Ọpụpụ 32:1-35

32  Ma ụmụ Izrel hụrụ na Mozis na-egbu oge nke ukwuu ịrịdata n’ugwu ahụ.+ Ha wee gbakọọ n’ebe Erọn nọ wee sị ya: “Bilie, meere anyị chi nke ga na-ebutere anyị ụzọ,+ n’ihi na Mozis a, bụ́ onye dupụtara anyị n’ala Ijipt,+ anyị amaghị ihe mere ya.”  Erọn wee sị ha: “Gbapụtanụ ọla ntị ọlaedo+ ndị nwunye unu gba, tinyere nke ụmụ unu ndị ikom na nke ụmụ unu ndị inyom, wetakwaranụ m ha.”  Mmadụ niile wee malite ịgbapụta ọla ntị ọlaedo ndị ha gba ma na-ewetara ha Erọn.  O wee chịrị ọlaedo ahụ ha chịtara ma jiri ihe e ji akpụ ihe kpụọ ya+ wee mee ka ọ ghọọ ihe oyiyi nwa ehi a wụrụ awụ.+ Ha wee malite ịsị: “Izrel, ihe a bụ Chi gị, nke dupụtara gị n’ala Ijipt.”+  Mgbe Erọn hụrụ nke a, o wuru ebe ịchụàjà n’ihu ya. N’ikpeazụ, Erọn tiri mkpu, sị: “E nwere ememme a ga-emere Jehova echi.”  N’echi ya, ha biliri n’isi ụtụtụ, ha wee malite ịchụ àjà nsure ọkụ na àjà udo. E mesịa, ndị Izrel nọdụrụ ala iri ihe oriri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ. Ha wee bilie ikpori ndụ.+  Jehova wee sị Mozis: “Gbadaa, n’ihi na ndị gị, bụ́ ndị i dupụtara n’ala Ijipt, emewo omume na-eweta mbibi.+  Ha emewo ngwa ngwa hapụ ụzọ m nyere ha n’iwu ka ha na-agbaso.+ Ha emeworo onwe ha ihe oyiyi nwa ehi a wụrụ awụ, na-akpọkwara ya isiala ma na-achụrụ ya àjà, na-asị, ‘Izrel, lee Chineke gị, onye dupụtara gị n’ala Ijipt.’”+  Jehova wee gaa n’ihu ịsị Mozis: “Ahụwo m ndị a, lee, ha bụ ndị na-ekwesi olu ike.+ 10  Ya mere hapụ m, ka m weso ha iwe dị ọkụ wee kpochapụ ha,+ ka m meekwa ka ị ghọọ mba dị ukwuu.”+ 11  Mozis wee mee ka obi Jehova bụ́ Chineke+ ya jụrụ wee kwuo, sị: “Jehova, gịnị mere i ji na-eweso ndị gị, bụ́ ndị i ji ike dị ukwuu na aka dị ike kpọpụta n’ala Ijipt, iwe+ dị ọkụ? 12  Gịnị mere ndị Ijipt+ ga-eji asị, ‘O bu ihe ọjọọ n’obi kpọpụta ha ka o wee gbuo ha n’ugwu ma kpochapụ ha n’elu ala’?+ Ka iwe gị dị ọkụ dajụọ, gbanweekwa obi+ gị n’ihe ọjọọ a nke ị ga-eme ka ọ bịakwasị ndị gị. 13  Cheta Ebreham, Aịzik na Izrel bụ́ ndị ohu gị,+ bụ́ ndị i ji onwe gị ṅụọrọ iyi, n’ihi na ị sịrị ha, ‘M ga-eme ka mkpụrụ unu mụbaa dị ka kpakpando nke eluigwe,+ m ga-enyekwa mkpụrụ unu ala a dum m gosiri unu,+ ka ha wee bichie ya ruo mgbe a na-akaghị aka.’”+ 14  Jehova wee malite ịgbanwe obi ya banyere ihe ọjọọ o kwuru na ọ ga-eme ndị ya.+ 15  E mesịa, Mozis tụgharịrị si n’ugwu ahụ gbadata,+ o bukwa mbadamba nkume abụọ nke Ihe Àmà ahụ,+ bụ́ mbadamba nkume ndị e dere ihe ihu na azụ. E dere ha ihe ihu na azụ. 16  Ọ bụ Chineke rụrụ mbadamba nkume ndị ahụ, ihe e dere na ha bụ ihe odide nke Chineke, nke a kanyere ná mbadamba nkume ndị ahụ.+ 17  Jọshụa wee malite ịnụ mkpọtụ ndị Izrel na-eme n’ihi mkpu ha na-eti, o wee sị Mozis: “Mkpu agha+ na-ada n’ebe anyị mara ụlọikwuu.” 18  Ma ọ sịrị:“Ọ bụghị olu abụ nke ndị kpara ike dị ukwuu,+Ọ bụghịkwa olu abụ nke ndị e meriri emeri;Ọ bụ olu ụdị abụ ọzọ ka m na-anụ.” 19  O wee ruo na ngwa ngwa Mozis rutere nso n’ebe ahụ ha mara ụlọikwuu wee hụ nwa ehi+ ahụ na egwú a na-agba, iwe ya malitere ịdị ọkụ, ozugbo ahụ, ọ tụpụrụ mbadamba nkume ndị ahụ n’aka ya wee kụrie ha n’ala ala ugwu ahụ.+ 20  O wee buru nwa ehi ahụ ha mere, kpọọ ya ọkụ ma gwerie ya ruo mgbe ọ dị ka ntụ,+ e mesịa, o fesasịrị ya n’elu mmiri+ wee mee ka ụmụ Izrel ṅụọ ya.+ 21  E mesịa, Mozis gwara Erọn, sị: “Gịnị ka ndị a mere gị mere i ji butere ha oké mmehie?” 22  Erọn wee sị: “Ka iwe onyenwe m ghara ịdị ọkụ. Gị onwe gị maara ndị a nke ọma, na echiche ha jọrọ njọ.+ 23  Ha sịrị m, ‘Meere anyị chi nke ga na-ebutere anyị ụzọ,+ n’ihi na Mozis a, bụ́ onye dupụtara anyị n’ala Ijipt, anyị amaghị ihe mere ya.’ 24  N’ihi ya, m gwara ha, sị, ‘Olee ndị nwere ọlaedo? Ha gbapụta ya ma nye m ya.’ M wee tụba ya n’ọkụ, nwa ehi a wee pụta.” 25  Mozis wee hụ na ndị Izrel ekweghị nchịkwa, n’ihi na Erọn hapụrụ ha ka ha ghara ikwe nchịkwa+ ka ha wee bụrụ ihe ihere n’etiti ndị na-emegide ha.+ 26  Mozis wee guzo n’ọnụ ụzọ ámá ebe ha mara ụlọikwuu, sị: “Ònye dịnyeere Jehova? Ya bịakwute m!”+ Ụmụ Livaị niile wee malite izukọta n’ebe ọ nọ. 27  O wee sị ha: “Nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, ‘Ka onye ọ bụla n’ime unu kee mma agha ya n’apata ụkwụ ya. Gagharịanụ site n’otu ọnụ ụzọ ámá ruo n’ọnụ ụzọ ámá ọzọ n’ebe unu mara ụlọikwuu, ka onye ọ bụla n’ime unu gbuo nwanne ya na enyi ya na onye ya na ya dị ná mma.’”+ 28  Ụmụ Livaị+ wee mee dị ka Mozis kwuru, nke mere na ndị Izrel nwụrụ n’ụbọchị ahụ dị ihe dị ka puku mmadụ atọ. 29  Mozis wee sị: “Meenụ ka aka unu dị ike taa maka Jehova,+ n’ihi na onye ọ bụla n’ime unu emegidewo nwa ya nakwa nwanne ya,+ ka o wee gọzie unu taa.”+ 30  O wee ruo n’echi ya na Mozis gwara ndị Izrel, sị: “Unu onwe unu emewo oké mmehie,+ ugbu a m ga-agbago gakwuru Jehova. Ikekwe, m ga-ekpuchi mmehie unu.”+ 31  Mozis wee laghachikwuru Jehova wee sị: “Ewoo, ndị a emewo oké mmehie, n’ihi na ha meere onwe ha chi ọlaedo!+ 32  Ma ugbu a, ọ bụrụ na ị ga-agbaghara mmehie ha,+—ma ọ́ bụghị otú ahụ, biko, hichapụ aha+ m n’akwụkwọ+ gị nke i dere.” 33  Otú ọ dị, Jehova sịrị Mozis: “Ọ bụ onye ọ bụla mehiere m ka m ga-ehichapụ aha ya n’akwụkwọ m.+ 34  Bịa duru ndị Izrel gawa n’ebe m gwara gị okwu banyere ya. Lee! Mmụọ ozi m ga-ebutere gị ụzọ,+ ọ bụkwa n’ụbọchị m ga-enye ntaramahụhụ ka m ga-enye ha ntaramahụhụ maka mmehie ha.”+ 35  Jehova wee malite iti ndị Izrel ihe otiti n’ihi na ha mere nwa ehi ahụ, nke Erọn mere.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji