Ọpụpụ 3:1-22

3  Mozis wee ghọọ onye na-azụ ìgwè ewu na atụrụ Jetro,+ onye nchụàjà Midian, bụ́ nna nwunye ya.+ Ka o du ìgwè ewu na atụrụ ahụ na-aga n’ebe ọdịda anyanwụ n’ala ịkpa ahụ, o mesịrị bịarute n’ugwu nke ezi Chineke,+ na Horeb.+  Mmụọ ozi Jehova wee pụta ìhè n’ihu ya n’ire ọkụ n’etiti otu osisi ogwu.+ Ka ọ nọ na-ele anya, lee, ọkụ nọ na-enwu n’osisi ogwu ahụ ma o reghị osisi ogwu ahụ.  Mozis wee sị: “Ka m gagodị leruo oké ihe ịtụnanya a anya, iji mara ihe mere na ọkụ adịghị ere osisi ogwu a.”+  Mgbe Jehova hụrụ na ọ tụgharịrị iji leruo ya anya, ozugbo ahụ Chineke si n’etiti osisi ogwu ahụ kpọọ ya òkù, sị: “Mozis! Mozis!” o wee sị: “Lee m.”+  O wee sị: “Abịala nso n’ebe a. Yipụ akpụkpọ ụkwụ gị, n’ihi na ebe i guzo bụ ala nsọ.”+  O wee gaa n’ihu ịsị: “Abụ m Chineke nke nna gị, Chineke Ebreham, Chineke Aịzik na Chineke Jekọb.”+ Mozis wee wepụ ihu ya, n’ihi na egwu tụrụ ya ile ezi Chineke anya.  Jehova kwukwara, sị: “N’ezie, ahụwo m ahụ́ a na-emekpa ndị m bụ́ ndị nọ n’Ijipt, anụwokwa m mkpu ákwá ha na-eti n’ihi ndị na-amanye ha ịrụ ọrụ; n’ihi na m maara nnọọ ihe mgbu ha na-enwe.+  M na-agbada ịga napụta ha n’aka ndị Ijipt+ nakwa ịkpọpụta ha n’ala ahụ kpọga ha n’ala dị mma, dịkwa obosara, n’ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,+ n’ógbè ndị Kenan na ndị Het na ndị Amọraịt na ndị Perizaịt na ndị Haịvaịt nakwa ndị Jibọs.+  Lee! mkpu ákwá ụmụ Izrel na-eti eruwo m ntị, ahụwokwa m mmegbu ndị Ijipt na-emegbu ha.+ 10  Ugbu a, bịa ka m ziga gị ka ị gakwuru Fero, ị ga-akpọpụtakwa ndị m bụ́ ụmụ Izrel n’Ijipt.”+ 11  Otú ọ dị, Mozis gwara ezi Chineke, sị: “Ònye ka m bụ nke na m ga-agakwuru Fero, nke na m ga-akpọpụtakwa ụmụ Izrel n’Ijipt?”+ 12  O wee sị: “N’ihi na m ga-anọnyere gị,+ nke a ga-abụkwara gị ihe ịrịba ama na ọ bụ m zigara gị:+ Mgbe ị kpọpụtasịrị ndị m n’Ijipt, unu ga-ejere ezi Chineke ozi n’ugwu a.”+ 13  Ma Mozis gwara ezi Chineke, sị: “Ọ bụrụkwanụ na mụ abịakwute ụmụ Izrel, m wee sị ha, ‘Chineke nna nna unu hà ezitewo m ka m bịakwute unu,’ ha ewee sị m, ‘Gịnị bụ aha ya?’+ Gịnị ka m ga-agwa ha?” 14  Chineke wee gwa Mozis, sị: “M GA-ABỤ IHE M CHỌRỌ ỊBỤ.”+ O kwukwara, sị: “Nke a bụ ihe ị ga-agwa ụmụ Izrel, ‘M GA-ABezitewo m ka m bịakwute unu.’”+ 15  Chineke wee gwa Mozis ọzọ, sị: “Nke a bụ ihe ị ga-agwa ụmụ Izrel, ‘Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà, Chineke Ebreham,+ Chineke Aịzik+ na Chineke Jekọb,+ ezitewo m ka m bịakwute unu.’ Nke a bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi,+ nke a bụkwa ihe ncheta m site n’otu ọgbọ ruo ọgbọ ọzọ.+ 16  Gawa, kpọkọta ndị okenye Izrel, gwakwa ha, sị: “Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà apụtawo ìhè n’ihu m,+ Chineke Ebreham, Aịzik na Jekọb, wee sị: “Aghaghị m ilebara unu anya,+ lebakwa anya n’ihe a na-eme unu n’Ijipt. 17  N’ihi ya, m na-asị, M ga-akpọpụta unu ná mmekpa ahụ́+ ndị Ijipt na-emekpa unu wee kpọga unu n’ala ndị Kenan na ndị Het na ndị Amọraịt+ na ndị Perizaịt na ndị Haịvaịt na ndị Jibọs,+ n’ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.”’+ 18  “Ha ga-ege ntị n’olu gị,+ gị onwe gị na ndị okenye Izrel ga-abịakwute eze Ijipt, unu ga-agwakwa ya, sị, ‘Jehova bụ́ Chineke ndị Hibru+ agwawo anyị okwu,+ biko, anyị chọrọ ịga njem ga-ewe ụbọchị atọ n’ala ịkpa, anyị chọrọ ịchụrụ Jehova bụ́ Chineke anyị àjà.’+ 19  Ma mụ onwe m maara na eze Ijipt agaghị ekwe ka unu gaa ọ gwụla ma ọ̀ bụ site n’aka dị ike.+ 20  M ga-amatị aka m+ tie Ijipt ihe site n’ọrụ m niile dị ebube m ga-arụ n’ime ya; e mesịa, ọ ga-ahapụ unu ka unu laa.+ 21  M ga-emekwa ka ndị a nweta ihu ọma ndị Ijipt; ọ ga-erukwa na mgbe unu na-ala, unu agaghị agba aka laa.+ 22  Nwaanyị ọ bụla ga-arịọ onye agbata obi ya, rịọkwa nwaanyị bi n’ụlọ ya dị ka ọbịa ihe ndị e ji ọlaọcha mee na ihe ndị e ji ọlaedo mee na ákwà mgbokwasị, unu ga-ewere ha yiwe ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom; unu ga-agbawakwa ndị Ijipt aka.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji