozis wee malite ịgbara ya ọsọ.  Jehova wee sị Mozis: “Setịpụ aka gị jide ya n’ọdụ.” O wee setịpụ aka ya jide ya, o wee ghọọ mkpara n’ọbụ aka ya.  Dị ka o si kwuo, “Ka ha wee kwere na Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha,+ Chineke Ebreham,+ Chineke Aịzik+ na Chineke Jekọb,+ apụtawo ìhè n’ihu gị.”+  Jehova wee gwa ya ọzọ, sị: “Biko, tinye aka gị n’obi uwe gị.” O wee tinye aka ya n’obi uwe ya. Mgbe o wepụtara ya, lee, e tiri ya ekpenta n’aka, o wee na-acha ezigbo ọcha!+  E mesịa ọ sịrị: “Weghachi aka gị n’obi uwe gị.” O wee weghachi aka ya n’obi uwe ya. Mgbe o wepụtara ya n’obi uwe ya, lee, e mere ka ọ dịghachi mma dị ka ahụ́ ya dum!+  Dị ka o si kwuo, “Ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na ha ekwetaghị ihe i kwuru, gharakwa ikweta n’ihi ihe ịrịba ama nke mbụ ahụ, ha ga-ekweta n’ihi ihe ịrịba ama nke abụọ.+  Ma ọ ga-eru na ọ bụrụ na ha ekwereghị ọbụna ihe ịrịba ama abụọ ndị a wee ghara ige ntị n’olu gị,+ mgbe ahụ ị ga-aga kute mmiri n’Osimiri Naịl ma wụsa ya n’ala akọrọ; mmiri ahụ ị ga-ekute n’Osimiri Naịl ga-aghọ ọbara, ee, ọ ga-aghọ ọbara n’ala akọrọ.”+ 10  Mozis wee sị Jehova: “Biko, Jehova, abụghị m onye okwu na-aga were were n’ọnụ, abụghị m ya kemgbe ụnyaahụ ma ọ bụkwanụ tupu mgbe ahụ ma ọ bụkwanụ kemgbe ị gwara ohu gị okwu, n’ihi na ọnụ m na ire m na-anyị m arọ ikwu okwu.”+ 11  Jehova wee sị ya: “Ònye nyere mmadụ ọnụ ma ọ bụ ònye mere onye na-adịghị ekwu okwu ma ọ bụ onye ntị chiri ma ọ bụ onye na-ahụ ụzọ nke ọma ma ọ bụ onye ìsì? Ọ́ bụghị mụ onwe m, bụ́ Jehova?+ 12  Ya mere, gawa, mụ onwe m ga-anọnyere ọnụ gị, m ga-akụziri gị ihe ị ga-ekwu.”+ 13  Ma ọ sịrị: “Biko, Jehova, biko ziga onye ọ bụla ọzọ ị ga-eziga.” 14  Jehova wee weso Mozis iwe dị ọkụ, o wee sị: “Ọ̀ bụ na Erọn onye Livaị abụghị nwanne gị?+ Amaara m na ọ pụrụ nnọọ ikwu okwu. Lee, ọ na-abịakwa izute gị. Mgbe ọ hụrụ gị, ọ ga-aṅụrị ọṅụ n’obi ya.+ 15  Ị ga-agwa ya okwu wee tinye okwu ndị ahụ n’ọnụ ya;+ mụ onwe m ga-anọnyere ọnụ gị na ọnụ ya,+ m ga-ezikwa unu ihe unu ga-eme.+ 16  Ọ ga-agwara gị ndị m okwu; ọ ga-erukwa na ọ ga-abụrụ gị ọnụ,+ ị ga-abụkwara ya Chineke.+ 17  Ị ga-eji mkpara a n’aka gị ka i were ya mee ihe ịrịba ama ndị ahụ.”+ 18  Mozis wee gawa wee laghachikwuru Jetro nna nwunye ya wee sị ya:+ “Biko, achọrọ m ịla wee laghachikwuru ụmụnne m ndị nọ n’Ijipt ka m wee mara ma hà ka dị ndụ.”+ Jetro wee sị Mozis: “Laa n’udo.”+ 19  E mesịa, Jehova gwara Mozis okwu na Midian, sị: “Gawa, laghachi n’Ijipt, n’ihi na ndị niile na-achụ nta mkpụrụ obi gị anwụwo.”+ 20  Mozis wee kpọrọ nwunye ya na ụmụ ya wee mee ka ha nọkwasị n’ịnyịnya ibu, o wee laghachi n’ala Ijipt. Mozis wekwaara mkpara nke ezi Chineke n’aka ya.+ 21  Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị: “Mgbe ị laghachisịrị Ijipt, hụ na ị rụrụ n’ihu Fero ọrụ ebube niile ahụ m tinyeworo n’aka gị.+ Ma mụ onwe m ga-ekwe ka obi ya kpọchie;+ ọ gaghịkwa ahapụ ndị m ka ha laa.+ 22  Gwa Fero, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Izrel bụ nwa m nwoke, ọkpara m.+ 23  Ana m asị gị: Hapụ nwa m nwoke ka ọ gaa jeere m ozi. Ma ọ bụrụ na ị jụ ịhapụ ya, lee, m ga-egbu nwa gị nwoke, bụ́ ọkpara gị.”’”+ 24  O wee ruo mgbe ha nọ n’ụzọ, n’ebe ha ga-arahụ,+ na Jehova zutere+ ya wee na-achọ ụzọ isi gbuo ya.+ 25  N’ikpeazụ, Zipora+ weere mma e ji nkume rụọ bepụ apị́ nwa ya wee mee ka o metụ n’ụkwụ ya wee sị: “Ọ bụ n’ihi na ị bụụrụ m nwoke ọbara nke na-alụ nwaanyị ọhụrụ.” 26  N’ihi ya, ọ hapụrụ ya. N’oge ahụ, Zipora sịrị: “Nwoke ọbara nke na-alụ nwaanyị ọhụrụ,” n’ihi úgwù ahụ o biri. 27  Jehova wee gwa Erọn, sị: “Gaa zute Mozis n’ala ịkpa.”+ O wee gaa zute ya n’ugwu nke ezi Chineke+ wee susuo ya ọnụ. 28  Mozis wee gwa Erọn ihe niile Jehova kwuru, bụ́ onye zitere ya,+ nakwa ihe ịrịba ama niile o nyere ya iwu ka o mee.+ 29  E mesịa, Mozis na Erọn gara kpọkọta ndị okenye niile nke ụmụ Izrel.+ 30  Erọn wee kwuo ihe niile Jehova gwara Mozis,+ o wee mee ihe ịrịba ama+ ndị ahụ n’ihu ha. 31  Ndị ahụ wee kwere.+ Mgbe ha nụrụ na Jehova echewo ihu+ n’ebe ụmụ Izrel nọ nakwa na ọ hụwo ahụ́ a na-emekpa ha,+ ha dara kpọọ isiala.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji