Ọpụpụ 27:1-21

27  “Ị ga-eji osisi akeshịa rụọ ebe ịchụàjà nke ga-adị kubit ise n’ogologo nakwa kubit ise n’obosara. Ebe ịchụàjà+ ahụ ga-enwe akụkụ anọ há nhata, ọ ga-adịkwa kubit atọ n’ịdị elu.  Ị ga-arụnye mpi+ ya n’akụkụ anọ ya. Mpi ya ga-esi n’ahụ́ ya pụta, ị ga-ejikwa ọla kọpa machie ya.+  Ị ga-arụ ite ya maka ikpopụ ntụ nke ya na abụba gwakọtara, rụọkwa shọvel ya, na ọkwá ya, na ndụdụ ya, na ihe ịgụ ọkụ ya; ị ga-eji ọla kọpa rụọ arịa ya niile.+  Ị ga-akpa ihe a ga-etinye n’ime ya, ihe e ji ọla kọpa kpaa;+ ị ga-ejikwa ọla kọpa kpụọ ihe anọ yiri mgbaaka n’elu ihe ahụ a kpara akpa, n’akụkụ ya anọ.  Ị ga-etinye ya n’okpuru ọnụ ebe ịchụàjà ahụ, n’ime ya, ihe ahụ a kpara akpa ga-adịkwa n’etiti ebe ịchụàjà ahụ.+  Ị ga-arụ okporo osisi maka ebe ịchụàjà ahụ, ị ga-ejikwa osisi akeshịa rụọ okporo osisi ndị ahụ, ị ga-ejikwa ọla kọpa machie ha.+  A ga-etinye okporo osisi ndị ahụ n’ihe ndị ahụ yiri mgbaaka, okporo osisi ndị ahụ ga-adị n’akụkụ abụọ nke ebe ịchụàjà ahụ mgbe a na-ebu ya.+  Ị ga-arụ ya ka ọ dị ka igbe osisi nwere oghere. Dị nnọọ ka o gosiri gị n’ugwu ahụ, otú ahụ ka a ga-arụ ya.+  “Ị ga-agbakwa ụlọikwuu ahụ ogige.+ N’akụkụ chere Negeb ihu, n’ebe ndịda, ogige ya ga-enwe ákwà ngechi nke e ji ezigbo eri linin a kpara akpa kwee,+ otu akụkụ ya ga-adị otu narị kubit n’ogologo. 10  A ga-eji ọla kọpa rụọ ogidi iri abụọ ya na ntọala iri abụọ ha ndị nwere oghere. A ga-eji ọlaọcha rụọ mkpọ́ ogidi ndị ahụ na ihe njikọ ha.+ 11  Otú ahụkwa ka ebe ugwu ya ga-aha n’ogologo, ákwà ngechi ya ga-adị otu narị kubit n’ogologo, a ga-ejikwa ọla kọpa rụọ ogidi iri abụọ ya na ntọala iri abụọ ha ndị nwere oghere, jirikwa ọlaọcha rụọ mkpọ́ ogidi ndị ahụ na ihe njikọ ha.+ 12  Ma obosara nke ákwà ngechi ogige ahụ ga-adị kubit iri ise n’ebe ọdịda anyanwụ, ogidi ha ga-adị iri, ntọala ha ndị nwere oghere adịrịkwa iri.+ 13  Obosara ogige ahụ n’akụkụ chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ ga-adị kubit iri ise.+ 14  Ákwà ngechi dị kubit iri na ise ga-adị n’otu akụkụ, ogidi ha ga-adị atọ, ntọala ha ndị nwere oghere adịrịkwa atọ.+ 15  N’akụkụ ya nke ọzọ, a ga-enwe ákwà ngechi dị kubit iri na ise, ogidi ha ga-adị atọ, ntọala ha ndị nwere oghere adịrịkwa atọ.+ 16  “N’ọnụ ụzọ ogige ahụ, a ga-enwe ákwà ngebichi dị kubit iri abụọ n’ogologo, nke a ga-eji eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo na eri na-acha uhie uhie na ezigbo eri linin a kpara akpa kwee,+ nke onye na-ekwe ákwà ga-ekwe, ogidi ha ga-adị anọ, ntọala ha ndị nwere oghere adịrịkwa anọ.+ 17  Ogidi niile nke ogige ahụ gbaa gburugburu ga-enwe ihe njikọ ndị e ji ọlaọcha rụọ, a ga-ejikwa ọlaọcha rụọ mkpọ́ ha, ma, ọ bụ ọla kọpa ka a ga-eji rụọ ntọala ha ndị nwere oghere.+ 18  Ogige ahụ ga-adị otu narị kubit n’ogologo, kubit iri ise n’obosara+ nakwa kubit ise n’ịdị elu, nke a ga-eji ezigbo ákwà linin e kwere ekwe rụọ, a ga-ejikwa ọla kọpa rụọ ntọala ha ndị nwere oghere. 19  A ga-eji ọla kọpa mee arịa niile nke ụlọikwuu ahụ bụ́ ndị a ga-eji na-eje ozi ya niile nakwa mkpọ́ niile nke ụlọikwuu ya nakwa mkpọ́ niile nke ogige ya.+ 20  “Ma gị onwe gị, ị ga-enye ụmụ Izrel iwu ka ha wetara gị mmanụ a na-agwaghị agwa, nke a sụpụtara ná mkpụrụ oliv maka ihe ọkụ, ka e jiri ya na-amụnye oriọna mgbe niile.+ 21  N’ụlọikwuu nzute, ná mpụga ákwà mgbochi+ ahụ nke dị n’akụkụ Ihe Àmà ahụ, Erọn na ụmụ ya ga na-elekọta ya ka ọ na-enwu malite ná mgbede ruo ụtụtụ n’ihu Jehova.+ Ọ bụ ụkpụrụ dịịrị ọgbọ+ ha niile ruo mgbe a na-akaghị aka, nke ụmụ Izrel ga na-edebe.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji