Ọpụpụ 36:1-38

36  “Bezalel ga-arụ ọrụ, tinyere Oholiab+ na nwoke ọ bụla nwere obi amamihe, bụ́ onye Jehova nyere amamihe+ na nghọta+ n’ihe ndị a ka o wee mara otú ọ ga-esi rụọ ọrụ niile metụtara ozi dị nsọ dị ka ihe niile Jehova nyere n’iwu si dị.”+  Mozis wee kpọọ Bezalel na Oholiab na nwoke ọ bụla nwere obi amamihe, bụ́ onye Jehova tinyere amamihe+ n’obi ya, onye ọ bụla obi ya kpaliri, ka ọ bịa rụọ ọrụ ahụ.+  Ha wee si n’ihu Mozis buru onyinye+ niile ụmụ Izrel wetara maka ịrụ ọrụ metụtara ozi dị nsọ, ma ndị Izrel ka nọ na-ewetara ya onyinye afọ ofufo kwa ụtụtụ.  Ndị niile maara ihe, bụ́ ndị nọ na-arụ ọrụ niile ahụ dị nsọ, hapụrụ ọrụ ha nọ na-arụ wee malite ịbịa n’otu n’otu,  wee sị Mozis: “Ndị Izrel na-eweta ihe nke ukwuu karịa ihe a chọrọ maka ọrụ ahụ Jehova nyere iwu ka a rụọ.”  Ya mere, Mozis nyere iwu ka a maa ọkwa n’ebe ha mara ụlọikwuu, sị: “Ndị ikom na ndị inyom, unu emepụtazila ihe maka onyinye ahụ dị nsọ.” N’ihi ya, a kwụsịrị ndị Izrel iwebata ya.  Ihe e wetara wee zuo maka ọrụ niile a gaje ịrụ, o zuru ọbụna gafee.  Ndị ikom niile nwere obi amamihe+ n’ime ndị na-arụ ọrụ ahụ wee rụọ ụlọikwuu ahụ,+ kweekwa ákwà ụlọikwuu iri ndị e ji ezigbo eri linin a kpara akpa na eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo na eri na-acha uhie uhie kwee; ọ kpara cherọb na ha, dị ka nke onye na-akpa ihe n’ákwà kpara.  Ákwà ụlọikwuu nke ọ bụla dị kubit iri abụọ na asatọ n’ogologo, ákwà ụlọikwuu nke ọ bụla dịkwa kubit anọ n’obosara. Ákwà ụlọikwuu ahụ niile hà nhata. 10  O wee dụkọta ákwà ụlọikwuu ise ọnụ,+ ọ dụkọtakwara ákwà ụlọikwuu ise nke ọzọ ọnụ. 11  E mesịa, o ji eri na-acha anụnụ anụnụ dụnye anya nko n’ọnụ ọnụ otu ákwà ụlọikwuu n’ebe a ga-ejikọta ya na ákwà ụlọikwuu nke ọzọ. O mere otu ihe ahụ n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu nke dị ná mpụta mpụta n’ebe a ga-ejikọta ya na nke ọzọ.+ 12  Ọ dụnyere anya nko iri ise n’otu ákwà ụlọikwuu, ọ dụnyekwara anya nko iri ise n’isi isi ákwà ụlọikwuu nke dị n’ebe a ga-ejikọ ya na ákwà ụlọikwuu nke ọzọ, anya nko ndị ahụ chere ibe ha ihu.+ 13  N’ikpeazụ, o ji ọlaedo rụọ nko iri ise ma jiri nko ndị ahụ jikọta ákwà ụlọikwuu ndị ahụ, o wee ghọọ otu ụlọikwuu.+ 14  O wee jiri ajị ewu mee ákwà ụlọikwuu ka ọ bụrụ ákwà a ga-eji kpuchie ụlọikwuu ahụ. Ákwà ụlọikwuu iri na otu ka ọ kpara.+ 15  Ákwà ụlọikwuu nke ọ bụla dị kubit iri atọ n’ogologo, ákwà ụlọikwuu nke ọ bụla dịkwa kubit anọ n’obosara. Ákwà ụlọikwuu iri na otu ahụ hà nhata.+ 16  O wee dụkọta ákwà ụlọikwuu ise ọnụ, dụkọtakwa ákwà ụlọikwuu isii nke ọzọ.+ 17  E mesịa, ọ dụnyere anya nko iri ise n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu nke dị ná mpụta mpụta n’ebe a ga-ejikọta ya na ákwà ụlọikwuu nke ọzọ, ọ dụnyekwara anya nko iri ise n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu nke ọzọ a ga-ejikọta ya na ya.+ 18  E mesịa, o ji ọla kọpa mee nko iri ise maka ijikọta ákwà ụlọikwuu ndị ahụ ka ha bụrụ otu.+ 19  O wee jiri akpụkpọ ebule nke e sijiri ọbara ọbara mee ihe mkpuchi ụlọikwuu ahụ, jirikwa akpụkpọ anụ sil+ mee ihe mkpuchi ga-adị n’elu ya.+ 20  O wee jiri osisi akeshịa+ rụọ awara osisi, ndị a ga-akwụwa ọtọ, maka ụlọikwuu ahụ. 21  Otu awara osisi dị kubit iri n’ogologo, awara osisi nke ọ bụla dịkwa otu kubit na ọkara n’obosara.+ 22  Awara osisi nke ọ bụla nwere ihe nkwụnye abụọ e jikọtara ejikọta. Otú ahụ ka o mere awara osisi niile nke ụlọikwuu ahụ.+ 23  O wee rụọ awara osisi maka ụlọikwuu ahụ, awara osisi iri abụọ maka akụkụ chere Negeb ihu, n’ebe ndịda.+ 24  O wee jiri ọlaọcha rụọ ntọala iri anọ nwere oghere ndị a ga-akwụnye awara osisi iri abụọ ahụ, a ga-akwụnye ihe nkwụnye abụọ dị n’otu awara osisi na ntọala abụọ nwere oghere, kwụnyekwa ihe nkwụnye abụọ dị n’awara osisi nke ọzọ na ntọala abụọ nwere oghere.+ 25  Ma n’akụkụ nke ọzọ nke ụlọikwuu ahụ, n’ebe ugwu, ọ rụrụ awara osisi iri abụọ+ 26  na ntọala iri anọ ha e ji ọlaọcha rụọ ndị nwere oghere, a ga-akwụnye otu awara osisi na ntọala abụọ nwere oghere, kwụnyekwa awara osisi nke ọzọ na ntọala abụọ nwere oghere.+ 27  Ma ọ rụrụ awara osisi isii maka ebe azụ ụlọikwuu ahụ nke ga-eche ihu n’ebe ọdịda anyanwụ.+ 28  O wee rụọ awara osisi abụọ ka ha bụrụ ogidi isi nkuku nke ụlọikwuu ahụ n’isi ngwụcha ya abụọ.+ 29  Ha gbara mkpị n’ala ala ha, nke ọ bụla n’ime ha gbakwara mkpị ruo n’elu, n’ebe ihe yiri mgbaaka nke mbụ dị. Otú ahụ ka o mere ha abụọ, ya bụ, ogidi isi nkuku abụọ ahụ.+ 30  Ha wee dịrị awara osisi asatọ, ntọala ha e ji ọlaọcha rụọ, ndị nwere oghere, dịkwa iri na isii, a kwụnyere awara osisi nke ọ bụla na ntọala abụọ nwere oghere n’akụkụ ntọala abụọ ọzọ nwere oghere.+ 31  O wee jiri osisi akeshịa rụọ osisi ntụhie, osisi ntụhie ise maka awara osisi ndị ahụ dị n’otu akụkụ ụlọikwuu ahụ+ 32  nakwa osisi ntụhie ise maka awara osisi dị n’akụkụ nke ọzọ nke ụlọikwuu ahụ nakwa osisi ntụhie ise maka awara osisi ụlọikwuu ahụ maka ebe azụ ya nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ.+ 33  O wee mee ka osisi ntụhie nke dị n’etiti awara osisi ndị ahụ malite n’etiti n’otu nsọtụ ruo na nsọtụ nke ọzọ.+ 34  O wee jiri ọlaedo machie awara osisi ndị ahụ, o jikwa ọlaedo rụọ ihe yiri mgbaaka maka ha ka ha bụrụ ihe ga na-ejide osisi ntụhie ndị ahụ, o wee jiri ọlaedo machie ihe ntụhie ndị ahụ.+ 35  O wee jiri eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo na eri na-acha uhie uhie na ezigbo eri linin a kpara akpa mee ákwà mgbochi.+ Ọ kpara cherọb na ya, dị ka nke onye na-akpa ihe n’ákwà kpara.+ 36  O wee jiri osisi akeshịa rụọ ogidi anọ maka ya ma were ọlaedo machie ha, e jikwa ọlaedo rụọ mkpọ́ ha, o wee jiri ọlaọcha wụọ ntọala nwere oghere ndị a ga-egwunye ha.+ 37  O wee jiri eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo na eri na-acha uhie uhie na ezigbo eri linin a kpara akpa, mee ákwà ngebichi, nke onye na-ekwe ákwà kwere, maka ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ,+ 38  ọ rụkwara ogidi ise ya na mkpọ́ ha. O wee jiri ọlaedo machie elu ha nakwa ihe njikọ ha, ma, ọ bụ ọla kọpa ka e ji rụọ ntọala ha ndị nwere oghere.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji