Ọpụpụ 21:1-36

21  “Ndị a bụ mkpebi ikpe ị ga-atọgbọ n’ihu ha:+  “Ọ bụrụ na ị zụta ohu bụ́ onye Hibru,+ ọ ga-abụ ohu ruo afọ isii, ma n’afọ nke asaa, ọ ga-alawa dị ka onye nweere onwe ya n’akwụghị ụgwọ ọ bụla.+  Ọ bụrụ na ọ bịara naanị ya, ọ bụ naanị ya ga-ala. Ọ bụrụ na ọ lụrụ nwaanyị, nwunye ya ga-eso ya laa.  Ọ bụrụ na nna ya ukwu alụnye ya nwaanyị, o wee mụọrọ ya ụmụ ndị ikom ma ọ bụ ụmụ ndị inyom, nwunye ya na ụmụ ya ga-aghọ nke nna ya ukwu,+ naanị ya ga-ala.+  Ma ọ bụrụ na ohu ahụ esie ọnwụ, sị, ‘Ahụrụ m nna m ukwu, nwunye m na ụmụ m n’anya; achọghị m ịla dị ka onye nweere onwe ya,’+  mgbe ahụ, nna ya ukwu ga-akpọrọ ya bịa nso n’ebe ezi Chineke nọ ma kpọgote ya n’ọnụ ụzọ ma ọ bụ n’awara ụzọ; nna ya ukwu ga-eji ahà hapuo ya ntị, ọ ga-abụkwa ohu ya ruo mgbe a na-akaghị aka.+  “Ọ bụrụkwa na nwoke eree nwa ya nwaanyị ka ọ bụrụ ohu nwaanyị,+ ọ bụghị otú ụmụ nwoke bụ́ ohu si ala ka ọ ga-esi laa.  Ọ bụrụ na ihe ya adịghị nna ya ukwu mma nke mere na o jighị ya mere iko nwaanyị,+ kama nke ahụ, o wee mee ka onye ọzọ gbara ya, ọ gaghị enwe ikike iresị ya ndị mba ọzọ n’ihi na ọ ghọrọ nwaanyị ahụ aghụghọ.  Ọ bụrụkwa na ọ bụ nwa ya nwoke ka ọ kpọnyere ya, ọ ga-emere ya ihe a na-emere ụmụ nwaanyị.+ 10  Ọ bụrụ na ọ lụọ nwaanyị ọzọ, a gaghị eme ka ihe oriri ya na ákwà ya belata,+ ọ gaghịkwa akwụsịlata inye ya ihe ruuru ya dị ka nwaanyị a lụ alụ.+ 11  Ọ bụrụ na ọ gaghị emere ya ihe atọ a, ọ ga-alawara onwe ya, n’akwụghị ego ọ bụla. 12  “Onye ọ bụla kụgburu mmadụ, a ghaghị igbu ya.+ 13  Ma ọ bụrụ na mmadụ echechighị ibe ya echechi ma ezi Chineke ekwe ka o menahụ ya,+ m ga-ahọpụtara gị ebe o nwere ike ịgbaga.+ 14  Ọ bụrụ na mmadụ eweso mmadụ ibe ya iwe nke na o ji aghụghọ gbuo ya,+ ị ga-esi ọbụna n’ebe ịchụàjà m kpọpụta ya ka ọ nwụọ.+ 15  Onye tiri nna ya na nne ya ihe, a ghaghị igbu ya.+ 16  “Onye tọọrọ mmadụ,+ nke rere ya ere+ ma ọ bụ onye a chọtara ya n’aka ya, a ghaghị igbu ya.+ 17  “Onye duru nna ya na nne ya ikwu, a ghaghị igbu ya.+ 18  “Ọ bụrụ na ụmụ nwoke esewe okwu, otu onye atụọ ibe ya nkume ma ọ bụ kụọ ya ọ́gụ̀, ma ọ nwụghị, kama ya edinara n’ihe ndina ya; 19  ọ bụrụ na o bilie jiri mkpara gagharịwa n’èzí, a gaghị enye onye ahụ tụrụ ya nkume ma ọ bụ kụọ ya ọ́gụ̀ ntaramahụhụ; ọ ga-akwụ ụgwọ naanị maka oge onye ahụ na-arụghị ọrụ ruo mgbe ọ gwọtachara ya. 20  “Ọ bụrụ na mmadụ ewere osisi tie+ ohu ya nwoke ma ọ bụ ohu ya nwaanyị, onye ahụ ewee nwụọ n’aka ya, a ghaghị ịbọrọ ohu ahụ ọbọ.+ 21  Ma ọ bụrụ na ọ nọruo otu ụbọchị ma ọ bụ ụbọchị abụọ, a gaghị abọrọ ya ọbọ, n’ihi na onye ahụ bụ ego ya. 22  “Ọ bụrụ na mmadụ abụọ na-alụ ọgụ, ha ewee merụọ nwaanyị dị ime ahụ́, nwa ya+ ewee pụta ma mmadụ anwụghị n’ihe mberede a, a ghaghị iri ya iwu dị ka ihe onye lụ nwaanyị ahụ gwara ya si dị; ọ ga-akwụkwa ya site n’aka ndị ikpe.+ 23  Ma ọ bụrụ na mmadụ anwụọ n’ihe mberede a, ị ga-eme ka mkpụrụ obi laara mkpụrụ obi,+ 24  anya ga-alara anya, ezé ga-alara ezé, aka ga-alara aka, ụkwụ ga-alara ụkwụ,+ 25  ịda ọkụ ga-alara ịda ọkụ, ọnyá ga-alara ọnyá, ọkpọ ga-alara ọkpọ.+ 26  “Ọ bụrụ na mmadụ akụọ ohu ya nwoke ma ọ bụ ohu ya nwaanyị ihe n’anya wee kụkpọọ ya anya, ọ ga-ahapụ ya ka ọ bụrụ onye nweere onwe ya iji kwụọ ya ụgwọ maka anya ya.+ 27  Ọ bụrụ na ọ bụ ezé ohu ya nwoke ma ọ bụ ezé ohu ya nwaanyị ka ọ kụpụrụ, ọ ga-ahapụ ya ka ọ laa wee bụrụ onye nweere onwe ya iji kwụọ ya ụgwọ maka ezé ya. 28  “Ọ bụrụ na ehi asọọ nwoke ma ọ bụ nwaanyị mpi, onye ahụ anwụọ, a ghaghị iji nkume tụgbuo ehi ahụ,+ ma a gaghị eri anụ ya eri; a gaghị enye onye nwe ehi ahụ ntaramahụhụ. 29  Ma ọ bụrụ na ehi ahụ na-asọbu mpi, a dọọ onye nwe ya aka ná ntị ma ọ naghị eche ya nche, o wee gbuo nwoke ma ọ bụ nwaanyị, a ga-eji nkume tụgbuo ehi ahụ, a ga-egbukwa onye nwe ya. 30  Ọ bụrụ na a ga-amanye ya ịkwụ ihe mgbapụta, ọ ga-akwụ ụgwọ ọ ga-eji gbapụta mkpụrụ obi ya dị ka ihe niile a ga-amanye ya ka ọ kwụọ si dị.+ 31  Ma ọ̀ bụ nwa nwoke ma ọ bụ nwa nwaanyị ka ọ sọrọ mpi, a ga-eme ya dị ka mkpebi ikpe a si dị.+ 32  Ọ bụrụ ohu nwoke ma ọ bụ ohu nwaanyị ka ehi ahụ sọrọ mpi, ọ ga-akwụ nna ya ukwu shekel iri atọ,+ a ga-ejikwa nkume tụgbuo ehi ahụ. 33  “Ọ bụrụ na mmadụ emeghee olulu, ma ọ bụ ọ bụrụ na mmadụ egwuo olulu ma o kpuchighị ya ihe, ehi ma ọ bụ ịnyịnya ibu ewee daba n’ime ya,+ 34  onye nwe olulu ahụ ga-akwụ ụgwọ ya.+ Ọ ga-akwụ onye nwe anụmanụ ahụ ego ole o ruru, anụmanụ ahụ nwụrụ anwụ ga-aghọkwa nke ya. 35  Ọ bụrụ na ehi mmadụ emerụọ ehi onye ọzọ ahụ́, o wee nwụọ, ha ga-ere ehi ahụ dị ndụ wee kee ego e retere na ya; ha ga-ekekwa nke ahụ nwụrụ anwụ.+ 36  Ma ọ bụ, ọ bụrụ na a maara na ehi ahụ na-asọbu mpi ma onye nwe ya adịghị eche ya nche,+ ọ ghaghị iji ehi kwụọ ụgwọ ehi,+ nke ahụ nwụrụ anwụ ga-aghọkwa nke ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji