Ọpụpụ 31:1-18
31 Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị:
2 “Lee, akpọwo m Bezalel+ nwa Yuraị nwa Họọ nke ebo Juda aha.+
3 M ga-eme ka mmụọ Chineke jupụta n’ime ya ka o wee nwee amamihe na nghọta na ihe ọmụma na nkà ịrụ ụdị ọrụ ọ bụla,+
4 ịtụ ụkpụrụ ọrụ, iji ọlaedo na ọlaọcha na ọla kọpa na-arụ ọrụ,+
5 nakwa n’ọrụ ịkwụnye nkume n’ihe+ nakwa n’ọrụ iji osisi arụpụta ụdị ihe ọ bụla.+
6 Ma mụ onwe m, lee! m ga-akpọnye ya Oholiab nwa Ahisamak nke ebo Dan+ ka o nyere ya aka, m ga-etinyekwa amamihe n’obi onye ọ bụla maara ihe, ka ha wee rụọ ihe niile m nyere gị n’iwu:+
7 ụlọikwuu nzute+ na Igbe+ nke ihe àmà ahụ nakwa ihe mkpuchi ga-adị n’elu ya,+ na arịa niile nke ụlọikwuu ahụ,
8 na tebụl ahụ na arịa ya,+ na ihe ndọba oriọna ahụ e ji ọlaedo a na-agwaghị agwa mee na arịa ya niile,+ na ebe ịchụàjà nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ,+
9 na ebe ịchụàjà nke àjà nsure ọkụ na arịa ya niile,+ na efere ya na ihe ndọkwasị ya,+
10 na uwe ndị a kpara nke ọma na uwe nsọ nke Erọn onye nchụàjà na ụmụ ya ndị ikom ga-eyi na-arụ ọrụ dị ka ndị nchụàjà;+
11 na mmanụ e ji ete mmadụ mmanụ nakwa ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ ndị ga-adị n’ebe nsọ ahụ.+ Ha ga-eme ihe niile m nyere gị n’iwu.”
12 Jehova gwakwuru Mozis, sị:
13 “Ma gị onwe gị, gwa ụmụ Izrel, sị, ‘Unu ga-edebe ụbọchị izu ike m karịsịa,+ n’ihi na ọ bụ ihe ịrịba ama n’etiti mụ na unu n’ọgbọ niile unu ka unu wee mara na mụ onwe m bụ Jehova onye na-edo unu nsọ.+
14 Unu ga na-edebe ụbọchị izu ike, n’ihi na ọ bụ ihe dị nsọ nye unu.+ Onye ọ bụla merụrụ ya, a ghaghị igbu ya.+ Ọ bụrụ na e nwee onye ọ bụla rụrụ ọrụ na ya, a ga-ebipụ mkpụrụ obi ahụ n’etiti ndị ya.+
15 Ụbọchị isii ka e nwere ike ịrụ ọrụ, ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izu ike, nke a ga-ezu naanị ike na ya.+ Ọ bụ ihe dị nsọ nye Jehova. Onye ọ bụla rụrụ ọrụ n’ụbọchị izu ike, a ghaghị igbu ya.
16 Ụmụ Izrel ga-edebekwa ụbọchị izu ike, ka ha wee debe ụbọchị izu ike n’ọgbọ ha niile. Ọ bụ ọgbụgba ndụ na-adịru mgbe a na-akaghị aka.+
17 Ọ bụ ihe ịrịba ama n’etiti mụ na ụmụ Izrel ruo mgbe a na-akaghị aka,+ n’ihi na ụbọchị isii ka Jehova kere eluigwe na ụwa ma n’ụbọchị nke asaa o zuru ike wee nweta ume.’”+
18 Ozugbo ọ gwasịrị ya okwu n’Ugwu Saịnaị, o nyere Mozis mbadamba nkume abụọ nke Ihe Àmà ahụ,+ mbadamba nkume ndị mkpịsị aka Chineke dere ihe na ha.+