Ọpụpụ 33:1-23
33 Jehova gwara Mozis ọzọ, sị: “Gawa, si n’ebe a gbagoo, gị na ndị ahụ i dupụtara n’ala Ijipt,+ gaanụ n’ala ahụ m ṅụụrụ Ebreham, Aịzik na Jekọb iyi, sị, ‘Ọ bụ mkpụrụ gị ka m ga-enye ya.’+
2 M ga-ezipụkwa mmụọ ozi ka o butere gị ụzọ+ wee chụpụ ndị Kenan, ndị Amọraịt, na ndị Het na ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt na ndị Jibọs;+
3 gaanụ n’ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,+ n’ihi na agaghị m eso unu agbago, n’ihi na unu bụ ndị na-ekwesi olu ike,+ ka m wee ghara ikpochapụ unu n’ụzọ.”+
4 Mgbe ndị Izrel nụrụ ozi ọjọọ a, ha malitere iru uju;+ ọ dịghịkwa onye ọ bụla n’ime ha yi ihe ịchọ mma ya.
5 Jehova wee sị Mozis: “Gwa ụmụ Izrel, sị, ‘Unu bụ ndị na-ekwesi olu ike.+ M pụrụ ịgbagote n’etiti unu n’otu ntabi anya+ wee kpochapụ unu. Ya mere, yipụnụ ihe ịchọ mma unu, n’ihi na m chọrọ ịmara ihe m ga-eme unu.’”+
6 Ụmụ Izrel wee yipụsịa ihe ịchọ mma ha malite n’Ugwu Horeb+ gaa n’ihu.
7 Ma Mozis fopụrụ ụlọikwuu ya wee maa ya ná mpụga ebe ha mara ụlọikwuu, n’ebe dị anya n’ebe ha mara ụlọikwuu; o wee kpọọ ya ụlọikwuu nzute. O wee ruo na onye ọ bụla nke chọrọ ịjụ Jehova ase+ na-aga n’ụlọikwuu nzute, nke dị ná mpụga ebe ha mara ụlọikwuu.
8 O wee ruo na ozugbo Mozis pụrụ gaa n’ụlọikwuu ahụ, mmadụ niile na-ebili,+ onye ọ bụla na-eguzokwa n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ya, ha na-elegide Mozis anya ruo mgbe ọ banyere n’ụlọikwuu ahụ.
9 Ọ na-erukwa na ozugbo Mozis banyere n’ụlọikwuu ahụ, ogidi ígwé ojii+ na-agbadata wee guzo n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ, Chineke na Mozis ewee kwurịta okwu.+
10 Mmadụ niile hụrụ ka ogidi ígwé ojii+ ahụ guzo n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ, ha niile wee bilie kpọọ isiala, onye nke ọ bụla n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ya.+
11 Jehova wee gwa Mozis okwu ihu na ihu,+ dị nnọọ ka mmadụ si agwa mmadụ ibe ya okwu. Mgbe ọ laghachiri n’ebe ha mara ụlọikwuu, onye ozi ya+ bụ́ Jọshụa, nwa Nọn,+ dị ka onye na-eje ozi, adịghị esi n’ime ụlọikwuu ahụ apụ.
12 Mozis wee sị Jehova: “Lee, ị na-asị m, ‘Duru ndị a gbagoo,’ ma gị onwe gị emebeghị ka m mara onye ị ga-edunye mụ na ya. Gị onwe gị asịwokwa, ‘Ama m gị n’aha,+ ihe gị masịkwara m.’
13 Ugbu a, biko, ọ bụrụ na ihe m masịrị gị,+ biko, mee ka m mara ụzọ gị,+ ka m wee mara gị, ka ihe m wee masị gị. Chetakwa na mba a bụ ndị gị.”+
14 N’ihi ya ọ sịrị: “Mụ onwe m ga-eso gị gaa,+ m ga-emekwa ka i zuru ike.”+
15 Mozis wee sị ya: “Ọ bụrụ na gị onwe gị agaghị eso anyị gaa, edurula anyị pụọ n’ebe a.
16 Gịnịzi ka a ga-eji amara na ihe mụ na ndị gị masịrị gị? Ọ́ bụghị ma gị onwe gị soro anyị,+ n’ihi na e mewo ka mụ na ndị gị dị iche n’ebe ndị niile ọzọ nọ bụ́ ndị nọ n’elu ala?”+
17 Jehova wee gaa n’ihu ịsị Mozis: “M ga-emekwa ihe a i kwuru okwu ya,+ n’ihi na ihe gị masịrị m, amakwaara m gị n’aha.”
18 O wee sị: “Biko, mee ka m hụ ebube gị.”+
19 Ma ọ sịrị: “Mụ onwe m ga-eme ka ịdị mma m dum gabiga n’ihu gị,+ m ga-akpọsakwa aha Jehova n’ihu gị;+ onye m chọrọ imere amara ka m ga-emere amara, onye m chọkwara imere ebere ka m ga-emere ebere.”+
20 Ọ sịkwara: “I nweghị ike ịhụ ihu m, n’ihi na ọ dịghị mmadụ ga-ahụ ihu m ma dị ndụ.”+
21 Jehova kwukwara, sị: “Lee ebe a, n’akụkụ m, ị ga-eguzokwa n’elu oké nkume a.
22 Ọ ga-erukwa na mgbe ebube m na-agafe, m ga-eme ka ị banye n’otu ọgba dị n’oké nkume a, m ga-ejikwa ọbụ aka m kpuchie gị ruo mgbe m gafeworo.
23 E mesịa, m ga-ewepụ ọbụ aka m, ị ga-ahụkwa azụ m n’ezie. Ma ị gaghị ahụ ihu m.”+