Ọpụpụ 34:1-35
34 Jehova wee gwa Mozis, sị: “Wapụtara onwe gị mbadamba nkume abụọ dị ka ndị nke mbụ ahụ,+ m ga-edekwa n’elu mbadamba nkume ndị ahụ okwu ndị dị ná mbadamba nkume ndị mbụ ahụ,+ ndị ị kụriri.+
2 Jikere maka ụtụtụ, n’ihi na ị ga-arịgo n’Ugwu Saịnaị n’ụtụtụ wee guzo n’akụkụ m n’ebe ahụ, n’elu ugwu ahụ.+
3 Ma ọ dịghị onye ga-eso gị rịgoo, ka a gharakwa ịhụ onye ọ bụla ọzọ n’ugwu ahụ dum.+ Ọ dịghịkwa ìgwè atụrụ ma ọ bụ ìgwè ehi ga na-ata ahịhịa n’ihu ugwu ahụ.”+
4 Mozis wee wapụta mbadamba nkume abụọ ndị dị ka ndị mbụ ahụ ma bilie n’isi ụtụtụ rịgoo n’Ugwu Saịnaị, dị nnọọ ka Jehova nyere ya n’iwu, o bukwa mbadamba nkume abụọ ahụ n’aka.
5 Jehova wee gbadata+ n’ígwé ojii ahụ wee soro ya guzoro n’ebe ahụ ma kpọsaa aha Jehova.+
6 Jehova wee gafee n’ihu ya, kpọsaa, sị: “Jehova, Jehova, Chineke nke na-eme ebere,+ na-emekwa amara,+ onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ,+ onye obiọma*+ ya na eziokwu ya dị ukwuu,+
7 onye na-eme ka obiọma ya ruoro ọtụtụ puku ọgbọ,+ na-agbaghara njehie na mmebi iwu na mmehie,+ ma ọ gaghị anwa anwa hapụ inye ntaramahụhụ,+ ọ na-enye ndị bụ́ ụmụ ntaramahụhụ maka njehie nna ha, na-enyekwa ụmụ ụmụ ha, na-enyekwa ọgbọ nke atọ na ọgbọ nke anọ.”+
8 Ozugbo ahụ, Mozis mere ọsọ ọsọ hulata wee kpọọ isiala.+
9 O wee sị: “Biko, Jehova, ọ bụrụ na ihe m masịrị gị, ka Jehova soro gaa n’etiti anyị,+ n’ihi na ha bụ ndị na-ekwesi olu ike,+ ị ga-agbagharakwa njehie anyị na mmehie anyị,+ ị ga-ewere anyị dị ka ihe nketa gị.+
10 O wee sị: “Lee, mụ na unu na-agba ndụ: N’ihu ndị gị niile ka m ga-arụ ihe ndị dị ebube a na-arụtụbeghị n’elu ụwa dum ma ọ bụ n’etiti mba niile;+ ndị niile ị nọ n’etiti ha ga-ahụ ọrụ Jehova, n’ihi na ọ bụ ihe dị egwu ka m ga-eme n’ebe ị nọ.+
11 “Ma gị onwe gị, debe ihe m na-enye gị n’iwu taa.+ Lee, m na-achụpụ ndị Amọraịt na ndị Kenan na ndị Het na ndị Perizaịt na ndị Haịvaịt na ndị Jibọs n’ihu gị.+
12 Lezie anya ka gị na ndị bi n’ala ahụ ị na-aga ghara ịgba ndụ,+ ka ọ ghara ịbụrụ gị ọnyà n’etiti unu.+
13 Ma unu ga-akwatu ebe ịchụàjà ha, unu ga-akụrikwa ogidi nsọ ha, unu ga-egbutusị ogwe osisi ha dị nsọ.+
14 N’ihi na ị gaghị akpọrọ chi ọzọ isiala,+ n’ihi na Jehova, onye aha ya bụ Ekworo, ya onwe ya bụ Chineke ekworo;+
15 ka gị na ndị bi n’ala ahụ wee ghara ịgba ndụ, n’ihi na ha na chi ha ga na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ,+ ha ga na-achụkwara chi ha àjà,+ mmadụ ga-akpọkwa gị, i wee rie ihe ha chụrụ n’àjà.+
16 Mgbe ahụ, ị ga-alụtara ụmụ gị ndị ikom ụmụ ha ndị inyom,+ ụmụ ha ndị inyom na chi ha ga-enwe mmekọahụ rụrụ arụ, ha ga-emekwa ka ụmụ gị ndị ikom na chi ha nwee mmekọahụ rụrụ arụ.+
17 “Emerela onwe gị chi arụsị a wụrụ awụ.+
18 “Ị ga na-eme ememme achịcha na-ekoghị eko.+ Dị nnọọ ka m nyere gị n’iwu, ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko ụbọchị asaa n’oge a kara aka n’ọnwa Ebib,+ n’ihi na ọ bụ n’ọnwa Ebib ka ị pụtara n’Ijipt.
19 “Ihe ọ bụla meghere akpa nwa bụ nke m,+ n’anụ ụlọ gị niile, nwa mbụ ehi mụrụ na nke atụrụ mụrụ bụkwa nke m.+
20 Ị ga-eji atụrụ gbara nwa mbụ ịnyịnya ibu mụrụ.+ Ma ọ bụrụ na ị gaghị agbara ya, ị ga-agbaji ya olu. Ị ga-agbara nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’ime ụmụ gị ndị ikom.+ Ọ dịghị onye ga-agba aka bịa n’ihu m.+
21 “Ị ga-arụ ọrụ ụbọchị isii, ma n’ụbọchị nke asaa, ị ga-edebe ụbọchị izu ike.+ Ị ga-edebe ụbọchị izu ike n’oge ịkọ ihe nakwa n’oge owuwe ihe ubi.+
22 “Ọka mbụ kara aka a ghọtara n’ubi ọka wit ka ị ga-eji na-eme ememme izu,+ nakwa ememme ịchịkọbata ihe ná ngwụsị afọ.+
23 “Ugboro atọ n’afọ ka onye ọ bụla bụ́ nwoke n’ime unu ga-abịa+ n’ihu ezi Onyenwe anyị, Jehova, bụ́ Chineke Izrel.
24 N’ihi na m ga-achụpụ mba dị iche iche n’ihu gị,+ m ga-emekwa ka ókèala gị saa mbara;+ ọ dịghịkwa onye ọ ga-agụ agụụ iwere ala gị mgbe ị na-agbago ịhụ ihu Jehova bụ́ Chineke gị ugboro atọ n’afọ.+
25 “Ejila ihe e tinyere ihe na-eko achịcha achụ ọbara a ga-achụrụ m n’àjà.+ Anụ àjà ememme ngabiga ekwesịghịkwa ịdị chi abọọ.+
26 “Mkpụrụ kasị mma n’ime mkpụrụ mbụ kara aka+ nke ala gị ka ị ga-eweta n’ụlọ Jehova bụ́ Chineke gị.+
“Esila nwa ewu n’ime mmiri ara nne ya.”+
27 Jehova wee gaa n’ihu ịsị Mozis: “Deere onwe gị okwu ndị a,+ n’ihi na ọ bụ dị ka okwu ndị a si dị ka mụ na gị na Izrel na-agba ndụ.”+
28 Ya na Jehova wee nọgide n’ebe ahụ ruo ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị. O righị nri ọ bụla, ọ ṅụghịkwa mmiri ọ bụla.+ O wee dee okwu ọgbụgba ndụ ahụ, bụ́ Okwu Iri ahụ, n’elu mbadamba nkume ndị ahụ.+
29 O wee ruo mgbe Mozis gbadatara n’Ugwu Saịnaị na Mozis bu mbadamba nkume abụọ nke Ihe Àmà ahụ mgbe o si n’ugwu ahụ gbadata,+ ma Mozis amaghị na ihu ya na-enwupụta ìhè n’ihi na ya na ya kwurịtara okwu.+
30 Mgbe Erọn na ụmụ Izrel niile hụrụ Mozis, lee! ihu ya na-enwupụta ìhè, ha wee tụwa egwu ịbịarute ya nso.+
31 Mozis wee kpọọ ha. Erọn na ndị isi niile nke nzukọ ahụ bịakwuteghachiri ya, Mozis wee malite ịgwa ha okwu.
32 Mgbe e mesịrị, ụmụ Izrel bịara ya nso, o wee malite inye ha iwu niile Jehova nyere ya n’Ugwu Saịnaị.+
33 Mgbe ọ bụla Mozis gwasịrị ha okwu, ọ na-eji ákwà kpuchie ihu ya.+
34 Ma mgbe ọ bụla Mozis gara n’ihu Jehova ka ya na ya kwurịta okwu, ọ na-ewepụ ákwà ahụ ruo mgbe ọ pụtara.+ Ọ na-apụta wee gwa ụmụ Izrel ihe e nyere ya n’iwu.+
35 Ụmụ Izrel wee hụ ihu Mozis, na ihu Mozis na-enwupụta ìhè;+ Mozis wee were ákwà ahụ kpuchighachi ihu ya ruo mgbe ọ gara ka ya na ya kwurịta okwu.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”