Ọpụpụ 10:1-29
10 Jehova wee gwa Mozis, sị: “Bakwuru Fero, n’ihi na mụ onwe m ekwewo ka obi ya na obi ndị na-ejere ya ozi kpọchie,+ ka m wee mee ihe ịrịba ama m ndị a kpọmkwem n’ihu ya,+
2 ka i wee kpọsaa ná ntị nwa gị na nke nwa nwa gị otú m si mesie Ijipt ike nakwa ihe ịrịba ama m mere n’etiti ha;+ unu ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.”+
3 Mozis na Erọn wee bakwuru Fero wee sị ya: “Nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke ndị Hibru kwuru, ‘Ruo ole mgbe ka ị ga na-ajụ ido onwe gị n’okpuru m?+ Hapụ ndị m ka ha gaa jeere m ozi.
4 N’ihi na ọ bụrụ na ị na-ajụ ịhapụ ndị m, lee, m ga-eme ka igurube bịa n’ókèala gị echi.+
5 Ha ga-ekpuchi elu ala, a gaghịkwa enwe ike ịhụ ala anya; ha ga-erichapụ nnọọ ihe fọdụrụ, bụ́ ihe akụ́ mmiri ígwé mebifọọrọ unu, ha ga-erichapụ osisi unu ọ bụla nke puru n’ala.+
6 Ha ga-ejupụta n’ụlọ gị na n’ụlọ ndị niile na-ejere gị ozi na n’ụlọ ndị Ijipt niile ruo n’ókè nke nna gị hà na nna nna gị hà na-ahụtụbeghị malite n’ụbọchị ha dịwara ndụ n’elu ala ruo taa.’”+ O wee tụgharịa si n’ebe Fero nọ pụọ.+
7 E mesịa, ndị na-ejere Fero ozi gwara ya, sị: “Ruo ole mgbe ka nwoke a ga na-abụrụ anyị ọnyà?+ Hapụ ndị a ka ha gaa jeere Jehova bụ́ Chineke ha ozi. Ị̀ matabeghị na Ijipt alawo n’iyi?”+
8 Ya mere, a kpọghachiri Mozis na Erọn n’ebe Fero nọ, o wee sị ha: “Gawanụ jeere Jehova bụ́ Chineke unu ozi.+ Olee ndị kpọmkwem ga-aga?”
9 Mozis wee sị: “Anyị na ụmụntakịrị anyị na ndị agadi anyị ga-aga. Anyị na ụmụ anyị ndị ikom na ụmụ anyị ndị inyom,+ na atụrụ anyị na ehi anyị ga-aga,+ n’ihi na anyị nwere ememme anyị ga-emere Jehova.”+
10 O wee gwa ha, sị: “Ya bụrụkwa na Jehova ga-anọnyere unu mgbe m ga-ahapụ unu na ụmụntakịrị unu!+ Ee e, n’ezie, unu bu ihe ọjọọ n’obi.+
11 Ọ gaghị adị otú ahụ! Biko, gaanụ, unu ndị dimkpa, jeere Jehova ozi, n’ihi na ọ bụ ya bụ ihe unu chọrọ ka e meere unu.” E wee chụpụ ha n’ihu Fero.+
12 Jehova wee gwa Mozis, sị: “Setịa+ aka gị n’ala Ijipt ka igurube bịa, ka ha bịa n’ala Ijipt wee richapụ ahịhịa ndụ niile nke ala a, ihe ọ bụla akụ́ mmiri ígwé ahụ mebifọrọ.”+
13 Ozugbo ahụ, Mozis setịrị mkpara ya n’ala Ijipt, Jehova wee mee ka ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ+ fee n’ala ahụ n’ụbọchị ahụ dum nakwa n’abalị ahụ dum. Chi wee bọọ, ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ wee bute igurube.
14 Igurube wee malite ifebata n’ala Ijipt dum wee jupụta n’ókèala Ijipt dum.+ Ha nyere oké nsogbu.+ Tupu ha abịa, e nwetụbeghị igurube bịara otú a ha ji bịa, ọ dịghịkwa mgbe a ga-enwe nke ọ bụla ga-abịa otú a mgbe ha lasịrị.
15 Ha wee kpuchie elu ala ahụ dum,+ ọchịchịrị wee gbaa n’ala ahụ;+ ha wee richapụ ahịhịa ndụ niile dị n’ala ahụ na mkpụrụ niile dị n’osisi bụ́ ndị akụ́ mmiri ígwé ahụ na-emebighị;+ ọ dịghịkwa ihe ọ bụla na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ fọdụrụ n’elu osisi ma ọ bụ n’ahịhịa dị n’ọhịa n’ala Ijipt dum.+
16 Fero wee kpọọ Mozis na Erọn ọsọ ọsọ wee sị: “Emehiewo m megide Jehova bụ́ Chineke unu, megidekwa unu onwe unu.+
17 Ugbu a, biko, gbagharanụ+ m mmehie m naanị otu ugboro a ma rịọsierenụ+ m Jehova bụ́ Chineke unu arịrịọ ike ka o wepụrụ m ihe otiti a na-akpata ọnwụ.”
18 O wee si n’ebe Fero nọ pụọ ma rịọsie Jehova arịrịọ ike.+
19 Jehova wee mee ka e nwee oké ifufe nke si n’ebe ọdịda anyanwụ, o wee bupụ igurube ndị ahụ ma buba ha n’Oké Osimiri Uhie. Ọ dịghịkwa otu igurube a hapụrụ n’ókèala Ijipt dum.
20 Otú ọ dị, Jehova kwere ka obi Fero kpọchie,+ ọ hapụghịkwa ụmụ Izrel ka ha laa.
21 Jehova wee sị Mozis: “Setịa aka gị chee n’eluigwe,+ ka ọchịchịrị wee gbaa n’ala Ijipt, ka ọchịchịrị ahụ wee ruo ha n’ahụ́.”
22 Mozis setịrị aka ya ozugbo chee n’eluigwe, oké ọchịchịrị wee malite ịgbachi n’ala Ijipt dum ruo ụbọchị atọ.+
23 Ha ahụghị ibe ha anya, ọ dịghịkwa otu n’ime ha biliri n’ebe obibi ya ruo ụbọchị atọ; ma ụmụ Izrel niile nwere ìhè n’ebe obibi ha.+
24 E mesịa Fero kpọrọ Mozis wee sị: “Gawanụ jeere Jehova ozi.+ Ma a gaghị ahapụrụ unu atụrụ unu na ehi unu. Ụmụntakịrị unu nwekwara ike iso unu gaa.”+
25 Ma Mozis sịrị: “Gị onwe gị kwa ga-enye anyị ihe anyị ga-eji chụọ àjà nkịtị na àjà nsure ọkụ, ebe ọ bụ na anyị ga-eji ha chụọrọ Jehova bụ́ Chineke anyị àjà.+
26 Anyị ga-achịrịkwa anụ ụlọ anyị gaa.+ A gaghị ahapụ ọbụna otu akpụkpọ ụkwụ anụ, n’ihi na ọ bụ site na ha ka anyị ga-ewere ụfọdụ wee fee Jehova bụ́ Chineke anyị ofufe,+ anyị onwe anyị amaghịkwa ihe anyị ga-eji fee Jehova ofufe ruo mgbe anyị ruru n’ebe ahụ.”+
27 Jehova wee kwe ka obi Fero kpọchie, o kweghịkwa ịhapụ ha ka ha laa.+
28 Fero wee sị ya: “Si n’ebe m nọ pụọ!+ Kpachara anya! Anwala ịhụ ihu m ọzọ, n’ihi na n’ụbọchị ị ga-ahụ ihu m, ị ga-anwụ.”+
29 Mozis wee sị: “Ka ọ dị otú i kwuru. Agaghị m anwa ịhụ ihu gị ọzọ.”+