Ọpụpụ 28:1-43
28 “Ma gị onwe gị, kpọta Erọn nwanne gị, ya na ụmụ ya ndị ikom, ka ha si n’etiti ụmụ Izrel bịakwute gị, ka o wee bụrụ onye nchụàjà m,+ ya bụ, Erọn,+ Nedab na Abaịhu,+ Elieza na Ịtama,+ bụ́ ụmụ Erọn.
2 Meere Erọn nwanne gị uwe nsọ iji mee ka o nwee ùgwù nakwa iji chọọ ya mma.+
3 Gị onwe gị ga-agwa ndị niile maara ihe okwu, bụ́ ndị nwere obi nke m mere ka o jupụta na mmụọ nke amamihe,+ ha ga-emere Erọn uwe ndị a ga-eji doo ya nsọ, ka o wee bụrụ onye nchụàjà m.+
4 “Uwe ndị a ka ha ga-eme: akpa obi,+ na efọd+ na uwe na-enweghị aka+ na uwe mwụda tụrụ àgwà, ákwà a na-eke n’isi+ na ákwà a na-eke n’úkwù;+ ha ga-emere Erọn nwanne gị na ụmụ ya ndị ikom uwe nsọ, ka o wee bụrụ onye nchụàjà m.
5 Ha onwe ha ga-ewere ọlaedo na eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo na eri na-acha uhie uhie na ezigbo ákwà linin.
6 “Ihe ha ga-eji mee efọd* ahụ bụ ọlaedo, eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo, eri na-acha uhie uhie na ezigbo eri linin a kpara akpa, nke onye na-akpa ihe n’ákwà ga-akpa.+
7 Ọ ga-enwe ubu abụọ nke ọ bụ na nsọtụ ya abụọ ka a ga-ejikọ ha, a ga-ejikọta ya ejikọta.+
8 Otú a ga-esi kwee efọd ahụ ka a ga-esi kwee eriri+ ya nke ga-adị n’elu ya iji na-ekesi ya ike, a ga-ejikwa otu ihe ahụ e ji kwee efọd ahụ, bụ́ ọlaedo, eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo na eri na-acha uhie uhie na ezigbo eri linin a kpara akpa, kwee ya.
9 “Ị ga-ewere nkume ọnịks+ abụọ ma kanye+ aha ụmụ Izrel n’elu ha,+
10 aha isii n’ime aha ha n’otu nkume nakwa aha isii fọdụrụ na nkume nke ọzọ n’usoro e ji mụọ ha.+
11 Dị ka omenkà si atụ́ ihe na nkume, dị ka ihe a kanyere na mgbaaka e ji aka ihe akara, otú ahụ ka ị ga-akanye aha ụmụ Izrel na nkume abụọ ahụ.+ Ị ga-akwụnye ha n’ihe mbadamba abụọ e ji ọlaedo kpụọ.+
12 Ị ga-etinye nkume abụọ ahụ n’ubu efọd ahụ ka ha bụrụ nkume ncheta nye ụmụ Izrel;+ Erọn ga-eburu aha ha n’ubu ya abụọ n’ihu Jehova ka ọ bụrụ ihe ncheta.
13 Ị ga-eji ọlaedo kpụọ ihe mbadamba abụọ,
14 jirikwa ọlaedo a na-agwaghị agwa mee ụdọ ígwè abụọ.+ Ị ga-eme ka ha dị ka ụdọ, ka ha dị ka eriri; ị ga-ekegide ụdọ ígwè ahụ n’ihe mbadamba ndị ahụ.+
15 “Ị ga-eme akpa obi e ji ekpe ikpe+ ka ọ dị ka ihe onye na-akpa ihe n’ákwà kpara. Ị ga-eme ya otú ahụ a ga-esi mee efọd ahụ. Ị ga-eji ọlaedo, eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ e sijiri odo odo na eri na-acha uhie uhie na ezigbo eri linin a kpara akpa, mee ya.+
16 Ọ ga-enwe akụkụ anọ há nhata ma a pịajie ya, dịkwa otu ntụ ọbụ aka n’ogologo nakwa otu ntụ ọbụ aka n’obosara.+
17 Ị ga-etinye ya nkume dị iche iche, ọ ga-adị ahịrị nkume anọ.+ Ahịrị nke mbụ ga-abụ rubi,+ topaz+ na emerad.+
18 Ahịrị nke abụọ ga-abụ tọkwọiz,+ safaya+ na jaspa.+
19 Ahịrị nke atọ ga-abụ nkume leshem, aget+ na ametist.+
20 Ahịrị nke anọ ga-abụ krisolaịt na ọnịks+ na jed. A ga-etinye ha n’oghere ha e ji ọlaedo mee.+
21 Nkume ndị ahụ ga-adị ole aha ụmụ Izrel dị, ha ga-adị iri na abụọ dị ka aha ha si dị.+ Ha ga-adị ka ihe a kanyere na mgbaaka e ji aka ihe akara, ebo nke ọ bụla, dị ka aha ya si dị, maka ebo iri na abụọ ahụ.+
22 “Ị ga-ejikwa ọlaedo a na-agwaghị agwa mee ụdọ ígwè, dị ka eriri, n’elu akpa obi ahụ.+
23 Ị ga-eji ọlaedo kpụọ ihe abụọ yiri mgbaaka n’akpa obi ahụ,+ ị ga-etinye ihe abụọ ahụ yiri mgbaaka na nsọtụ abụọ nke akpa obi ahụ.
24 Ị ga-aganye eriri abụọ ahụ e ji ọlaedo kpụọ n’ihe abụọ ahụ yiri mgbaaka bụ́ ndị dị na nsọtụ abụọ nke akpa obi ahụ.+
25 Ị ga-aganyekwa isi abụọ nke eriri abụọ ahụ n’ihe mbadamba abụọ ahụ, ị ga-ekegidekwa ha n’ubu abụọ nke efọd ahụ, n’ihu ya.+
26 Ị ga-eji ọlaedo kpụọ ihe abụọ yiri mgbaaka ma kwụnye ha na nsọtụ abụọ nke akpa obi ahụ, n’ọnụ ọnụ ya, n’ime, n’akụkụ chere efọd ahụ ihu.+
27 Ị ga-ejikwa ọlaedo kpụọ ihe abụọ yiri mgbaaka ma si n’okpuru kwụnye ha n’ubu abụọ nke efọd ahụ, n’ihu ya, n’akụkụ ebe a dụkọtara ya adụkọta, n’elu eriri efọd ahụ.+
28 Ha ga-eji eriri na-acha anụnụ anụnụ kekọta ihe ahụ yiri mgbaaka nke dị n’akpa obi ahụ na ihe ahụ yiri mgbaaka nke dị n’efọd ahụ, ka o wee na-adị n’elu eriri efọd ahụ, ka akpa obi ahụ gharakwa isi n’elu efọd ahụ dapụ.+
29 “Erọn ga-ebu aha ụmụ Izrel n’obi ya n’akpa obi ahụ e ji ekpe ikpe mgbe ọ na-abata n’Ebe Nsọ ahụ ka ọ bụrụ ihe ncheta n’ihu Jehova mgbe niile.
30 Ị ga-etinyekwa Yurim+ na Tọmịm n’akpa obi ahụ e ji ekpe ikpe, ọ ga na-adị n’obi Erọn mgbe ọ na-abata n’ihu Jehova; Erọn ga-ebukwa ikpe+ ụmụ Izrel n’obi ya n’ihu Jehova mgbe niile.
31 “Ị ga-ejikwa naanị eri na-acha anụnụ anụnụ mee uwe na-enweghị aka nke efọd ahụ.+
32 Ọ ga-enwe oghere n’elu ya, n’etiti ya. A ga-adụ ọnụ ọnụ oghere ya adụ gbaa gburugburu, nke onye na-ekwe ákwà ga-adụ. Ọ ga-adị ka oghere na-adị n’uwe agha, ka ọ ghara ịdọka adọka.+
33 Ị ga-ejikwa eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo nakwa eri na-acha uhie uhie kpaa mkpụrụ pọmigranet gburugburu ọnụ ọnụ ala ya, kpaakwa mgbịrịgba+ ọlaedo n’agbata mkpụrụ pọmigranet ndị ahụ gbaa gburugburu;
34 otu mgbịrịgba ọlaedo na otu mkpụrụ pọmigranet, otu mgbịrịgba ọlaedo na otu mkpụrụ pọmigranet gbaa ọnụ ọnụ ala uwe ahụ na-enweghị aka gburugburu.+
35 Erọn ga-eyi ya ka o wee na-eje ozi, a ga na-anụ ụda ya mgbe ọ na-abanye n’ebe nsọ ahụ n’ihu Jehova nakwa mgbe ọ na-apụta, ka o wee ghara ịnwụ.+
36 “Ị ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa mee ihe mbadamba na-egbuke egbuke, kanyekwa na ya, ‘Ịdị nsọ bụ nke Jehova,’ dị ka ihe a kanyere na mgbaaka e ji aka ihe akara.+
37 Ị ga-eji eriri na-acha anụnụ anụnụ kegide ya, ọ ga na-adịkwa n’elu ákwà ahụ a na-eke n’isi.+ N’ihu ihu ákwà ahụ a na-eke n’isi ka ọ ga na-adị.
38 Ọ ga na-adị n’egedege ihu Erọn, Erọn ga-azakwa ajụjụ maka njehie e jehiere n’ihe metụtara ihe dị nsọ,+ ndị ụmụ Izrel ga-edo nsọ, ya bụ, onyinye ha niile dị nsọ; ọ ga-adịkwa n’egedege ihu ya mgbe niile, iji na-enwetara ha ihu ọma Jehova.+
39 “Ị ga-eji ezigbo eri linin* kwee uwe mwụda tụrụ àgwà ma were ezigbo eri linin mee ákwà a na-eke n’isi,+ ị ga-emekwa ákwà a na-eke n’úkwù,+ nke onye na-ekwe ákwà ga-ekwe.
40 “Ị ga-emere ụmụ ndị ikom Erọn uwe mwụda,+ ị ga-emekwara ha ákwà a na-eke n’úkwù, ị ga-emekwara ha ákwà a na-afụ n’isi+ iji mee ka ha nwee ùgwù nakwa iji chọọ ha mma.+
41 Ị ga-ewere ha yiwe Erọn nwanne gị na ụmụ ya ndị ikom, ị ga-ete ha mmanụ,+ nyekwa ha ikike+ ma doo ha nsọ, ha ga-abụkwa ndị nchụàjà m.
42 Ị ga-eji ákwà linin meere ha uwe úkwù iji kpuchie ahụ́ ha.+ Ọ ga-esi n’úkwù ruo n’apata ụkwụ.
43 Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eyi ya mgbe ha na-abanye n’ụlọikwuu nzute ma ọ bụ mgbe ha na-agaru ebe ịchụàjà ahụ iji jee ozi n’ebe nsọ ahụ, ka ha wee ghara ibutere onwe ha njehie wee nwụọ. Ọ bụ ụkpụrụ ga-adịrị ya na ụmụ ya ga-anọchi ya, ruo mgbe a na-akaghị aka.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Banyere akụkụ dị iche iche nke Uwe Nnukwu Onye Nchụàjà, lee ihe osise dị na peeji nke 1772.
^ Lee ihe e dere n’ala ala peeji n’Ọpụpụ 28:6.