Ọpụpụ 26:1-37
26 “Ihe ị ga-eji rụọ ụlọikwuu* ahụ bụ ákwà ụlọikwuu iri,+ ndị e ji ezigbo eri linin a kpara akpa na eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo na eri na-acha uhie uhie mee.+ Ị ga-akpa cherọb na ha,+ dị ka nke onye na-akpa ihe n’ákwà kpara.
2 Ákwà ụlọikwuu nke ọ bụla ga-adị kubit iri abụọ na asatọ n’ogologo, ákwà ụlọikwuu nke ọ bụla ga-adịkwa kubit anọ n’obosara. Ákwà ụlọikwuu niile ahụ ga-aha nhata.+
3 A ga-adụkọta ákwà ụlọikwuu ise ka ha bụrụ otu, a ga-adụkọtakwa ákwà ụlọikwuu ise nke ọzọ ka ha bụrụ otu.+
4 Ị ga-ejikwa eri na-acha anụnụ anụnụ dụnye anya nko n’ọnụ ọnụ otu ákwà ụlọikwuu a dụkọtara ọnụ n’isi isi ya; ị ga-emekwa otu ihe ahụ n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu nke dị ná mpụta mpụta n’ebe a ga-ejikọta ya na nke ọzọ.+
5 Ị ga-adụnye anya nko iri ise n’otu ákwà ụlọikwuu, dụnyekwa anya nko iri ise n’isi isi ákwà ụlọikwuu nke dị n’ebe a ga-ejikọta ya na ákwà ụlọikwuu nke ọzọ, anya nko ndị ahụ ga-eche ibe ha ihu.+
6 Ị ga-ejikwa ọlaedo rụọ nko iri ise ma were nko ndị ahụ jikọta ákwà ụlọikwuu ndị ahụ, ọ ga-abụkwa otu ụlọikwuu.+
7 “Ị ga-eji ajị ewu mee ákwà+ a ga-eji kpuchie ụlọikwuu ahụ. Ị ga-emekwa ákwà ụlọikwuu iri na otu.
8 Ákwà ụlọikwuu nke ọ bụla ga-adị kubit iri atọ n’ogologo,+ ákwà ụlọikwuu nke ọ bụla ga-adịkwa kubit anọ n’obosara. Ákwà ụlọikwuu iri na otu ahụ ga-aha nhata.
9 Ị ga-adụkọta ákwà ụlọikwuu ise ọnụ, ị ga-adụkọtakwa ákwà ụlọikwuu isii ọnụ,+ ị ga-apịajikwa nke isii n’ime ákwà ụlọikwuu abụọ n’ihu ụlọikwuu ahụ.
10 Ị ga-adụnyekwa anya nko iri ise n’ọnụ ọnụ otu ákwà ụlọikwuu, nke dị ná mpụta n’ime ákwà ndị ahụ a dụkọtara ọnụ, dụnyekwa anya nko iri ise n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu nke dị n’ebe a ga-ejikọta ya na nke ọzọ.
11 Ị ga-ejikwa ọla kọpa rụọ nko iri ise+ ma konye nko ndị ahụ n’anya nko ndị ahụ wee jikọta ákwà ụlọikwuu ndị ahụ ọnụ, ha ga-aghọkwa otu.+
12 Ákwà ụlọikwuu fọrọ afọ ga-awụdata awụdata. Ọkara ákwà ụlọikwuu fọrọ afọ ga-asachi azụ ụlọikwuu ahụ.
13 Otu kubit n’otu akụkụ nakwa otu kubit n’akụkụ nke ọzọ n’ihe fọdụrụ n’ogologo ákwà ụlọikwuu ahụ ga-asachi akụkụ ụlọikwuu ahụ, ikpuchi ya n’otu akụkụ nakwa n’akụkụ nke ọzọ.
14 “Ị ga-eji akpụkpọ ebule e sijiri ọbara ọbara mee ihe mkpuchi ụlọikwuu ahụ, jirikwa akpụkpọ anụ sil mee ihe mkpuchi ga-adị n’elu ya.
15 “Ị ga-ejikwa osisi akeshịa rụọ awara osisi,+ ndị a ga-akwụwa ọtọ, maka ụlọikwuu ahụ.
16 Otu awara osisi ga-adị kubit iri n’ogologo, awara osisi nke ọ bụla ga-adịkwa otu kubit na ọkara n’obosara.
17 Awara osisi nke ọ bụla ga-enwe ihe nkwụnye abụọ e jikọtara ejikọta. Otú ahụ ka ị ga-eme awara osisi niile nke ụlọikwuu ahụ.
18 Ị ga-arụ awara osisi ndị ahụ maka ụlọikwuu ahụ, awara osisi iri abụọ maka akụkụ chere Negeb ihu, n’ebe ndịda.
19 “Ị ga-eji ọlaọcha rụọ ntọala iri anọ+ ndị nwere oghere a ga-akwụnye awara osisi iri abụọ ahụ; a ga-akwụnye ihe nkwụnye abụọ dị n’otu awara osisi na ntọala abụọ nwere oghere, kwụnyekwa ihe nkwụnye abụọ dị n’awara osisi nke ọzọ na ntọala abụọ nwere oghere.
20 Ị ga-arụkwa awara osisi iri abụọ maka akụkụ nke ọzọ nke ụlọikwuu ahụ, n’ebe ugwu,+
21 na ntọala iri anọ ha e ji ọlaọcha rụọ ndị nwere oghere, a ga-akwụnye otu awara osisi na ntọala abụọ nwere oghere, kwụnyekwa awara osisi nke ọzọ na ntọala abụọ nwere oghere.+
22 Ị ga-arụkwa awara osisi isii maka ebe azụ ụlọikwuu ahụ nke ga-eche ihu n’ebe ọdịda anyanwụ.+
23 Ị ga-arụkwa awara osisi abụọ ka ha bụrụ ogidi isi nkuku nke ụlọikwuu+ ahụ n’isi ngwụcha ya abụọ.
24 Ha ga-agba mkpị n’ala ala ha, nke ọ bụla n’ime ha ga-agbakwa mkpị ruo n’elu, n’ebe ihe yiri mgbaaka nke mbụ dị. Otú ahụ ka ha abụọ ga-adị. Ha ga-abụ ogidi isi nkuku abụọ.
25 A ga-enwekwa awara osisi asatọ na ntọala ha e ji ọlaọcha rụọ ndị nwere oghere, ntọala iri na isii, a ga-akwụnye otu awara osisi na ntọala abụọ nwere oghere, kwụnyekwa awara osisi nke ọzọ na ntọala abụọ nwere oghere.
26 “Ị ga-ejikwa osisi akeshịa+ rụọ osisi ntụhie, osisi ntụhie ise maka awara osisi ndị dị n’otu akụkụ ụlọikwuu ahụ,
27 nakwa osisi ntụhie ise maka awara osisi ndị dị n’akụkụ nke ọzọ nke ụlọikwuu ahụ nakwa osisi ntụhie ise maka awara osisi ndị dị n’akụkụ ụlọikwuu ahụ maka ebe azụ ya nke ga-eche ihu n’ebe ọdịda anyanwụ.+
28 Osisi ntụhie nke etiti nke dị n’etiti awara osisi ndị ahụ ga-amalite n’otu nsọtụ ruo na nsọtụ nke ọzọ.
29 “Ị ga-eji ọlaedo machie awara osisi ndị ahụ,+ ị ga-ejikwa ọlaedo rụọ ihe yiri mgbaaka maka ha ka ha bụrụ ihe ga na-ejide osisi ntụhie ndị ahụ; ị ga-ejikwa ọlaedo machie osisi ntụhie ndị ahụ.
30 Ị ga-ewukwa ụlọikwuu ahụ dị ka ụkpụrụ ya nke e gosiri gị n’ugwu a+ si dị.
31 “Ị ga-eji eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo na eri na-acha uhie uhie nakwa ezigbo eri linin a kpara akpa mee ákwà mgbochi.+ A ga-akpa cherọb na ya,+ nke onye na-akpa ihe n’ákwà ga-akpa.
32 Ị ga-ekonyekwa ya n’elu ogidi anọ e ji osisi akeshịa rụọ bụ́ ndị a machiri ọlaedo. A ga-eji ọlaedo rụọ mkpọ́ ha. A ga-egwunye ha na ntọala anọ e ji ọlaọcha rụọ bụ́ ndị nwere oghere.
33 Ị ga-ekonye ákwà mgbochi ahụ n’okpuru nko ndị ahụ ma bubata igbe ihe àmà+ ahụ n’ime ebe ahụ e konyere ákwà mgbochi ahụ; ákwà mgbochi ahụ ga-ekebiri unu Ebe Nsọ+ na Ebe Kasị Nsọ.+
34 Ị ga-ewere ihe mkpuchi ahụ kpuchie igbe ihe àmà ahụ n’Ebe Kasị Nsọ ahụ.
35 “Ị ga-edebe tebụl ahụ ná mpụga ákwà mgbochi ahụ, debekwa ihe ndọba oriọna+ ahụ n’akụkụ ụlọikwuu ahụ n’ebe ndịda ka o chee tebụl ahụ ihu; ị ga-edebekwa tebụl ahụ n’ebe ugwu.
36 Ị ga-eji eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo na eri na-acha uhie uhie na ezigbo eri linin a kpara akpa, mee ákwà ngebichi,+ nke onye na-ekwe ákwà ga-ekwe, maka ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ.
37 Ị ga-eji osisi akeshịa rụọ ogidi ise maka ákwà ngebichi ahụ ma were ọlaedo machie ha. A ga-eji ọlaedo rụọ mkpọ́ ha. Ị ga-eji ọla kọpa kpụọ ntọala ise nwere oghere maka ha.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Banyere akụkụ dị iche iche nke ụlọikwuu a, lee ihe osise dị na peeji nke 1170.