Ọpụpụ 18:1-27
18 Jetro onye nchụàjà Midian, nna nwunye Mozis,+ wee nụ banyere ihe niile Chineke meere Mozis, meekwara ndị ya Izrel, otú Jehova si kpọpụta Izrel n’Ijipt.
2 Jetro, nna nwunye Mozis, kpọọrọ Zipora, nwunye Mozis, mgbe e zilasịrị ya,
3 tinyere ụmụ ya ndị ikom abụọ,+ aha otu n’ime ha bụ Geshọm,+ “n’ihi na aghọwo m onye mbịarambịa ná mba ọzọ,” ka ọ sịrị;
4 aha onye nke ọzọ abụrụ Elịiza,+ “n’ihi na Chineke nke nna m bụ onye na-enyere m aka n’ihi na ọ napụtara m ná mma agha Fero,” dị ka o si kwuo.+
5 Jetro, nna nwunye Mozis, na ụmụ ya ndị ikom na nwunye ya wee bịakwute Mozis n’ala ịkpa n’ebe ọ mara ụlọikwuu, n’ugwu nke ezi Chineke.+
6 O wee zie Mozis ozi, sị: “Mụ onwe m Jetro,+ nna nwunye gị, abịakwutewo gị, mụ na nwunye gị na ụmụ ya abụọ.”
7 Ozugbo ahụ, Mozis gara izute nna nwunye ya, o wee daara ya n’ala, susuokwa ya ọnụ;+ onye nke ọ bụla n’ime ha wee malite ịjụ otú ibe ya mere. E mesịa, ha banyere n’ụlọikwuu ahụ.
8 Mozis wee kọọrọ nna nwunye ya ihe niile Jehova mere Fero na Ijipt n’ihi Izrel,+ nakwa ihe isi ike dakwasịrị ha n’ụzọ,+ ma n’agbanyeghị ya Jehova nọ na-anapụta ha.+
9 Jetro wee ṅụrịa ọṅụ maka ihe ọma niile Jehova meere Izrel n’ihi na ọ napụtawo ha n’aka Ijipt.+
10 N’ihi ya, Jetro sịrị: “Ka Jehova bụrụ onye a gọziri agọzi, bụ́ onye napụtara unu n’aka Ijipt nakwa n’aka Fero, onye napụtakwara ụmụ Izrel n’aka Ijipt.+
11 Ugbu a, eji m ihe a merenụ, mgbe ndị Ijipt ji mpako meso ha omume, mara na Jehova dị ukwuu karịa chi niile ọzọ.”+
12 Jetro, nna nwunye Mozis, chụụrụ Chineke àjà nsure ọkụ na àjà nkịtị;+ Erọn na ndị okenye niile nke Izrel bịara soro nna nwunye Mozis rie ihe, n’ihu ezi Chineke.+
13 O wee ruo n’echi ya na Mozis nọdụrụ ala dị ka ọ na-eme ka ọ kpee ndị Izrel ikpe,+ ha wee guzoro n’ihu Mozis malite n’ụtụtụ ruo ná mgbede.
14 Nna nwunye Mozis wee hụ ihe niile ọ nọ na-emere ha. O wee sị: “Ihe a ị na-emere ndị a bụ gịnị? Gịnị mere naanị gị ji nọdụ ọdụ, mmadụ niile eguzoro n’ihu gị malite n’ụtụtụ ruo ná mgbede?”
15 Mozis wee gwa nna nwunye ya, sị: “Ọ bụ n’ihi na ha na-abịakwute m ịjụ Chineke ase.+
16 Ọ bụrụ na ha nwee okwu ikpe,+ a na-ewere ya bịakwute m, m na-ekpekwa ikpe n’etiti otu onye na ibe ya, m na-emekwa ka a mara ihe bụ́ mkpebi ikpe Chineke na iwu ya.”+
17 Nna nwunye Mozis wee gwa ya, sị: “Otú a ị na-eme adịghị mma.
18 N’ezie, ike ga-agwụ gị, ma gị ma ndị a gị na ha nọ, n’ihi na ọrụ a karịrị gị.+ I nweghị ike ịrụ ya naanị gị.+
19 Ugbu a, gee ntị n’olu m.+ M ga-enye gị ndụmọdụ, Chineke ga-anọnyekwara gị. Gị onwe gị bụrụ onye nnọchiteanya nke ndị a n’ihu ezi Chineke,+ gị onwe gị kwa ga na-ewetara ezi Chineke okwu ikpe.+
20 Ị ga na-adọ ha aka ná ntị banyere ihe ndị bụ́ ụkpụrụ na iwu e nyere,+ ị ga-emekwa ka ha mara ụzọ ha ga na-eje ije na ya na ọrụ ha ga na-arụ.+
21 Ma gị onwe gị ga-esi n’etiti ndị Izrel niile họpụta ndị ikom ruru eru,+ ndị na-atụ egwu Chineke,+ ndị ikom a pụrụ ịtụkwasị obi,+ ndị kpọrọ uru na-ezighị ezi asị;+ ị ga-emekwa ka ha bụrụ ndị isi nke otu puku otu puku mmadụ,+ na ndị isi nke otu narị otu narị mmadụ, ndị isi nke iri mmadụ ise iri mmadụ ise na ndị isi nke mmadụ iri mmadụ iri.+
22 Ha ga na-ekpe ndị Izrel ikpe n’oge ọ bụla kwesịrị ekwesị; ha ga na-ewetara gị ikpe ọ bụla dị ukwuu,+ ma ha onwe ha ga na-ekpe ikpe ọ bụla dị nta. Ya mere, mee ka ihe dịkwuoro gị mfe, ha ga-esokwa gị na-ebu ibu a.+
23 Ọ bụrụ na i mee ihe a, Chineke enyewokwa gị ya n’iwu, ị ga-enwe ike ịnagide ya, ndị a niile ga-alaru n’ụlọ ha n’udo.”+
24 Ngwa ngwa, Mozis gere ntị n’olu nna nwunye ya wee mee ihe niile o kwuru.+
25 Mozis wee họpụta ndị ikom ruru eru n’etiti Izrel dum wee mee ha ndị isi nke ndị Izrel,+ dị ka ndị isi nke otu puku otu puku mmadụ, ndị isi nke otu narị otu narị mmadụ, ndị isi nke iri mmadụ ise iri mmadụ ise na ndị isi nke mmadụ iri mmadụ iri.
26 Ha wee na-ekpe ụmụ Izrel ikpe n’oge ọ bụla kwesịrị ekwesị. Ha na-ewetara Mozis okwu ikpe tara akpụ,+ ma ha onwe ha na-ekpe ikpe ọ bụla dị nta.
27 E mesịa, Mozis dupụrụ nna nwunye ya,+ o wee lawa n’ala ya.