Ọpụpụ 12:1-51
12 Jehova wee gwa Mozis na Erọn okwu n’ala Ijipt, sị:
2 “Ọnwa a ga-abụrụ unu mbido ọnwa. Ọ ga-abụrụ unu ọnwa mbụ n’afọ.+
3 Gwa nzukọ Izrel dum, sị, ‘N’ụbọchị nke iri n’ọnwa a ka onye ọ bụla n’ime ha ga-ewere otu atụrụ+ maka ụlọ nna nna ya hà, otu atụrụ maka otu ụlọ.
4 Ma ọ bụrụ na ezinụlọ ya agaghị erichali otu atụrụ maka na ha dị nnọọ nta, ya na onye agbata obi ya ga-ewere ya banye n’ụlọ ya, dabere ná mkpụrụ obi ole ha dị; unu ga-amata ókè onye nke ọ bụla ga-enwe ike iricha iji mata mmadụ ole ha ga-adị.
5 Atụrụ unu ga-ewere ga-abụ nke ahụ́ dị mma,+ oké, nke gbara otu afọ.+ Unu nwere ike isi n’ụmụ ebule ma ọ bụ ewu họrọ ya.
6 Unu ga-echedo ya ruo n’ụbọchị nke iri na anọ n’ọnwa a,+ ọgbakọ dum nke nzukọ Izrel ga-egbu ya ná mgbede.+
7 Ha ga-eweretụ ọbara ya fesa n’awara ụzọ ha abụọ nakwa n’elu ọnụ ụzọ ụlọ ndị ha ga-anọ rie ya.+
8 “Ha ga-eri anụ ya n’abalị a.+ Ha ga-ahụ ya n’ọkụ wee rie ya na achịcha na-ekoghị eko,+ tinyere akwụkwọ nri na-elu ilu.+
9 Erila nke ọ bụla n’ime ya ná ndụ, esila ya esi, ejila mmiri sie ya, kama hụọ ya n’ọkụ, ma isi ya ma ụkwụ ya ma ihe dị n’afọ ya.
10 Unu ahapụla nke ọ bụla n’ime ya ka ọ fọdụ ruo ụtụtụ, kama, ihe ọ bụla fọdụrụ n’ime ya ruo ụtụtụ, unu ga-akpọ ya ọkụ.+
11 Ọ bụ otú a ka unu ga-esi rie ya, unu ga-eke ihe n’úkwù,+ yiri akpụkpọ ụkwụ+ ma jiri mkpara n’aka; unu ga-erikwa ya ọkụ ọkụ. Ọ bụ ememme ngabiga Jehova.+
12 M ga-agabiga n’ala Ijipt n’abalị+ a wee gbuo nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’ala Ijipt, malite na mmadụ ruo n’anụmanụ;+ m ga-emekwa ihe e kpere n’ikpe n’ahụ́ chi niile nke Ijipt.+ Abụ m Jehova.+
13 Ọbara ahụ ga-abụrụ unu ihe ịrịba ama n’ụlọ unu nọ n’ime ha; m ga-ahụkwa ọbara ahụ wee gafere unu,+ ihe otiti ahụ agaghị adakwasị unu iji bibie unu mgbe m ga-eti ala Ijipt ihe otiti.
14 “‘Ụbọchị a ga-abụrụ unu ihe ncheta, unu ga-eme ya dị ka ememme a ga na-emere Jehova n’ọgbọ unu niile. Unu ga-eme ya ka ọ bụrụ ụkpụrụ na-adịru mgbe a na-akaghị aka.
15 Ụbọchị asaa ka unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko. Ee, n’ụbọchị nke mbụ ka unu ga-ewepụ ihe na-eko achịcha n’ụlọ unu, n’ihi na onye ọ bụla nke riri ihe e tinyere ihe na-eko achịcha, malite n’ụbọchị mbụ ruo n’ụbọchị nke asaa,+ a ga-ebipụ mkpụrụ obi ahụ n’Izrel.+
16 N’ụbọchị nke mbụ, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ, nweekwa mgbakọ dị nsọ n’ụbọchị nke asaa.+ A gaghị arụ ọrụ na ha.+ Ọ bụ naanị ihe dị mkpụrụ obi ọ bụla mkpa iri, naanị ihe ahụ ka a pụrụ ịkwadebere unu.+
17 “‘Unu ga na-eme ememme achịcha na-ekoghị eko,+ n’ihi na ọ bụ n’ụbọchị a ka m ga-akpọpụta unu n’ìgwè n’ala Ijipt. Unu ga na-edebe ụbọchị a n’ọgbọ unu niile ka ọ bụrụ ụkpụrụ na-adịru mgbe a na-akaghị aka.
18 N’ọnwa nke mbụ, n’ụbọchị nke iri na anọ n’ọnwa, ná mgbede ka unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko ruo ná mgbede ụbọchị nke iri abụọ na otu n’ọnwa ahụ.+
19 Ruo ụbọchị asaa, a gaghị ahụ ihe na-eko achịcha n’ụlọ unu, n’ihi na onye ọ bụla detụrụ ihe e tinyere ihe na-eko achịcha ire, ma ọ̀ bụ onye mbịarambịa ma ọ bụ nwa afọ,+ a ga-ebipụ mkpụrụ obi ahụ ná nzukọ Izrel.+
20 Unu erila ihe ọ bụla e tinyere ihe na-eko achịcha. N’ebe obibi unu niile ka unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko.’”
21 Ngwa ngwa ahụ, Mozis kpọrọ ndị okenye niile nke Izrel+ wee gwa ha, sị: “Kpụrụnụ ewu na atụrụ n’ezinụlọ n’ezinụlọ, gbuokwanụ anụ ememme ngabiga.+
22 Unu ga-ewerekwa ùkwù ahịhịa hisop+ bịanye n’ọbara nke dị n’efere wee tee ọbara ahụ dị n’efere ahụ n’elu ọnụ ụzọ unu nakwa n’awara ya abụọ; ọ dịghịkwa onye ọ bụla n’ime unu ga-esi n’ọnụ ụzọ ụlọ ya pụta ruo ụtụtụ.
23 Mgbe Jehova ga-agabiga ịga tie ndị Ijipt ihe otiti wee hụ ọbara ahụ n’elu ọnụ ụzọ nakwa n’awara ya abụọ, Jehova ga-agabiga ọnụ ụzọ ahụ, ọ gaghị ekwe ka mbibi ahụ rute n’ụlọ unu wee tie unu ihe otiti.+
24 “Unu ga-edebekwa ihe a ka ọ bụrụ ụkpụrụ+ dịịrị unu na ụmụ unu ruo mgbe a na-akaghị aka.+
25 Ọ ga-erukwa na mgbe unu batara n’ala ahụ Jehova ga-enye unu, dị nnọọ ka o kwuru, unu ga na-eme ememme a.+
26 Ọ ga-erukwa na mgbe ụmụ unu ga-asị unu, ‘Gịnị ka ememme a unu na-eme pụtara?’+
27 unu ga-asị, ‘Ọ bụ àjà ememme ngabiga nke a na-achụrụ Jehova,+ bụ́ onye gabigara ụlọ ụmụ Izrel n’Ijipt mgbe o tiri ndị Ijipt ihe otiti, ma ọ napụtara ezinụlọ anyị.’”
Ha wee hulata kpọọ isiala.+
28 Ụmụ Izrel wee gaa mee nnọọ dị ka Jehova nyere Mozis na Erọn n’iwu.+ Ha mere nnọọ otú ahụ.
29 O wee ruo n’etiti abalị na Jehova gburu nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’ala Ijipt,+ malite n’ọkpara Fero bụ́ onye nọ ọdụ n’ocheeze ruo n’ọkpara onye a dọtara n’agha nke nọ n’ụlọ mkpọrọ, nakwa nwa anụ ụlọ ọ bụla e bu ụzọ mụọ.+
30 Fero wee bilie n’abalị, ya na ndị niile na-ejere ya ozi na ndị ọzọ niile bụ́ ndị Ijipt; oké mkpu ákwá wee malite ịda n’etiti ndị Ijipt,+ n’ihi na ọ dịghị ụlọ ọ bụla mmadụ na-anwụghị.
31 Ọ kpọrọ+ Mozis na Erọn ozugbo n’abalị ahụ wee sị: “Bilienụ, sinụ n’etiti ndị m pụọ, ma unu ma ụmụ Izrel ndị ọzọ, gaanụ jeere Jehova ozi, dị nnọọ ka unu kwuru.+
32 Chịrịnụ ma ìgwè ewu na atụrụ unu ma ìgwè ehi unu pụwa, dị nnọọ ka unu kwuru.+ Gọziekwanụ m.”
33 Ndị Ijipt wee malite ịchụli ụmụ Izrel iji mee ka ha pụọ n’ala ha ọsọ ọsọ,+ ha sịrị, “n’ihi na anyị anwụọla anwụ!”+
34 N’ihi ya, ha buuru ntụ ọka* ha a gwọrọ agwọ tupu e tinye ya ihe na-eko achịcha n’ubu ha, ya na efere ha ji agwọ achịcha nke ha ji ákwà mgbokwasị ha fụchie.
35 Ụmụ Izrel wee mee ihe Mozis kwuru n’ihi na ha gara na-arịọ ndị Ijipt ihe e ji ọlaọcha mee na ihe e ji ọlaedo mee na ákwà mgbokwasị.+
36 Jehova wee mee ka ndị ya nweta ihu ọma ndị Ijipt,+ nke mere na ha nyere ha ihe ha rịọrọ;+ ha wee gbawa ndị Ijipt aka.+
37 Ụmụ Izrel wee si na Ramesis+ pụọ gawa Sọkọt,+ ha dị narị puku ndị dimkpa isii bụ́ ndị ji ụkwụ aga, ma e wezụga ụmụntakịrị.+
38 Ìgwè mmadụ gwara ọgwa+ sokwa ha gbagoo, tinyere ìgwè atụrụ na ìgwè ehi, bụ́ ìgwè anụ ụlọ bara ụba.
39 Ha wee were ntụ ọka ahụ a gwọrọ agwọ ha si n’Ijipt buru pụta mewe achịcha, bụ́ achịcha na-ekoghị eko, n’ihi na o kobeghị eko, n’ihi na a chụpụrụ ha achụpụ n’Ijipt, ha enweghịkwa ike icheretụ, ha akwadebeghịkwa ihe oriri ọ bụla ha ga-eri.+
40 Ụmụ Izrel, bụ́ ndị biri+ n’Ijipt,+ biri ruo narị afọ anọ na iri atọ.+
41 O wee ruo mgbe narị afọ anọ na iri atọ ahụ gwụchara, o ruru n’ụbọchị a kpọmkwem, na ụsụụ niile nke Jehova si n’ala Ijipt pụọ.+
42 Ọ bụ abalị ememme a na-emere Jehova n’ihi ịkpọpụta ha n’ala Ijipt. Abalị a ga-abụrụ ụmụ Izrel niile abalị ememme a ga na-emere Jehova ruo ọgbọ ha niile.+
43 Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis na Erọn, sị: “Nke a bụ ụkpụrụ ga na-achị ememme ngabiga a:+ Ọ dịghị onye mba ọzọ ga-eri ya.+
44 Ma n’ebe e nwere ohu nwoke nke e ji ego zụta, bie ya úgwù.+ E bichaa ya úgwù, o nwere ike iso rie ya.
45 Onye ọbịa na onye ọrụ e goro ego agaghị eri ya.
46 Ọ bụ n’otu ụlọ ka a ga-eri ya. Esila n’ụlọ were anụ ya ọ bụla pụọ n’èzí. Agbajikwala ọkpụkpụ ya ọ bụla.+
47 Nzukọ Izrel dum ga-eme ememme a.+
48 Ọ bụrụ na onye mbịarambịa bi n’ụlọ gị dị ka ọbịa, o wee bụrụ na ọ ga-emere Jehova ememme ngabiga ahụ, ka e bie nwoke ọ bụla bụ́ nke ya úgwù.+ E bichaa ya úgwù, ọ pụrụ ịbịa nso ime ememme a; ọ ga-adịkwa ka nwa afọ. Ma ọ dịghị nwoke a na-ebighị úgwù ga-eri ya.
49 Otu iwu ga-adịrị nwa afọ, dịkwara onye mbịarambịa nke bi n’etiti unu dị ka ọbịa.”+
50 Ụmụ Izrel niile wee mee nnọọ dị ka Jehova nyere Mozis na Erọn n’iwu. Ha mere nnọọ otú ahụ.+
51 O wee ruo n’ụbọchị a na Jehova kpọpụtara ụmụ Izrel na ụsụụ+ ha n’ala Ijipt.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.