Ọpụpụ 2:1-25
2 N’ime oge a, otu nwoke nke si n’ụlọ Livaị gara lụrụ nwaanyị si n’ebo Livaị.+
2 Nwaanyị ahụ wee tụrụ ime mụọ nwa nwoke. Mgbe ọ hụrụ otú nwa ahụ si maa mma, o zoro+ ya ruo ọnwa atọ.+
3 Mgbe ọ na-enwekwaghị ike izo ya,+ o wetara nkata e ji ahịhịa papaịrọs kpaa ma were bitumen na korota+ techie ya wee kuba nwa ahụ n’ime ya, dọba ya n’etiti ahịhịa amị+ n’akụkụ osimiri Naịl.
4 Nwanne ya nwaanyị guzokwara n’ebe dịtụ anya ka o wee mara ihe ga-eme ya.+
5 Mgbe nwa oge gasịrị, ada Fero gbadatara ịsa ahụ́ n’Osimiri Naịl, ụmụ nwaanyị na-ejere ya ozi nọkwa na-agagharị n’akụkụ Osimiri Naịl. O wee hụ nkata ahụ n’etiti ahịhịa amị ahụ. O wee ziga ohu ya nwaanyị ozugbo ka o bute ya.+
6 Mgbe o meghere ya, ọ hụrụ nwa ahụ, ma, lee, nwata ahụ nọ na-akwa ákwá. O wee nweere ya ọmịiko,+ ọ bụ ezie na ọ sịrị: “Nwa a bụ otu n’ime ụmụ ndị Hibru.”
7 Mgbe ahụ, nwanne ya nwaanyị gwara ada Fero, sị: “Ọ̀ bụ m gaa kpọọrọ gị nwaanyị na-enye nwa ara bụ́ otu n’ime ndị inyom Hibru ka o nyere gị nwa a ara?”
8 Ada Fero wee sị ya: “Gaa!” Ozugbo ahụ, nwa agbọghọ ahụ gara kpọọ nne nwata ahụ.+
9 Ada Fero wee sị ya: “Kuru nwa a, nyewere m ya ara, mụ onwe m ga-akwụkwa gị ụgwọ.”+ Nwaanyị ahụ wee kuru nwa ahụ wee na-enye ya ara.
10 Nwa ahụ wee tolite. O wee kpọrọ ya kpọgara ada Fero, nke mere na ọ ghọrọ nwa ya;+ o wee gụọ ya Mozis wee sị: “Ọ bụ n’ihi na m si na mmiri kupụta ya.”+
11 O wee ruo n’oge ahụ, ka Mozis dịwara ike, na ọ pụrụ gakwuru ụmụnne ya ka ọ hụ ibu arọ ha na-ebu;+ o wee hụ otu onye Ijipt ka ọ na-eti onye Hibru bụ́ otu n’ime ụmụnne ya ihe.+
12 O wee lee anya n’otu akụkụ, lee anya n’akụkụ nke ọzọ, ma ọ dịghị onye ọ hụrụ. O wee kụgbuo onye Ijipt ahụ ma zoo ya n’ime ájá.+
13 Otú ọ dị, ọ pụrụ n’echi ya, ma, lee, e nwere ndị Hibru abụọ nọ na-alụ ọgụ. O wee gwa onye nke mejọrọ ibe ya, sị: “Gịnị mere i ji tie nwanne gị ihe?”+
14 O wee sị: “Ònye mere gị onye na-achị anyị na onyeikpe anyị?+ Ị̀ chọrọ igbu m dị ka i gburu onye Ijipt ahụ?”+ Egwu wee tụwa Mozis, o wee sị: “N’ezie, a matawo ihe a!”+
15 E mesịa, Fero nụrụ banyere ihe a, o wee nwaa igbu Mozis;+ ma Mozis si n’ebe Fero nọ gbaa ọsọ+ ka o wee biri n’ala Midian;+ o wee nọdụ ọdụ n’akụkụ otu olulu mmiri.
16 Onye nchụàjà+ Midian nwere ụmụ nwaanyị asaa, dịkwa ka ha na-eme, ha bịara sere mmiri gbajuo ihe mmiri ka ìgwè ewu na atụrụ nna ha wee ṅụọ mmiri.+
17 Dịkwa ka ha na-eme, ndị na-azụ atụrụ bịara chụpụ ha. Mozis wee bilie nyere ndị inyom ahụ aka wee nye ìgwè ewu na atụrụ ha mmiri.+
18 Ya mere, mgbe ha lọtara bịakwute Ruel+ nna ha, o tiri mkpu, sị: “Olee otú unu si lọta nnọọ ọsọ ọsọ taa?”
19 Ha wee sị: “Otu onye Ijipt+ napụtara anyị n’aka ndị ọzụzụ atụrụ ahụ, o sepụtakwaara anyị mmiri ka o wee nye ìgwè ewu na atụrụ anyị mmiri.”
20 O wee sị ụmụ ya ndị inyom: “Oleekwanụ ebe ọ nọ? Gịnị mere unu ji hapụ nwoke ahụ? Gaanụ kpọọ ya, ka o rie ihe oriri.”+
21 E mesịa, Mozis gosiri mmasị ibinyere nwoke ahụ, o wee kpọnye Mozis Zipora+ nwa ya nwaanyị.
22 E mesịa, ọ mụrụ nwa nwoke, o wee gụọ ya Geshọm,+ n’ihi na, o kwuru, sị: “Abụ m onye mbịarambịa n’ala ọzọ.”+
23 O wee ruo n’ime ogologo oge ahụ na eze Ijipt mesịrị nwụọ,+ ma ụmụ Izrel nọ na-asụ ude n’ihi ohu ha na-agba, ha kwakwara ákwá mkpesa,+ mkpu enyemaka ha na-eti nọ na-arịgokwuru ezi Chineke n’ihi ohu ha na-agba.+
24 Ka oge na-aga, Chineke nụrụ+ ude ha na-asụ,+ Chineke wee cheta ọgbụgba ndụ ya na Ebreham, Aịzik na Jekọb.+
25 Chineke wee na-ele ụmụ Izrel anya, Chineke wee rịba ama.