Ọpụpụ 23:1-33

23  “Akọsala akụkọ na-abụghị eziokwu.+ Adọnyerela onye ajọ omume úkwù site n’ịghọ onye akaebe nke na-akpa nkata ime ihe ọjọọ.+  Esonyela ìgwè mmadụ ịga mee ihe ọjọọ;+ agbakwala akaebe n’esemokwu site n’isonyere ìgwè mmadụ iji kpee ikpe na-ezighị ezi.+  Ma elela onye nọ n’ahụhụ anya n’ihu mgbe ị na-eleba anya n’okwu ya.+  “Ọ bụrụ na ị hụ ehi ma ọ bụ ịnyịnya ibu onye iro gị ka ọ na-akpafu, ị ghaghị ịkpụrụ ya kpụghachiri ya.+  Ọ bụrụ na ị hụ ịnyịnya ibu onye kpọrọ gị asị ka o bu ibu makpuru, ahapụla ya. Hụ na gị na ya tọpụrụ ya.+  “Agbagọla mkpebi ikpe n’okwu ikpe nke onye gị dara ogbenye.+  “Mee ka okwu ụgha dị anya n’ebe ị nọ.+ Egbukwala onye aka ya dị ọcha na onye ezi omume, n’ihi na agaghị m akpọ onye ajọ omume onye ezi omume.+  “Erila ngarị, n’ihi na ngarị na-ekpuchi ndị na-ahụ ụzọ nke ọma anya, ọ pụkwara ịgbagọ okwu ndị ezi omume.+  “Emegbula onye mbịarambịa,+ ebe ọ bụ na unu onwe unu amatawo otú mkpụrụ obi onye mbịarambịa na-adị, n’ihi na unu ghọrọ ndị mbịarambịa n’ala Ijipt.+ 10  “Afọ isii ka ị ga-agha mkpụrụ n’ala gị, ị ga-aghọrọkwa mkpụrụ ya.+ 11  Ma n’afọ nke asaa, ị ga-ahapụ ya n’akọghị ya ihe,+ ị ga-ahapụkwa ya ka ọ tọgbọrọ nkịtị, ndị dara ogbenye n’ime ndị gị ga-eri ihe dị na ya; anụ ọhịa ga-eri ihe ha rifọrọ.+ Otú ahụ ka ị ga-eme ubi vaịn gị na ubi oliv gị. 12  “Ụbọchị isii ka ị ga-arụ ọrụ gị;+ ma n’ụbọchị nke asaa, arụla ọrụ, ka ehi gị na ịnyịnya ibu gị wee zuo ike, ka nwa ohu gị nwaanyị na onye mbịarambịa wee nweta ume.+ 13  “Lezienụ anya n’ihe niile m gwara unu;+ unu akpọtụkwala chi ọzọ aha. E kwesịghị ịnụ ya n’ọnụ gị.+ 14  “Ugboro atọ n’afọ ka ị ga-emere m ememme.+ 15  Ị ga-eme ememme achịcha na-ekoghị eko.+ Ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko+ ụbọchị asaa, dị nnọọ ka m nyere gị n’iwu, n’oge a kara aka n’ọnwa Ebib,+ n’ihi na ọ bụ na ya ka i si n’Ijipt pụta. Ọ dịghịkwa onye ga-agba aka bịa n’ihu m.+ 16  Ị ga-emekwa ememme owuwe ihe ubi nke mkpụrụ mbụ kara aka+ nke ihe ị rụpụtara, n’ime ihe ị ghara n’ubi;+ nakwa ememme ịchịkọbata ihe ná ngwụsị afọ, mgbe i si n’ubi na-ewebata ihe ị rụpụtara.+ 17  Ugboro atọ n’afọ, nwoke ọ bụla n’ime unu ga-abịa n’ihu ezi Onyenwe unu, bụ́ Jehova.+ 18  “Agwakọtala ihe e tinyere ihe na-eko achịcha na ọbara e ji achụrụ m àjà. Abụba e ji mee ememme m ekwesịghị ịdị chi abọọ.+ 19  “Ndị kasị mma n’ime mkpụrụ mbụ kara aka nke ala gị ka ị ga-eweta n’ụlọ Jehova bụ́ Chineke gị.+ “Esila nwa ewu n’ime mmiri ara nne ya.+ 20  “Lee, m na-ezipụ mmụọ ozi+ ka o butere gị ụzọ iji chebe gị n’ụzọ nakwa iji kpọbata gị n’ebe m kwadebeworo.+ 21  Lezie anya n’ihi ya, rubekwa isi n’ihe o kwuru. Enupụrụla ya isi, n’ihi na ọ gaghị agbaghara unu mmebi iwu unu;+ n’ihi na aha m dị n’ime ya. 22  Otú ọ dị, ọ bụrụ na i rube nnọọ isi n’ihe o kwuru ma mee nnọọ ihe niile m ga-ekwu,+ m ga-ebuso ndị iro gị iro, majaakwa ndị na-amaja gị.+ 23  N’ihi na mmụọ ozi m ga-ebutere gị ụzọ, n’ezie, ọ ga-akpọbata gị n’ala ndị Amọraịt na nke ndị Het na nke ndị Perizaịt na nke ndị Kenan, ndị Haịvaịt na ndị Jibọs, m ga-ekpochapụkwa ha.+ 24  Akpọrọla chi ha isiala, ekwekwala ka a rata gị ife ha ofufe, emekwala ihe ọ bụla ga-eyi ihe niile ha rụrụ,+ kama ị ghaghị ịkwatu ha, ị ghaghịkwa ịkụtu ogidi+ nsọ ha. 25  Jeerenụ Jehova bụ́ Chineke unu ozi,+ ọ ga-agọzikwa nri gị na mmiri gị;+ n’ezie, m ga-ewepụ ọrịa n’etiti gị.+ 26  A gaghị enwe nwaanyị ime na-apụ n’ala gị,+ a gaghịkwa enwe nwaanyị aga na ya. M ga-eme ka ọnụ ọgụgụ ụbọchị gị zuo ezu.+ 27  “M ga-ezipụ ụjọ m n’ihu gị,+ m ga-etinye ndị niile ị ga-abata n’etiti ha n’ọgba aghara, n’ezie, m ga-eme ka ndị iro gị niile si n’ihu gị gbaa ọsọ.+ 28  M ga-ezipụ nkụda mmụọ ka o butere gị ụzọ,+ ọ ga-achụpụkwa ndị Haịvaịt, ndị Kenan na ndị Het n’ihu gị. 29  Agaghị m achụpụ ha n’ihu gị n’otu afọ, ka ala ahụ ghara ịtọgbọrọ n’efu, anụ ọhịa ewee mụbaa megide gị.+ 30  M ga-eji nke nta nke nta chụpụ ha n’ihu gị, ruo mgbe ị mụrụ ọmụmụ wee bichie ala ahụ.+ 31  “M ga-eme ka ókè nke ala gị malite n’Oké Osimiri Uhie ruo n’oké osimiri ndị Filistia,+ malitekwa n’ala ịkpa ruo n’Osimiri Yufretis; n’ihi na m ga-enyefe ndị bi n’ala ahụ n’aka unu, ị ga-achụpụkwa ha n’ihu gị.+ 32  Gị na ha ma ọ bụ chi ha agbala ndụ.+ 33  Ha ekwesịghị ibi n’ala gị, ka ha ghara ime ka i mehie m. Ọ bụrụ na i fee chi ha, ọ ga-aghọrọ gị ọnyà.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji