Ọpụpụ 15:1-27

15  N’oge ahụ, Mozis na ụmụ Izrel bụkuru Jehova abụ a, sị:+“Ka m bụkuo Jehova abụ, n’ihi na e buliwo ya elu nke ukwuu.+Ịnyịnya na onye na-agba ya ka ọ tụbaworo n’oké osimiri.+   Ike m na ume m ka Jaa bụ,+ ebe ọ bụụrụ m nzọpụta.+Onye a bụ Chineke m, m ga-etokwa ya;+ Chineke nke nna m,+ m ga-ebulikwa ya elu.+   Jehova bụ dike n’agha.+ Jehova bụ aha ya.+   Ụgbọ ịnyịnya Fero na ìgwè ndị agha ya ka ọ tụbaworo n’oké osimiri,+E mewo ka ndị agha ya a họrọ ahọ mie n’Oké Osimiri Uhie.+   Mmiri nke na-ekwo ekwo wee kpuchie ha; ha wee dakpuo n’ogbu mmiri dị ka nkume.+   Jehova, aka nri gị dị ike nke ukwuu,+Jehova, aka nri gị pụrụ ịkụri onye iro.+   N’ihi ịdị ukwuu gị, ị pụrụ ịkwatu ndị na-ebili megide gị;+Ị na-ezipụ iwe gị dị ọkụ, ya erepịa ha dị ka ahịhịa ọka.+   Ume si n’oghere imi+ gị mere ka mmiri guzoro dị ka mgbidi;O guzoro otu ebe dị ka mmiri e gbochiri egbochi;Mmiri nke na-ekwo ekwo kpụkọrọ n’etiti oké osimiri.   Onye iro sịrị, ‘M ga-achụwa ha!+ M ga-achụkwuru ha!+M ga na-eke ihe nkwata+ ruo mgbe afọ juru mkpụrụ obi m!M ga-amịpụta mma agha m! Aka m ga-akpụrụ ha pụọ!’+ 10  I kupụrụ ume gị,+ oké osimiri wee kpuchie ha;+Ha miri dị ka opu n’ime nnukwu mmiri.+ 11  Jehova, ònye n’ime chi niile dị ka gị?+Ònye dị ka gị, gị onye dị nsọ nke ukwuu?+Onye a ga-eji abụ otuto+ tụọ egwu ya,+ Onye na-eme ihe dị ịtụnanya.+ 12  I setịrị aka nri gị,+ ala wee loo ha.+ 13  Gị onwe gị ejiriwo obiọma* gị duo ndị ị gbapụtara;+Gị onwe gị ga-eji ike gị duru ha gaa n’ebe obibi gị dị nsọ.+ 14  Ndị dị iche iche ga-anụ ya,+ ha ga-ama jijiji;+Ime+ ga-eme ndị bi na Filistia. 15  N’oge ahụ, ụjọ ga-ejide ndị isi Idọm;Ndị ọchịchị Moab ga-amakwa jijiji.+N’ezie, obi ga-alọ ndị niile bi na Kenan mmiri. 16  Egwu na ụjọ ga-ejide ha.+N’ihi otú ogwe aka gị si dị ukwuu, ha ga-edere duu dị ka nkume,Ruo mgbe ndị gị+ gafeere, Jehova,Ruo mgbe ndị i kere+ gafeere.+ 17  Ị ga-akpọrọ ha ma kụọ ha dị ka osisi n’ugwu nke bụ́ ihe nketa gị,+Ebe guzosiri ike nke ị kwadebeworo ka i biri na ya,+ Jehova,Ebe nsọ+ nke aka gị guzobere, Jehova. 18  Jehova ga-achị dị ka eze ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.+ 19  Mgbe ịnyịnya Fero+ na ụgbọ agha ya na ndị ịnyịnya ya banyere n’ime oké osimiri ahụ,Jehova mere ka mmiri nke oké osimiri ahụ laghachite kpuchie ha,+Ma ụmụ Izrel jere ije n’ala akọrọ n’etiti oké osimiri ahụ.”+ 20  Miriam onye amụma nwaanyị, nwanne Erọn,+ wee were obere ịgbà;+ ndị inyom niile wee soro ya na-apụ, jiri obere ịgbà na-agba egwú.+ 21  Miriam wee na-abụrụ ndị ikom abụ, sị:+ “Bụkuonụ Jehova abụ,+ n’ihi na e buliwo ya elu nke ukwuu.+Ịnyịnya na onye na-agba ya ka ọ tụbaworo n’oké osimiri.”+ 22  E mesịa, Mozis mere ka Izrel si n’Oké Osimiri Uhie pụọ, ha wee banye n’ala ịkpa Shọọ+ ma gaa ije n’ala ịkpa ahụ ruo ụbọchị atọ, ma ha ahụghị mmiri.+ 23  Ka oge na-aga ha bịaruru Mera,+ ma ha enweghị ike ịṅụ mmiri dị na Mera n’ihi na ọ na-elu ilu. Ọ bụ ya mere o ji kpọọ ya Mera.+ 24  Ha wee malite ịtamu ntamu megide Mozis,+ sị: “Gịnị ka anyị ga-aṅụ?” 25  O wee tikuo Jehova.+ Jehova wee gosi ya otu osisi, o wee tụba ya n’ime mmiri ahụ, mmiri ahụ wee dị ụtọ.+ N’ebe ahụ ka O mere ka ha nwee ụkpụrụ na usoro maka ikpe ikpe, n’ebe ahụkwa ka o lere ha ule.+ 26  O wee gaa n’ihu ịsị: “Ọ bụrụ na ị ga-ege nnọọ ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke gị wee mee ihe ziri ezi n’anya ya ma ṅaa ntị n’ezie n’ihe o nyere n’iwu, debekwa ụkpụrụ ya niile,+ agaghị m eme ka otu n’ime ọrịa ndị ahụ m mere ka ha rịa ndị Ijipt+ rịa gị; n’ihi na abụ m Jehova onye na-agwọ gị.”+ 27  E mesịa, ha bịarutere Ilim, bụ́ ebe e nwere isi iyi iri na abụọ na nkwụ iri asaa.+ Ha wee maa ụlọikwuu n’akụkụ mmiri ahụ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”