ISI NKE 5
Gịnị Ka Chineke Bu n’Obi Kee Ụwa Anyị A?
1. Gịnị mere Chineke ji kee ụwa?
Jehova kere ụwa a, nye ya ụmụ mmadụ ka ha biri. N’ihi ya, Chineke ekeghị Adam na Iv ka ha biri n’eluigwe. Kama, ọ bụ ndị mmụọ ozi ka o kere ka ha biri n’ebe ahụ. (Job 38:4, 7) Mgbe Chineke kechara Adam, o mere ka o biri na paradaịs, ebe mara ezigbo mma. A kpọrọ ebe ahụ ogige Iden. (Jenesis 2:15-17) Jehova chọrọ ka Adam na ụmụ ya biri n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi.—Gụọ Abụ Ọma 37:29; 115:16.
Mgbe ahụ e kere Adam na Iv, ọ bụ naanị ogige Iden ahụ bụ paradaịs. Ma, Chineke chọrọ ka ha mụọ ụmụ mụjuo ụwa. Ka ha na-amụ ụmụ, ha ga-eji nwayọọ nwayọọ mee ka ụwa niile ghọọ paradaịs. (Jenesis 1:28) O nweghị ihe ga-eme ka Chineke bibie ụwa a. Ọ chọrọ ka ụmụ mmadụ biri na ya ruo mgbe ebighị ebi.—Gụọ Abụ Ọma 104:5.
Lee vidio bụ́ Gịnị Mere Chineke Ji Kee Ụwa?
2. Gịnị mere ụwa abụghị paradaịs ugbu a?
Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi, n’ihi ya, Chineke achụpụ ha n’ogige Iden ahụ. Otú ahụ ka paradaịs ahụ si kwaa ụmụ mmadụ. Kemgbe ahụ, o nwebeghị onye merela ka ụwa a ghọghachi paradaịs. Baịbụl kwuru, sị: “E nyefewo ụwa n’aka onye ajọ omume.”—Job 9:24.—Gụọ Jenesis 3:23, 24.
Ọ̀ pụtara na ihe niile gbasara ụmụ mmadụ ịdị ndụ ebighị ebi n’ime paradaịs otú ahụ Jehova chọburu ya agaghịzi enwe isi? Ọ bụghị ihe ọ pụtara. O nweghị ihe nyịrị Chineke. Ọ ga-eme ihe ahụ bụ́ obi ya. (Aịzaya 45:18) Ọ ga-emecha meere ụmụ mmadụ ihe ahụ ọ chọrọ imere ha ná mmalite.—Gụọ Abụ Ọma 37:11, 34.
3. Olee otú Chineke ga-esi mee ka ụwa ghọọ paradaịs?
Ebe ọ bụ na Chineke chiri Jizọs Eze, Jizọs ga-eji ikike o nyere ya mee ka ụwa a ghọọ paradaịs. N’agha Amagedọn, Jizọs ga-akpọrọ ndị mmụọ ozi bịa gbuo ndị niile na-anaghị erubere Chineke Mkpughe 20:1-3; 21:3, 4.
isi. Ya gbuchaa ha, ya atụọ Setan mkpọrọ otu puku afọ. N’agha ahụ, a gaghị egbu ndị na-erubere Chineke isi n’ihi na Jizọs ga-echebe ha ka aka ghara ịkpa ha. Ha ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa a mgbe ọ ga-aghọ Paradaịs.—Gụọ4. Olee mgbe ụmụ mmadụ ga-akwụsị ịta ahụhụ?
Olee mgbe Chineke ga-akwụsị ihe ọjọọ niile dị n’ụwa? O nwere ihe ndị Jizọs kwuru na ọ bụrụ na ha emewe, anyị amara na ọgwụgwụ ụwa ọjọọ a eruwela nso. Ọ bụ ihe ndị ahụ o kwuru ka Baịbụl kpọrọ “ihe ịrịba ama.” Ihe ndị na-eme n’ụwa ugbu a na-akpa ụmụ mmadụ aka ọjọọ. Ha na-egosikwa na anyị bizi ‘n’ọgwụgwụ usoro ihe a.’—Gụọ Matiu 24:3, 7-14, 21, 22.
N’ime otu puku afọ ahụ Jizọs ga-achị ụwa, ọ ga-eme ka ụmụ mmadụ kwụsị ịta ahụhụ. (Aịzaya 9:6, 7; 11:9) Jizọs agaghị abụ naanị Eze, ọ ga-abụkwa Nnukwu Onye Nchụàjà. Nke ahụ pụtara na ọ ga-akagbu mmehie niile ndị hụrụ Chineke n’anya mere. N’ihi ya, Chineke ga-esi n’aka ya mee ka ọrịa, ịka nkà, na ọnwụ ghara ịdị ọzọ.—Gụọ Aịzaya 25:8; 33:24.
5. Olee ndị ga-ebi n’ụwa a mgbe ọ ga-aghọ Paradaịs?
Ị bịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị, ị ga-ahụ ndị hụrụ Chineke n’anya ma na-amụ ihe ha ga-eme ka obi dị ya mma
Ndị na-erubere Chineke isi ga-ebi na Paradaịs. (1 Jọn 2:17) Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa chọọ ndị dị nwayọọ n’obi ma kụziere ha ihe ha ga-eme ka ha na Chineke dịrị ná mma. Taa, Jehova na-akụziri ọtụtụ nde mmadụ ihe ga-enyere ha aka ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa a mgbe ọ ga-aghọ Paradaịs. (Zefanaya 2:3) N’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova, a na-akụziri ndị mmadụ otú ha ga-esi bụrụ ezigbo ndị di na ezigbo ndị nwunye, nakwa otú ha ga-esi bụrụ ezigbo ndị nne na nna. Ụmụaka na ndị mụrụ ha na-anọkọ mụọ ihe ha ga-eme ka ha rite uru n’ozi ọma a si n’aka Chineke.—Gụọ Maịka 4:1-4.