Ọpụpụ 22:1-31

22  “Ọ bụrụ na mmadụ ezuo ehi ma ọ bụ atụrụ, o wee gbuo ya ma ọ bụ ree ya, ọ ga-eji ehi ise kwụọ ụgwọ ehi ahụ, jirikwa atụrụ anọ kwụọ ụgwọ atụrụ ahụ.+  (“Ọ bụrụ na a hụ onye ohi+ ka ọ na-awaba n’ụlọ,+ e wee kụgbuo ya, ikpe ọbara agaghị ama mmadụ n’ihi ya.+  Ọ bụrụ na anyanwụ awaala mgbe ọ bịara, ikpe ọbara ga-ama mmadụ n’ihi ya.) “Ọ ghaghị ịkwụ ụgwọ ihe o zuru. Ọ bụrụ na ọ dịghị ihe o nwere, a ga-ere ya maka ihe o zuru.+  Ọ bụrụ na a hụ ihe e zuru ezu nke dị ndụ n’aka ya, ọ ga-akwụ ụgwọ ya okpukpu abụọ malite n’ehi ruo n’ịnyịnya ibu, ruokwa n’atụrụ.  “Ọ bụrụ na mmadụ emee ka anụ taa nri n’ugbo ma ọ bụ n’ubi vaịn, o wee zipụ anụ na-eburu ya ibu ma mee ka ha tachaa ihe dị n’ugbo onye ọzọ, ọ ga-eji ugbo ya kasị mma ma ọ bụ ubi vaịn ya kasị mma kwụọ ụgwọ ya.+  “Ọ bụrụ na ọkụ agbasaa wee banye n’osisi ogwu, ùkwù ọka* ma ọ bụ ọka ndị kwụ ọtọ ma ọ bụ ubi ewee rechapụ,+ onye mụnyere ọkụ ahụ aghaghị ịkwụ ụgwọ ihe ọkụ ahụ gbara.  “Ọ bụrụ na mmadụ enye mmadụ ibe ya ego ma ọ bụ ihe ka o debere ya,+ e wee zuru ya n’ụlọ onye ahụ, ọ bụrụ na a hụ onye ohi ahụ, ọ ga-akwụ ụgwọ ya okpukpu abụọ.+  Ọ bụrụ na a hụghị onye ohi ahụ, a ga-akpọta onye ahụ nwe ụlọ nso n’ebe ezi Chineke nọ+ ka a mara ma ọ bụ na o metụghị ihe mmadụ ibe ya aka.  Ma ikpe ọ bụla nke metụtara mmebi iwu,+ n’ihe banyere ehi, ịnyịnya ibu, atụrụ, uwe, ihe ọ bụla furu efu nke mmadụ pụrụ ịsị, ‘Ihe a bụ nke m!’ a ga-ewere ihe ha abụọ kwuru bịakwute ezi Chineke.+ Onye ọ bụla Chineke ga-ekwu na ọ bụ onye ajọ omume ga-akwụ onye nke ọzọ ụgwọ ihe ahụ okpukpu abụọ.+ 10  “Ọ bụrụ na mmadụ enye mmadụ ibe ya ịnyịnya ibu ma ọ bụ ehi ma ọ bụ atụrụ ma ọ bụ anụ ụlọ ọ bụla ka o debe, o wee nwụọ ma ọ bụ e merụọ ya ahụ́ ma ọ bụ a kpụrụ ya mgbe ọ na-adịghị onye na-ele anya, 11  onye ahụ e nyere ya ga-eji aha Jehova ṅụọ iyi+ na ya emetụghị ihe mmadụ ibe ya aka;+ onye nwe ya ga-anabata ihe o kwuru, onye nke ọzọ agaghịkwa akwụ ụgwọ ya. 12  Ma ọ bụrụ na e zunaara ya ihe ahụ n’ezie, ọ ga-akwụ onye nwe ya ụgwọ ya.+ 13  Ọ bụrụ n’ezie na ọ bụ anụ ọhịa dọgburu ya,+ ọ ga-eweta ya dị ka ihe àmà.+ Ọ gaghị akwụ ụgwọ ihe ọ bụla anụ ọhịa dọgburu. 14  “Ma ọ bụrụ na mmadụ anata mmadụ ibe ya ihe,+ e wee merụọ ya ahụ́ ma ọ bụ ya anwụọ mgbe ọ na-adịghị n’aka onye nwe ya, ọ ghaghị ịkwụ ụgwọ ya.+ 15  Ọ bụrụ na ọ dị n’aka onye nwe ya, ọ gaghị akwụ ụgwọ ya. Ọ bụrụ na e goro ya ego ịrụ ọrụ, ọ bụ ego ole e goro ya ka a ga-eweta. 16  “Ọ bụrụ na nwoke arata nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke a na-ekwebeghị nkwa ọlụlụ, ya na ya wee dinaa,+ ọ ghaghị ịkwụ ụgwọ isi ya+ wee lụwa ya. 17  Ọ bụrụ na nna ya ajụwaa isi ikenye ya nwa agbọghọ ahụ, ego ọ ga-akwụ ga-abụ ego ole a na-akwụ n’isi nwa agbọghọ na-amaghị nwoke.+ 18  “Ahapụla nwaanyị na-agba afa ndụ.+ 19  “A ghaghị igbu onye ọ bụla ya na anụmanụ dinara.+ 20  “Onye chụụrụ chi ọ bụla àjà ma e wezụga naanị Jehova, a ga-ebibi ya.+ 21  “Emegidela onye mbịarambịa, emegbukwala ya,+ n’ihi na unu ghọrọ ndị mbịarambịa n’ala Ijipt.+ 22  “Unu emekpala nwaanyị di ya nwụrụ ma ọ bụ nwa na-enweghị nna ahụ́.+ 23  Ọ bụrụ na e nwee ka i si mekpaa ya ahụ́, ọ bụrụ na o tikuo m, aghaghị m ịnụ mkpu ákwá ya;+ 24  iwe m ga-adị ọkụ n’ezie,+ m ga-ejikwa mma agha gbuo unu, ndị nwunye unu ga-aghọ ndị inyom di ha nwụrụ, ụmụ unu ga-aghọkwa ụmụ na-enweghị nna.+ 25  “Ọ bụrụ na ị gbazinye otu n’ime ndị m ego, bụ́ onye nọ n’ahụhụ,+ nke bi gị nso, abụrụla ya onye na-anara ọmụrụ nwa. Unu anala ya ọmụrụ nwa.+ 26  “Ọ bụrụ na e nwee ka i si chịrị uwe mmadụ ibe gị dị ka ihe ibé,+ ị ga-achịghachiri ya uwe ahụ mgbe anyanwụ dara. 27  N’ihi na ọ bụ naanị ákwà mgbokwasị o nwere.+ Ọ bụ ákwà o ji ekpuchi akpụkpọ ahụ́ ya. Gịnị ka ọ ga-eyi dinara ala? Ọ ga-erukwa na ọ ga-etiku m, m ga-anụkwa, n’ihi na m na-eme amara.+ 28  “Akọchala Chineke,+ abụkwala onyeisi n’etiti ndị gị ọnụ.+ 29  “Ejila obi abụọ enye ihe ubi gị mepụtara n’ụba n’onyinye nakwa mmanya na-agbapụta n’ụba n’ebe nzọchapụta mmanya gị.+ Ị ga-enye m nwa nwoke mbụ n’ime ụmụ gị.+ 30  Otú a ka ị ga-eme ehi gị na atụrụ gị:+ Ya na nne ya ga-anọ ruo ụbọchị asaa.+ N’ụbọchị nke asatọ, ị ga-enye m ya. 31  “Unu ga-abụrụ m ndị dị nsọ;+ unu erila anụ dị n’ọhịa nke anụ ọhịa dọgburu adọgbu.+ Unu ga-atụpụrụ ya nkịta.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.