Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỤ NKE 6

Okpukpe Nile Hà Na-amasị Chineke?

Okpukpe Nile Hà Na-amasị Chineke?

1. Dị ka Okwu Chineke na-ekwu, olee nanị ụdị okpukpe abụọ e nwere?

“SINỤ n’ọnụ ụzọ ámá dị warara banye,” ka Jizọs sịrị, “n’ihi na okporo ụzọ nke na-eduba ná mbibi sara mbara ma dị obosara, ndị na-esikwa na ya abanye dị ọtụtụ; ma ọnụ ụzọ ámá nke na-eduba ná ndụ dị warara, okporo ụzọ ya dịkwa mkpagide, ndị na-achọta ya dịkwa ole na ole.” (Matiu 7:​13, 14) Dị ka Okwu Chineke na-ekwu, e nwere nanị ụdị okpukpe abụọ: otu bụ nke ezigbo ya, otu bụ nke ụgha; otu ziri ezi, otu ezighị ezi; otu na-eduba ná ndụ, otu na-eduba ná mbibi.

2. Olee otú Akwụkwọ Nsọ si egosi na ọ bụghị okpukpe nile na-amasị Chineke?

2 Ụfọdụ ndị na-eche na okpukpe nile na-amasị Chineke. Amaokwu Bible ndị na-esonụ na-egosi na nke a abụghị eziokwu:

  • “Ụmụ Israel wee meekwa ihe ọjọọ n’anya Jehova, fee Bealim, na Ashtarọt, na chi nile nke Siria, na chi nile nke Zaịdọn, na chi nile nke Moab, na chi nile nke ụmụ Amọn, na chi nile nke ndị Filistia, ofufe; ha wee hapụ Jehova, ha efeghịkwa Ya ofufe. Iwe Jehova wee dị ọkụ megide Israel.” (Ndị Ikpe 10:​6, 7) Ọ bụrụ na anyị ekpeere arụsị ma ọ bụ fee chi ọ bụla ọzọ nke na-abụghị ezi Chineke ahụ, anyị agaghị enweta ihu ọma Jehova.

  • “Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m [Chineke], ma obi ha dị nnọọ anya n’ebe m nọ. Ọ bụ n’efu ka ha nọgidere na-efe m ofufe, n’ihi na ha na-ezi ihe mmadụ nyere n’iwu dị ka ozizi.” (Mak 7:​6, 7) Ọ bụrụ na ndị na-azọrọ na ha na-efe Chineke ofufe na-akụzi echiche nke aka ha kama ịkụzi ihe Bible na-ezi, ofufe ha bụ ihe efu. Chineke adịghị anabata ya.

  • “Chineke bụ Mmụọ, ndị na-efe ya aghaghịkwa ife ofufe n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Jọn 4:24) Ofufe anyị aghaghị ikwekọ n’eziokwu nke dị n’Okwu Chineke.

Mkpụrụ Okpukpe Ụgha Na-amịpụta

3. Olee otu ụzọ e si amata ezi okpukpe na okpukpe ụgha?

3 Olee otú anyị ga-esi mara ma okpukpe ọ̀ masịrị Chineke ma ọ bụ na ọ masịghị ya? Jizọs sịrị: “Osisi ọma ọ bụla na-amị ezi mkpụrụ, ma osisi ọ bụla rere ure na-amị mkpụrụ na-abaghị uru . . . Ya mere, n’ezie unu ga-amata ndị ahụ site ná mkpụrụ ha.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ bụrụ na okpukpe sitere n’ebe Chineke nọ, ọ ga-arụpụta ihe ọma; ma ọ bụrụ na okpukpe sitere n’ebe Setan nọ, ọ ga-arụpụta ihe ọjọọ.​—Matiu 7:​15-20.

4. Àgwà dị aṅaa ka ndị na-efe Jehova na-egosipụta?

4 Ezi okpukpe na-azụpụta ndị mmadụ nwere ịhụnanya n’etiti onwe ha, ndị na-ahụkwa ndị ọzọ n’anya. Nke a bụ n’ihi na Jehova n’onwe ya bụ Chineke nke na-ahụ n’anya. Jizọs sịrị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” Olee otú okpukpe dị iche iche si eme ma e jiri ụkpụrụ a e ji amata ezi ofufe tụọ ha n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀?​—Jọn 13:35; Luk 10:27; 1 Jọn 4:8.

5. Olee otú otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma si kọwaa ahịa ohu a zụrụ n’Africa?

5 Tụlee ịzụ ahịa ohu nke weere ọnọdụ n’Africa. Akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị: “E rere ihe dị ka ndị Africa dị 18,000,000 n’ahịa ohu nke ndị Alakụba zụrụ gafere Sahara nakwa Oké Osimiri India n’agbata afọ 650 na 1905. N’ọkara nke abụọ nke narị afọ nke 15, ndị Europe malitere ịzụ ahịa n’ụsọ oké osimiri ebe ọdịda anyanwụ Africa, ka ọ na-erule 1867 kwa, e buruwo ndị Africa dị ihe nọ n’agbata 7,000,000 na 10,000,000 gaa na Kọntinent ndị dị n’America dị ka ndị ohu.”

6. Olee otú okpukpe si kere òkè n’ahịa ohu ahụ?

6 Olee ebe okpukpe kwụ n’oge a e nwere ọgba aghara n’Africa, mgbe a dọkpụụrụ ndị nwoke, ndị nwanyị, na ụmụaka n’ike pụọ n’ụlọ na n’ezinụlọ ha, kee ha agbụ, daa ha ígwè ọkụ, zụrụkwa ma ree ha dị ka ehi? Bethwell Ogot dere n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Daily Nation nke Nairobi, Kenya, sị: “Ma okpukpe Iso Ụzọ Kraịst ma ndị Alakụba na-akụzi ịdị n’otu nke ihe a kpọrọ mmadụ, ma n’agbanyeghị nke ahụ, okpukpe abụọ ahụ zụlitere ọha mmadụ na-agba ohu bụ́ ebe ịkpọasị agbụrụ jupụtara. . . . Anyị kwesịrị ikweta na ụta dịịrị ma ndị Alakụba ma Ndị Kraịst, ma ndị bi n’Ebe Ọdịda Anyanwụ ma ndị bi n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, nakwa ịnọ n’ìsì n’ihe metụtara omume ọma bụ́ nke dugara n’ọtụtụ narị afọ nke ịta ahụhụ na-enweghị atụ nye ndị Africa.”

Okpukpe na Agha

7. Olee òkè okpukpe kerewooro n’ibu agha?

7 Okpukpe ụgha esiwo n’ụzọ ndị ọzọ gosi mkpụrụ rere ure ọ na-amịpụta. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ezie na Bible na-ekwu ka ‘ị hụ onye agbata obi gị n’anya,’ ndị ndú okpukpe gburugburu ụwa ejiriwo ịnụ ọkụ n’obi kwadoo ma kwalite ibu agha.​—Matiu 22:39.

Okpukpe ụgha ekerewo òkè n’agha dị iche iche nakwa n’ịzụ ahịa ohu

8. (a) Olee otú ndị ndú okpukpe si kwadoo igbu mmadụ n’agha ndị a lụrụ n’Africa? (b) Gịnị ka otu pastọ kwuru banyere ndị ndú okpukpe n’oge a na-alụ agha obodo na Nigeria?

8 Ọ bụ ihe a maara nke ọma na n’afọ 1994, ụfọdụ ndị nọn na ndị ụkọchukwu keere òkè n’igbu ndị mmadụ na Rwanda. Okpukpe ekerewokwa òkè gbara ọkpụrụkpụ n’agha ndị ọzọkwa a lụrụ n’Africa. Dị ka ihe atụ, n’oge a lụrụ agha obodo ahụ a kwafuru ọbara nke ukwuu na ya na Nigeria, okpukpe ndị nọ n’akụkụ abụọ ahụ gbara ndị mmadụ ume ịlụ ọgụ. Ka agha ahụ na-aga n’ihu, otu pastọ sịrị na ndị ndú okpukpe ‘ahapụwo ọrụ Chineke nyere ha.’ Ọ sịkwara: “Anyị, bụ́ ndị na-akpọ onwe anyị ndị ozi Chineke, aghọwo ndị ozi Setan.”

9. Gịnị ka Bible na-ekwu banyere ndị ozi Setan?

9 Bible na-ekwu nnọọ otu ihe ahụ, na-asị: “Setan n’onwe ya anọgidewo na-enwogha onwe ya ịbụ mmụọ ozi nke ìhè. Ya mere ọ bụghị oké ihe ma ọ bụrụ na ndị ozi ya anọgidekwa na-enwogha onwe ha ịbụ ndị ozi nke ezi omume.” (2 Ndị Kọrint 11:​14, 15) Dị nnọọ ka ọtụtụ ndị ọjọọ si na-eme ka hà bụ ndị ezi mmadụ, Setan na-eji ndị ozi yiri ka hà bụ ndị ezi omume, ma ha bụ ndị ọrụ ha dị njọ nakwa ndị mkpụrụ ha na-amịpụta rere ure, na-aghọgbu ndị mmadụ.

10. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị ndú okpukpe siworo gọnarị Chineke?

10 N’ụwa nile, ndị ndú okpukpe ekwusawo ịhụnanya, udo, na ịdị mma, ma ha egosipụtawo ịkpọasị, buo agha, meekwa omume asọpụrụghị Chineke. Bible na-akọwa ha nke ọma. Ọ na-asị: “Ha na-ekwupụta n’ihu ọha na ha maara Chineke, ma ha na-agọnarị ya site n’ọrụ ha.”​—Taịtọs 1:16.

Sinụ na “Babilọn Ukwu ahụ” Pụta

11. Olee otú Bible si kọwaa okpukpe ụgha?

11 Anyị pụrụ ịhụ echiche Jehova banyere okpukpe ụgha site n’ịgụ akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe. N’ebe ahụ, a kọwara okpukpe ụgha dị ka nwanyị ihe atụ, bụ́ “Babilọn Ukwu ahụ.” (Mkpughe 17:5) Rịba ama otú Chineke si kọwaa ya:

  • “Oké nwanyị akwụna ahụ . . . onye ya na ndị eze nke ụwa kwara iko.” (Mkpughe 17:​1, 2) Kama ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke, okpukpe ụgha etinyewo aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọtụtụ mgbe na-agwa gọọmenti ihe ọ ga-eme.

  • “N’ime ya ka a hụrụ ọbara nke ndị amụma na nke ndị nsọ na nke ndị nile e gbuworo n’elu ụwa.” (Mkpughe 18:24) Okpukpe ụgha akpagbuwo ma gbuo ndị kwesịrị ntụkwasị obi na-ejere Chineke ozi, ọ bụkwa ya kpataworo ọnwụ nke ọtụtụ nde mmadụ n’agha.

  • ‘O nyere onwe ya otuto ma bie ndụ okomoko nke enweghị ihere.’ (Mkpughe 18:7) Okpukpe ụgha nwere akụ̀ na ụba dị ukwuu, bụ́ nke ndị ndú ya ji ebi ndụ okomoko.

  • “E sitere ná mgbaasị [ọ] na-eme duhie mba nile.” (Mkpughe 18:23) Site n’ozizi ụgha ya nke bụ́ na mkpụrụ obi adịghị anwụ anwụ, okpukpe ụgha emeghewo ụzọ maka ụdị mgbaasị na ịgba afa nile, ọ kwalitewokwa ịtụ ndị nwụrụ anwụ egwu nakwa ife ndị nna ochie ofufe.

12. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Bible na-enye banyere okpukpe ụgha?

12 N’ịdọsi ndị mmadụ aka ná ntị ike ka ha kewapụ onwe ha n’okpukpe ụgha, Bible na-ekwu, sị: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta, ma ọ bụrụ na unu achọghị iso ya kere òkè ná mmehie ya, nakwa ma ọ bụrụ na unu achọghị ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya.”​—Mkpughe 18:​4, 5.

13. Gịnị ga-eme okpukpe ụgha nakwa ndị na-ekpe ya?

13 N’ọdịnihu dị nso, a ga-ebibi Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, kpam kpam. Bible na-ekwu, sị: “N’otu ụbọchị ka ihe otiti ya ga-abịa, bụ́ ọnwụ na iru újú na ụnwụ nri, a ga-akpọkwa ya ọkụ kpam kpam, n’ihi na Jehova Chineke, bụ́ onye kpere ya ikpe, dị ike.” (Mkpughe 18:8) Iji zere ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya, anyị aghaghị igbubi ihe nile jikọtara anyị na okpukpe ụgha, ghara itinye aka n’ihe omume, ememe, na nkwenkwe ndị na-adịghị amasị Chineke. Okwu a chọrọ ka e mee ihe ngwa ngwa banyere ya. Ndụ anyị nọ n’ihe ize ndụ!​—2 Ndị Kọrint 6:​14-18.