Ọpụpụ 1:1-22
1 Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Izrel ndị ha na Jekọb so bata n’Ijipt; nwoke ọ bụla na ezinụlọ ya batara:+
2 Ruben,+ Simiọn,+ Livaị+ na Juda,+
3 Ịsaka,+ Zebulọn+ na Benjamin,+
4 Dan+ na Naftalaị,+ Gad+ na Asha.+
5 Mkpụrụ obi niile ndị si n’úkwù Jekọb+ pụta wee dịrị mkpụrụ obi iri asaa, ma Josef nọrịị anọ n’Ijipt.+
6 E mesịa, Josef nwụrụ,+ tinyere ụmụnne ya niile nakwa ọgbọ ahụ dum.
7 Ụmụ Izrel wee mụọ ọmụmụ wee malite ịdị nnọọ ọtụtụ; ha nọkwa na-amụba ma na-adịwanye nnọọ ike nke ukwuu, nke mere na ha jupụtara n’ala ahụ.+
8 Ka oge na-aga, eze ọhụrụ nke na-amaghị Josef malitere ịchị Ijipt.+
9 O wee gwa ndị ya, sị: “Lee! Ndị Izrel dị ọtụtụ ma dị ike karịa anyị.+
10 Ngwanụ! Ka anyị jiri akọ meso ha ihe,+ ma ọ́ bụghị ya ha ga-amụba, ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na e buso anyị agha, ha ga-esonyere ndị kpọrọ anyị asị, ha ga-ebusokwa anyị agha wee si n’obodo a laa.”
11 Ha wee mee ka ndị isi ọrụ mmanye bụrụ ndị isi ha iji na-emegbu ha n’ibu arọ ha na-ebu;+ ha wee na-ewugasị obodo ịbụrụ Fero ebe nkwakọba ihe, ya bụ, Paịtọm na Ramsis.+
12 Ma ka ha na-emegbu ha karị otú ahụ ka ha na-amụbakwu ma na-agbasawanye n’ebe niile, nke mere na oké ụjọ jidere ha n’ihi ụmụ Izrel.+
13 N’ihi ya, ndị Ijipt ji ọchịchị aka ike mee ka ụmụ Izrel gbaa ohu.+
14 Ha wee na-eme ka ndụ na-elu ha ilu site n’ime ka ha na-arụgbu onwe ha n’ọrụ n’ịkpụ ájá ụrọ+ na brik, nakwa ịrụgbu onwe ha n’ọrụ n’ụdị ọrụ ọ bụla a na-arụ n’ubi,+ ee, n’ụdị ọrụ ọ bụla ha ji ọchịchị aka ike mee ka ha na-arụrụ ha dị ka ndị ohu.+
15 E mesịa, eze Ijipt gwara ụmụ nwaanyị Hibru na-aghọ́ nwa,+ aha otu n’ime ha bụ Shifra, aha onye nke ọzọ abụrụ Pua,
16 ee, ọ gwara ha, sị: “Mgbe unu na-enyere ụmụ nwaanyị Hibru aka ịmụ nwa, unu ewee hụ ha n’oche ịmụ nwa, ọ bụrụ na ọ bụ nwoke, gbuonụ ya; ma ọ bụrụ na ọ bụ nwaanyị, hapụnụ ya ndụ.”
17 Otú ọ dị, ụmụ nwaanyị ahụ na-aghọ́ nwa na-atụ egwu ezi Chineke,+ ha emeghịkwa dị ka eze Ijipt gwara ha,+ kama ha na-ahapụ ụmụ nwoke ndụ.+
18 Ka oge na-aga, eze Ijipt kpọrọ ụmụ nwaanyị ahụ na-aghọ́ nwa wee sị ha: “Gịnị mere unu ji mee ihe a, unu wee hapụ ụmụ nwoke ndụ?”+
19 Ụmụ nwaanyị ahụ na-aghọ́ nwa wee gwa Fero, sị: “Ọ bụ n’ihi na ụmụ nwaanyị Hibru adịghị ka ụmụ nwaanyị Ijipt. N’ihi na ha gbasiri ike, ha na-amụcha nwa tupu nwaanyị na-aghọ́ nwa abịakwute ha.”
20 Chineke wee meere ụmụ nwaanyị ahụ na-aghọ́ nwa ihe ọma;+ ụmụ Izrel wee na-abawanye ụba ma na-adịwanye nnọọ ike.
21 O wee ruo na ezi Chineke mesịrị mee ka ụmụ nwaanyị ahụ na-aghọ́ nwa nwee ezinụlọ n’ihi na ha na-atụ egwu ya.+
22 N’ikpeazụ, Fero nyere ndị ya niile iwu, sị: “Unu ga-atụba nwa nwoke ọ bụla a mụrụ ọhụrụ n’osimiri Naịl, ma unu ga-ahapụ nwa nwaanyị ọ bụla ndụ.”+