Ọpụpụ 38:1-31
38 O wee jiri osisi akeshịa rụọ ebe ịchụàjà nke àjà nsure ọkụ. O nwere akụkụ anọ há nhata, ọ dị kubit ise n’ogologo, kubit ise n’obosara nakwa kubit atọ n’ịdị elu.+
2 O wee rụnye mpi+ ya n’akụkụ anọ ya. Mpi ya si n’ahụ́ ya pụta. O wee werezie ọla kọpa machie ya.+
3 E mesịa, ọ rụrụ arịa niile nke ebe ịchụàjà ahụ, ite ya na shọvel ya na ọkwá ya, ndụdụ ya na ihe ịgụ ọkụ ya. O ji ọla kọpa rụọ arịa ya niile.+
4 O jikwa ọla kọpa kpaa ihe a ga-etinye n’ime ebe ịchụàjà ahụ, n’okpuru ọnụ ya, n’ebe etiti ya.+
5 O wee kpụọ ihe anọ yiri mgbaaka na nsọtụ anọ ya, n’akụkụ ihe ahụ e ji ọla kọpa kpaa, ka ọ bụrụ ihe ga na-ejide okporo osisi ya.
6 E mesịa, o ji osisi akeshịa rụọ okporo osisi ma were ọla kọpa machie ha.+
7 O wee tinye okporo osisi ndị ahụ n’ihe ndị ahụ yiri mgbaaka ndị dị n’akụkụ ebe ịchụàjà ahụ, ka e jiri ha na-ebu ya.+ Ọ rụrụ ya ka ọ dị ka igbe osisi nwere oghere.+
8 O wee jiri enyo ndị inyom na-eje ozi, bụ́ ndị jere ozi a haziri ahazi n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute ahụ,+ mee efere ọla kọpa,+ jirikwa ọla kọpa mee ihe ndọkwasị ya.
9 O wee gbaa ya ogige.+ N’akụkụ chere Negeb ihu, n’ebe ndịda, e ji ezigbo eri linin a kpara akpa kwee ákwà ngechi ogige ya, ọ dị otu narị kubit.+
10 E ji ọla kọpa rụọ ogidi iri abụọ ha na ntọala iri abụọ ha ndị nwere oghere. E ji ọlaọcha rụọ mkpọ́ ha na ihe njikọ ha.+
11 Ọzọ, akụkụ ebe ugwu ya dị otu narị kubit. E ji ọla kọpa rụọ ogidi iri abụọ ha na ntọala iri abụọ ha ndị nwere oghere. E ji ọlaọcha rụọ mkpọ́ ogidi ndị ahụ na ihe njikọ ha.+
12 Ma n’ebe ọdịda anyanwụ ya, ákwà ngechi ahụ dị kubit iri ise. Ogidi ha dị iri, ntọala ha ndị nwere oghere dịkwa iri.+ E ji ọlaọcha rụọ mkpọ́ ogidi ndị ahụ na ihe njikọ ha.
13 Ma akụkụ chere ebe ọwụwa anyanwụ ihu dị kubit iri ise.+
14 Ákwà ngechi ahụ dị kubit iri na ise n’otu mpaghara ya. Ogidi ha dị atọ, ntọala ha ndị nwere oghere dịkwa atọ.+
15 Ma ákwà ngechi nke dị ná mpaghara ya nke ọzọ, n’ọnụ ụzọ ogige ya, n’otu akụkụ nakwa n’akụkụ nke ọzọ, dị kubit iri na ise. Ogidi ha dị atọ, ntọala ha ndị nwere oghere dịkwa atọ.+
16 E ji ezigbo ákwà linin a kpara akpa dụọ ákwà ngechi niile nke ogige ya gbaa gburugburu.
17 E ji ọla kọpa rụọ ntọala ndị nwere oghere maka ogidi ndị ahụ. E ji ọlaọcha mee mkpọ́ ogidi ndị ahụ na ihe njikọ ha, e jikwa ọlaọcha machie elu ya, ogidi niile nke ogige ahụ nwere ihe njikọ ndị e ji ọlaọcha rụọ.+
18 Ọ bụ onye na-ekwe ákwà kwere ákwà mgbochi nke ọnụ ụzọ ogige ahụ, nke e ji eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo na eri na-acha uhie uhie na ezigbo eri linin a kpara akpa kwee,+ ọ dị kubit iri abụọ n’ogologo, ọ dịkwa kubit ise n’ịdị elu malite n’isi ruo ná ngwụsị, dị ka ákwà ngebichi ogige ahụ.+
19 E ji ọla kọpa mee ogidi anọ ha na ntọala ha ndị nwere oghere. E ji ọlaọcha mee mkpọ́ ha, jirikwa ọlaọcha machie isi ha na ihe njikọ ha.
20 E ji ọla kọpa mee mkpọ́ niile nke ụlọikwuu ahụ nakwa nke ogige ya gbaa gburugburu.+
21 Ihe ndị na-esonụ bụ ihe e ji rụọ ụlọikwuu ahụ, bụ́ ụlọikwuu Ihe Àmà,+ bụ́ ihe ndị Mozis nyere iwu ka a gụkọta, dị ka ọrụ ndị Livaị+ nke Ịtama+ nwa Erọn onye nchụàjà duziri.
22 Bezalel+ nwa Yuraị nwa Họọ nke ebo Juda wee mee ihe niile Jehova nyere Mozis n’iwu.
23 Oholiab+ nwa Ahisamak nke ebo Dan sokwa ya, bụ́ omenkà na onye na-akpa ihe n’ákwà na onye na-eji eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo na eri na-acha uhie uhie na ezigbo eri linin achọ ákwà mma.
24 Ọlaedo dum e ji rụọ ọrụ n’ọrụ niile a rụrụ n’ebe nsọ ahụ hà ka ọlaedo àjà ahụ a na-efegharị efegharị,+ ya bụ, talent iri abụọ na itoolu na narị shekel+ asaa na iri atọ ma e jiri shekel nke ebe nsọ tụọ ya.+
25 Ọlaọcha nke ndị e debara aha ha n’akwụkwọ ná nzukọ ahụ nyere dị otu narị talent na otu puku shekel na narị asaa na iri asaa na ise, ma e jiri shekel ebe nsọ tụọ ya.
26 Ọkara shekel nke otu onye nyere bụ ọkara shekel, ma e jiri shekel ebe nsọ tụọ ya, bụ́ nke nwoke ọ bụla n’ime ndị e debara aha ha n’akwụkwọ nyere, malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe,+ ha dị narị puku mmadụ isii na atọ na narị ise na iri ise.+
27 E ji otu narị talent ọlaọcha wụọ ntọala ndị nwere oghere nke ebe nsọ ahụ nakwa ntọala ndị nwere oghere nke ákwà mgbochi ahụ. E ji otu narị talent rụọ otu narị ntọala ndị nwere oghere, otu talent maka otu ntọala nwere oghere.+
28 O jikwa otu puku shekel na narị asaa na iri asaa na ise mee mkpọ́ maka ogidi ndị ahụ, machie elu ha ma jikọta ha ọnụ.
29 Ọla kọpa nke àjà a na-efegharị efegharị dị talent iri asaa na puku shekel abụọ na narị anọ.
30 O jikwa ya rụọ ntọala ndị nwere oghere nke ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute ahụ na ebe ịchụàjà ahụ e ji ọla kọpa rụọ na ihe ahụ e ji ọla kọpa kpaa nke a na-etinye n’ime ya, nakwa arịa niile nke ebe ịchụàjà ahụ,
31 nakwa ntọala ndị nwere oghere nke ogige ya gbaa gburugburu, na ntọala ndị nwere oghere nke ọnụ ụzọ ogige ahụ, na mkpọ́ niile nke ụlọikwuu ahụ nakwa mkpọ́+ niile nke ogige ya gbaa gburugburu.