Ọpụpụ 30:1-38
30 “Rụọ ebe ịchụàjà ka ọ bụrụ ebe a ga na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ;+ osisi akeshịa ka ị ga-eji rụọ ya.
2 Ọ ga-enwe akụkụ anọ há nhata, ọ ga-adị otu kubit n’ogologo na otu kubit n’obosara nakwa kubit abụọ n’ịdị elu. Mpi ya ga-esi n’ahụ́ ya pụta.+
3 Ị ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa machie ya, ma elu ya ma akụkụ ya gbaa gburugburu, tinyere mpi ya; ị ga-eji ọlaedo kpụọ ihe ịchọ mma gburugburu ọnụ ya.+
4 Ị ga-eji ọlaedo kpụọ ihe abụọ yiri mgbaaka maka ya. N’okpuru ihe ahụ a kpụrụ n’ọnụ ya n’akụkụ ya abụọ ka ị ga-arụnye ha, n’akụkụ ya abụọ chere ibe ha ihu, ka ha bụrụ ihe ga na-ejide okporo osisi ndị a ga-eji na-ebu ya.+
5 Ị ga-eji osisi akeshịa rụọ okporo osisi ndị ahụ ma were ọlaedo machie ha.+
6 Ị ga-edebe ya n’ihu ákwà mgbochi ahụ nke dị nso n’igbe ihe àmà ahụ,+ n’ihu ihe mkpuchi nke e ji kpuchie Ihe Àmà ahụ, bụ́ ebe m ga-apụta ìhè n’ihu gị.+
7 “Erọn ga na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ+ n’elu ya.+ Kwa ụtụtụ, mgbe ọ na-akwadebe oriọna ndị ahụ,+ ka ọ ga-esure ya.
8 Erọn ga na-esure ya ọkụ mgbe ọ na-amụnye oriọna ndị ahụ ọkụ ná mgbede. Ọ bụ ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nke a ga na-esure n’ọkụ mgbe niile n’ihu Jehova n’ọgbọ unu niile.
9 Unu agaghị esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ+ nke iwu na-akwadoghị n’elu ya, ma ọ bụ àjà nsure ọkụ ma ọ bụ àjà ọka;* unu awụsala àjà ihe ọṅụṅụ n’elu ya.
10 Erọn ga-achụkwa àjà mkpuchi mmehie n’elu mpi ya otu ugboro kwa afọ.+ Ọ ga-eji ọbara anụ àjà mmehie+ nke e ji ekpuchi mmehie kpuchie mmehie maka ya otu ugboro kwa afọ, a ga na-eme ya n’ọgbọ unu niile. Ọ bụ ihe kasị nsọ nye Jehova.”
11 Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị:
12 “Mgbe ọ bụla ị gụrụ ụmụ Izrel ọnụ iji mata ole ha dị,+ onye ọ bụla n’ime ha ga-enye Jehova ihe mgbapụta maka mkpụrụ obi ya mgbe a na-agụ ha ọnụ,+ ka ihe otiti ọ bụla wee ghara ịdakwasị ha mgbe a na-agụ ha ọnụ.+
13 Nke a bụ ihe ndị niile a gụrụ ọnụ ga-enye: ọkara shekel ma e jiri shekel nke ebe nsọ tụọ ya.+ Ihe ọ̀tụ̀tụ̀ gira iri abụọ bụ otu shekel. Ọkara shekel bụ onyinye a na-enye Jehova.+
14 Onye ọ bụla n’ime ndị e debara aha ha n’akwụkwọ, malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe, ga-enye Jehova onyinye.+
15 Ndị ọgaranya agaghị enye ihe karịrị nke ahụ, ndị ogbenye agaghịkwa enye ihe dị ala karịa ọkara shekel,+ ka ha wee nye Jehova onyinye a, ka e wee jiri ya kpuchiere mkpụrụ obi unu mmehie.+
16 Ị ga-anatakwa ụmụ Izrel ego ọlaọcha ahụ e ji ekpuchi mmehie ma nye ya maka ozi a na-eje n’ụlọikwuu nzute,+ ka o wee bụụrụ ụmụ Izrel ihe ncheta n’ihu Jehova, iji kpuchiere mkpụrụ obi unu mmehie.”
17 Jehova gwakwara Mozis, sị:
18 “Ị ga-eme efere ọla kọpa, werekwa ọla kọpa mee ihe ndọkwasị ya maka ịsa aka na ụkwụ,+ ị ga-adọba ya n’agbata ụlọikwuu nzute na ebe ịchụàjà ma gbanye ya mmiri.+
19 Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga na-asa aka na ụkwụ ha na ya.+
20 Mgbe ha na-abanye n’ụlọikwuu nzute, ha ga-eji mmiri ahụ saa aka na ụkwụ ha ka ha ghara ịnwụ, ma ọ bụ mgbe ha gara nso n’ebe ịchụàjà ahụ ije ozi iji sureere Jehova àjà a na-esure n’ọkụ.+
21 Ha ga-asa aka ha na ụkwụ ha ka ha ghara ịnwụ,+ ọ ga-abụrụ ha ụkpụrụ na-adịru mgbe a na-akaghị aka, ma ya ma ụmụ ya ruo ọgbọ ha niile.”+
22 Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị:
23 “Ma gị onwe gị, were ihe na-esi ísì ụtọ kasị mma:+ mea+ rọrọ arọ nke dị narị shekel ise, na sinamọn+ na-esi ísì ụtọ nke bụ́ ọkara nke ahụ, ya bụ, narị shekel abụọ na iri ise, nakwa kalamọs+ na-esi ísì ụtọ nke dị narị shekel abụọ na iri ise,
24 nakwa osisi kashịa+ nke dị narị shekel ise ma e jiri shekel ebe nsọ tụọ ya,+ nakwa mmanụ oliv nke dị otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ hin.+
25 Ị ga-eji ha mepụta mmanụ dị nsọ e ji ete mmadụ mmanụ, mmanụ otite, bụ́ ihe a gwara agwa, dị ka nke onye na-eme mmanụ otite mere.+ Ọ gaje ịbụ mmanụ dị nsọ e ji ete mmadụ mmanụ.+
26 “Ị ga-eji ya tee ụlọikwuu nzute+ na igbe ihe àmà ahụ mmanụ,
27 teekwa tebụl ahụ na arịa ya niile na ihe ndọba oriọna ahụ na arịa ya niile na ebe ịchụàjà nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ,
28 na ebe ịchụàjà nke àjà nsure ọkụ na arịa ya niile na efere ahụ na ihe ndọkwasị ya.
29 Ị ga-edo ha nsọ ka ha wee bụrụ ihe kasị nsọ n’ezie.+ Onye ọ bụla ga-emetụ ha aka ga-abụ onye dị nsọ.+
30 Ị ga-etekwa Erọn+ na ụmụ ya ndị ikom mmanụ,+ ị ga-edo ha nsọ ka ha wee bụrụ ndị nchụàjà m.+
31 “Gwa ụmụ Izrel, sị, ‘Nke a ga-abụrụ m mmanụ dị nsọ e ji ete mmadụ mmanụ n’ọgbọ unu niile.+
32 A gaghị ete ya mmadụ n’ahụ́, unu agaghịkwa eji ihe ndị e ji mee ya mee nke ọ bụla dị ka ya. Ọ bụ ihe dị nsọ. Ọ na-abụrụ unu ihe dị nsọ.
33 Onye ọ bụla nke mere mmanụ otite dị ka ya, nke tekwara ya onye nkịtị, a ga-ebipụ ya n’etiti ndị ya.’”+
34 Jehova wee gaa n’ihu ịsị Mozis: “Were ihe dị iche iche na-esi ísì ụtọ:+ mmanụ stakti na ọnịka na-esi ísì ụtọ na galbanọm na-esi ísì ụtọ na frankinsens a na-agwaghị agwa.+ Ọ̀tụ̀tụ̀ ha niile ga-aha nhata.
35 Ị ga-eji ha mee ihe nsure ọkụ, ihe na-esi ísì ụtọ,+ dị ka nke onye na-eme mmanụ otite mere, bụ́ nke e tinyere nnu,+ nke a na-agwaghị ihe ọzọ, nke bụ́ ihe dị nsọ.
36 Ị ga-asụ ụfọdụ n’ime ya nke ọma ka ọ dị ka ntụ, ị ga-edebekwa ụfọdụ n’ime ya n’ihu Ihe Àmà ahụ nke dị n’ụlọikwuu nzute,+ bụ́ ebe m ga-apụta n’ihu gị.+ Ọ ga-abụ ihe kasị nsọ nye unu.
37 Unu emerela onwe unu ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nke e ji ihe ndị a mee.+ Ọ ga na-abụrụ gị ihe dị nsọ nye Jehova.+
38 Onye ọ bụla mere nke ọ bụla dị ka ya iji nụrụ ísì ya, a ga-ebipụ+ ya n’etiti ndị ya.”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.