Ọpụpụ 37:1-29
37 Bezalel+ wee jiri osisi akeshịa rụọ Igbe+ ahụ. Ọ dị kubit abụọ na ọkara n’ogologo, otu kubit na ọkara n’obosara nakwa otu kubit na ọkara n’ịdị elu.+
2 O wee jiri ọlaedo a na-agwaghị agwa machie ya ime na azụ, ma jiri ọlaedo kpụọ ihe ịchọ mma gburugburu ọnụ ya.+
3 E mesịa, o ji ọlaedo kpụọ ihe anọ yiri mgbaaka maka ya, bụ́ ndị ọ kpụrụ n’elu ụkwụ ya anọ, abụọ n’otu akụkụ ya, abụọ n’akụkụ ya nke ọzọ.+
4 Ọzọ, o ji osisi akeshịa rụọ okporo osisi ma were ọlaedo machie ha.+
5 O wee tinye okporo osisi ndị ahụ n’oghere ihe ahụ yiri mgbaaka ndị dị n’akụkụ Igbe ahụ, ka e jiri ha na-ebu Igbe ahụ.+
6 O wee jiri ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ ihe mkpuchi ya.+ Ọ dị kubit abụọ na ọkara n’ogologo nakwa otu kubit na ọkara n’obosara.+
7 O jikwa ọlaedo kpụọ cherọb abụọ. Ọ kpụnyere ha na nsọtụ abụọ nke ihe mkpuchi ahụ.+
8 Otu cherọb dị n’otu nsọtụ, cherọb nke ọzọ adịrịkwa na nsọtụ nke ọzọ. Ọ kpụrụ cherọb ndị ahụ n’ihe mkpuchi ahụ na nsọtụ ya abụọ.+
9 Ha wee bụrụ cherọb chịliri nku ha abụọ elu, nku ha sachikwara ihe mkpuchi ahụ,+ otu chekwara ibe ya ihu. Ihu cherọb ndị ahụ kpudoro n’ihe mkpuchi ahụ.+
10 O wee jiri osisi akeshịa rụọ tebụl.+ Ọ dị kubit abụọ n’ogologo, otu kubit n’obosara nakwa otu kubit na ọkara n’ịdị elu.+
11 O wee were ọlaedo a na-agwaghị agwa machie ya, jirikwa ọlaedo kpụọ ihe ịchọ mma gburugburu ọnụ ya.+
12 Ọzọ, ọ kpụrụ ihe há ka uhiè ọbụ aka mmadụ gburugburu ọnụ ya ma jiri ọlaedo kpụọ ihe ịchọ mma gburugburu ihe ahụ ọ kpụrụ n’ọnụ ya.+
13 O jikwa ọlaedo kpụọ ihe anọ yiri mgbaaka maka ya ma kpụnye ihe anọ ahụ yiri mgbaaka n’akụkụ anọ ya bụ́ ebe ụkwụ ya anọ dị.+
14 Ihe ndị ahụ yiri mgbaaka dị n’akụkụ ihe ahụ a kpụrụ n’ọnụ ya, ka ọ bụrụ ihe ga na-ejide okporo osisi ndị a ga-eji na-ebu tebụl ahụ.+
15 O wee jiri osisi akeshịa rụọ okporo osisi ndị ahụ ma were ọlaedo machie ha ka e jiri ha na-ebu tebụl ahụ.+
16 E mesịa, o ji ọlaedo a na-agwaghị agwa mee arịa ndị dị n’elu tebụl ahụ, efere ya na iko ya na ọkwá ya na ihe mmiri ya ndị a ga-eji na-awụsa àjà ihe ọṅụṅụ.+
17 O wee jiri ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ ihe ndọba oriọna.+ Ọ kpụrụ ihe ndọba oriọna ahụ akpụ. Akụkụ ya na alaka ya, iko ya, isi ya nakwa ifuru ya si n’ahụ́ ya pụta.+
18 Alaka isii si n’akụkụ ya abụọ pụta, alaka atọ nke ihe ndọba oriọna ahụ si n’otu akụkụ ya pụta, alaka atọ nke ihe ndọba oriọna ahụ sikwa n’akụkụ ya nke ọzọ pụta.+
19 Iko atọ ndị yiri okooko almọnd dị n’alaka nke ọ bụla dị n’otu mpaghara ya, otu isi na otu ifuru dị n’agbata otu iko na iko ibe ya; iko atọ ndị yiri okooko almọnd dịkwa n’alaka nke ọ bụla dị ná mpaghara ya nke ọzọ, otu isi na otu ifuru dị n’agbata otu iko na iko ibe ya. Otú ahụ ka alaka isii ndị si n’ihe ndọba oriọna ahụ pụta dị.+
20 E nwekwara iko anọ ndị yiri okooko almọnd n’ihe ndọba oriọna ahụ, otu isi na otu ifuru dị n’agbata otu iko na iko ibe ya.+
21 Otu isi nke dị n’okpuru alaka abụọ si na ya pụta, otu isi nke dị n’okpuru alaka abụọ nke ọzọ si na ya pụta, otu isi nke dị n’okpuru alaka abụọ ọzọ sikwa na ya pụta, bụ́ alaka isii ndị si n’ihe ndọba oriọna ahụ pụta.+
22 Isi ha na alaka ha si n’ahụ́ ya pụta. Ha dum bụ otu ihe nke e ji ọlaedo a na-agwaghị agwa kpụọ.+
23 O wee jiri ọlaedo a na-agwaghị agwa mee oriọna asaa ya nakwa ihe ịsọnyụ ọkụ ya nakwa ihe ịgụ ọkụ ya.+
24 O ji otu talent ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ ya na arịa ya niile.
25 O wee were osisi akeshịa+ rụọ ebe ịchụàjà nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ.+ O nwere akụkụ anọ há nhata, ọ dị otu kubit n’ogologo na otu kubit n’obosara nakwa otu kubit n’ịdị elu. Mpi ya sikwa n’ahụ́ ya pụta.+
26 O wee jiri ọlaedo a na-agwaghị agwa machie ya, ma elu ya ma akụkụ ya gbaa gburugburu, tinyere mpi ya, o jikwa ọlaedo kpụọ ihe ịchọ mma gburugburu n’ọnụ ya.+
27 O wee jiri ọlaedo kpụọ ihe abụọ yiri mgbaaka n’okpuru ihe ahụ a kpụrụ n’ọnụ ya n’akụkụ ya abụọ, n’akụkụ ya abụọ chere ibe ha ihu, ka ha bụrụ ihe ga na-ejide okporo osisi ndị a ga-eji na-ebu ya.+
28 E mesịa, o ji osisi akeshịa rụọ okporo osisi ndị ahụ ma jiri ọlaedo machie ha.+
29 O mekwara mmanụ dị nsọ e ji ete mmadụ mmanụ+ na ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nke a na-agwaghị ihe ọ bụla,+ dị ka nke onye na-eme mmanụ otite mere.