ISI NKE 14
Gịnị Mere Chineke Ji Nwee Ndị Ọ Họọrọ Ka Ha Na-efe Ya?
1. Gịnị mere Chineke ji họrọ mba Izrel ka ha bụrụ ndị ya?
Chineke kpọkọtara ụmụ Ebreham, mee ka ha ghọọ otu mba. Ọ bụ ha ka ọ kpọrọ “Izrel.” Chineke nyere ha iwu ndị ga na-achị ha, gwakwa ha otú ọ chọrọ ka ha si na-efe ya. Ihe mere o ji mee ya bụ ka mba ndị ọzọ si n’aka ha mụta iwu ya ma fee ya otú ọ chọrọ. (Abụ Ọma 147:19, 20) Ọ bụrụ na mba niile ana-ele ha anya ma na-eme ka ha, ọ ga-abara ha uru.—Gụọ Jenesis 22:18.
Chineke họọrọ ụmụ Izrel ka ha bụrụ ndị àmà ya. Akụkọ ụmụ Izrel mere ka anyị mata na mmadụ na-eme ihe Chineke kwuru, ọ na-abara onye ahụ uru. (Diuterọnọmi 4:6) N’ihi ya, ọ bụrụ na ndị mmadụ agụọ Baịbụl gụta akụkọ gbasara ụmụ Izrel, ha ga-amatakwu onye ezi Chineke bụ.—Gụọ Aịzaya 43:10, 12.
2. Gịnị mere Chineke ji họrọ ezigbo Ndị Kraịst ka ha fewe ya?
Mba Izrel mechara kwụsị ife Jehova otú ọ chọrọ. N’ihi ya, Jehova ji ọgbakọ Ndị Kraịst dochie ha. (Matiu 21:43; 23:37, 38) Ọ bụ mba Izrel bụbu ndị àmà Jehova. Ma ugbu a, ọ bụ ezigbo Ndị Kraịst bụ ndị àmà ya.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 15:14, 17.
Jizọs haziri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa niile ma na-eme ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. (Matiu 10:7, 11; 24:14; 28:19, 20) Anyị bi n’oge ikpeazụ nke ụwa ọjọọ a, a rụmiekwala ọrụ ikwusa ozi ọma a. Taa, Jehova emeela ka ọtụtụ nde mmadụ, ndị si n’ebe dị iche iche n’ụwa, jiri otu obi na-efe ya otú ọ chọrọ. E nwetụbeghị mgbe ọtụtụ ndị ji otu obi otú a na-efe Jehova. (Mkpughe 7:9, 10) Ezigbo Ndị Kraịst na-agbarịtakwa ibe ha ume ma na-enyere ibe ha aka. N’ụwa niile, ọ bụ otu ihe ka ha niile na-amụ n’ụlọ nzukọ ha. Ihe niile ha na-amụ sikwa na Baịbụl.—Gụọ Ndị Hibru 10:24, 25.
3. Olee otú Ndịàmà Jehova nke oge a si malite?
Ọ bụ n’afọ 1870 ka Ndịàmà Jehova nke oge a malitere. N’oge ahụ, e nwere mmadụ ole na ole bịakọtara ọnụ ma malite ịmụ Baịbụl. Ka ha na-amụ ya, ha chọpụtara ọtụtụ eziokwu Baịbụl na-akụzi bụ́ ndị e leghaara anya kemgbe. Ha ma na Jizọs haziri ọgbakọ Ndị Kraịst ka ha na-ekwusa ozi ọma, ọ bụ ya mere ha ji malite ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa niile. Ma, ọ bụ n’afọ 1931 ka ha maliteziri ịza Ndịàmà Jehova.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 1:8; 2:1, 4; 5:42.
4. Olee otú e si hazie ozi ọma Ndịàmà Jehova na-ekwusa?
N’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, e nwere ọgbakọ Ndị Kraịst ná mba dị iche iche. Ọ bụkwa ndịozi Jizọs na ndị okenye nọ na Jeruselem na-elekọta ma na-ahazi ha. Ha ma na ọ bụ Jizọs bụ Onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst. (Ọrụ Ndịozi 16:4, 5) Taa, Ndịàmà Jehova nwekwara ndị ikom na-ahazi ọrụ ha n’ụwa niile. A na-akpọ ha Òtù Na-achị Isi. Ndị a bụ ndị okenye ma nke a na-akọ n’Okwu Chineke, ha anọteekwala aka n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova. Ọ bụ ha na-ahụ maka alaka ụlọ ọrụ dị iche iche Ndịàmà Jehova nwere n’ụwa niile. N’alaka ụlọ ọrụ ndị ahụ, a na-asụgharị akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, na-ebi ha, ma na-ekesara ha ndị mmadụ n’ihe karịrị narị asụsụ isii. Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na-eji Okwu Chineke agba ọgbakọ Ndịàmà Jehova niile ume ma na-agwa ha ihe a ga-eme. Ọgbakọ ndị a karịrị otu narị puku n’ụwa niile. E nwekwara ndị ikom na-elekọta ọgbakọ nke ọ bụla. A na-akpọ ha ndị okenye ma ọ bụkwanụ ndị nlekọta. Ndị ikom a na-elekọta atụrụ Chineke nke ọma n’ihi na ha hụrụ ha n’anya.—Gụọ 1 Pita 5:2, 3.
A haziri Ndịàmà Jehova ka ha na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke ma nyere ndị mmadụ aka ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Anyị na-aga n’ụlọ ndị mmadụ ekwusara ha ozi ọma otú ahụ ndịozi Jizọs mere. (Ọrụ Ndịozi 20:20) Anyị na-akụzikwara ndị mmadụ Baịbụl ma ọ bụrụ na ha ji obi ha niile chọọ ịma eziokwu ndị dị n’Okwu Chineke. Anyị bụ otu ezinụlọ, Chineke bụkwa Nna anyị. Ọ hụrụ anyị n’anya. Anyị anaghị eji ụmụnna anyị egwu egwu n’ihi na anyị hụrụ ha n’anya. (2 Ndị Tesalonaịka 1:3) O nweghị ndị nwere obi ụtọ n’ụwa otú anyị nwere n’ihi na anyị na-eme uche Chineke. Anyị na-enyekwara ndị mmadụ aka ka ha mụta ime uche Chineke.—Gụọ Abụ Ọma 33:12; Ọrụ Ndịozi 20:35.