Ọpụpụ 24:1-18
24 O wee sị Mozis: “Gbagoo gakwuru Jehova, gị na Erọn, Nedab na Abaịhu+ na mmadụ iri asaa+ n’ime ndị okenye Izrel, unu ga-anọkwa n’ebe dịtụ anya kpọọ isiala.
2 Naanị Mozis ga-abịa Jehova nso; ma ha onwe ha agaghị abịaru nso, ndị Izrel agaghịkwa eso ya gbagoo.”+
3 Mozis wee bịa kọọrọ ụmụ Izrel ihe niile Jehova kwuru na mkpebi ikpe ya niile,+ mmadụ niile wee jiri otu olu zaa, sị: “Anyị dị njikere ime ihe niile Jehova kwuru.”+
4 Mozis wee dee ihe niile Jehova kwuru n’akwụkwọ.+ O wee bilie n’isi ụtụtụ wuo ebe ịchụàjà n’ala ala ugwu ahụ, wuokwa ogidi iri na abụọ bụ́ nke kwekọrọ n’ọnụ ọgụgụ ebo iri na abụọ nke Izrel.
5 E mesịa, o zipụrụ ụmụ okorobịa bụ́ ụmụ Izrel, ha wee chụọ àjà nsure ọkụ, jirikwa oké ehi dị iche iche chụọrọ Jehova àjà nkịtị na àjà udo.+
6 Mozis wee were ọkara ọbara oké ehi ndị ahụ gbanye n’ọkwá,+ o fesara ọkara nke ọzọ fọdụrụ n’ime ọbara ahụ n’elu ebe ịchụàjà.+
7 N’ikpeazụ, o weere akwụkwọ ọgbụgba ndụ+ ahụ gụọ ná ntị ndị Izrel.+ Ha wee sị: “Anyị dị njikere ime ihe niile Jehova kwuru, anyị ga-erubekwa isi.”+
8 Mozis wee were ọbara ahụ fesa ndị Izrel,+ sị: “Ihe a bụ ọbara nke ọgbụgba ndụ+ unu na Jehova gbaworo n’okwu a niile.”
9 Mozis na Erọn, Nedab na Abaịhu na mmadụ iri asaa n’ime ndị okenye Izrel wee gbagoo,
10 ha wee hụ Chineke Izrel.+ N’okpuru ụkwụ ya, e nwere ihe dị ka ihe e ji mbadamba nkume safaya mee, nke dị ọcha ka eluigwe.+
11 Ma o setịpụghị aka ya megide ndị ikom ahụ a na-akwanyere ùgwù n’etiti ụmụ Izrel,+ kama ha hụrụ ezi Chineke n’ọhụụ,+ riekwa nri ma ṅụọ ihe ọṅụṅụ.+
12 Jehova wee sị Mozis: “Gbagote bịakwute m n’ugwu, nọrọkwa na ya, n’ihi na m chọrọ inye gị mbadamba nkume na iwu na ntụziaka m ga-ede iji zie ha ihe.”+
13 Mozis na Jọshụa onye ozi ya wee bilie, Mozis wee gbagoo n’ugwu nke ezi Chineke.+
14 Ma ọ gwara ndị okenye ahụ, sị: “Cherenụ anyị n’ebe a ruo mgbe anyị ga-alọghachikwute unu.+ Lee! Erọn na Họọ+ so unu nọrọ. Onye ọ bụla nke nwere okwu ikpe, ya gakwuru ha.”+
15 Mozis wee gbagoo n’ugwu ahụ ka ígwé ojii kpuchiri ugwu ahụ.+
16 Ebube Jehova+ wee dịgide n’Ugwu Saịnaị,+ ígwé ojii wee kpuchie ya ruo ụbọchị isii. N’ikpeazụ, n’ụbọchị nke asaa, o si n’ígwé ojii kpọọ Mozis.+
17 N’anya ụmụ Izrel, ebube Jehova dị ka ọkụ na-erepịa ihe+ n’elu ugwu ahụ.
18 Mozis wee banye n’ime ígwé ojii ahụ ma gbagoo n’ugwu ahụ.+ Mozis wee nọgide n’ugwu ahụ ruo ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị.+