Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 12

Nwa Nwanne Pọl Atụghị Ụjọ

Nwa Nwanne Pọl Atụghị Ụjọ

Ka anyị gụọ banyere nwa okorobịa mere ka a ghara igbu nwanne mama ya. Baịbụl ekwughị aha ya, ma ihe o mere gosiri na ụjọ atụghị ya. Ọ bụ Pọl onyeozi bụ nwanne mama nwa okorobịa a. Ị̀ ga-achọ ịma ihe nwa okorobịa a mere?—

A tụrụ Pọl mkpọrọ na Jeruselem. Ihe mere e ji tụọ ya mkpọrọ bụ na ọ na-ekwusa ozi ọma banyere Jizọs. Ụfọdụ ndị kpọrọ Pọl asị, ha wee kwuo otú ha ga-esi egbu ya. Ha sịrị: ‘Anyị ga-agakwuru onyeisi ndị soja gwa ya ka o dunye Pọl onye soja ga-akpọ ya aga ụlọikpe. Anyị ga-agazi chere ha n’ụzọ, Pọl gafetewe, anyị egbuo ya.’

Nwa nwanne Pọl gwara ma Pọl ma onyeisi ndị soja na e nwere ndị chọrọ igbu Pọl

Nwa nwanne Pọl nụrụ ihe a ha kwuru. Gịnị ka o mere? Ọ gara n’ụlọ mkpọrọ, gwa Pọl ihe ahụ ọ nụrụ. Pọl gwara ya ka ọ gaa gwa ya onyeisi ndị soja ozugbo. Ì chere na ọ dịịrị ya mfe ịgwa ya onyeisi ndị soja?— Mba. Onyeisi ndị soja ahụ abụghị obere mmadụ. Ma, ụjọ atụghị nwa nwanne Pọl ịga gwa ya ihe ọ nụrụ.

Onyeisi ndị soja ma ihe ọ ga-eme ka ha ghara igbu Pọl. Ọ kpọtara ndị soja dị ihe dị ka narị ise ka ha chebe Pọl. Ọ gwara ha ka ha duru Pọl gaa Sesaria n’abalị ahụ. È mechara gbuo Pọl?— Mba. Ndị ahụ chọrọ igbu ya enweghịzi ike imetụ ya aka. Ha enweghịzi ike ime Pọl onyeozi ihe ha chọrọ ime ya.

Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ a?— Nwa nwanne Pọl atụghị onyeisi ndị soja ahụ ụjọ. Gịnwa nwekwara ike ime ka ya. Anyị ekwesịghị ịna-atụ ụjọ mgbe anyị na-agwa ndị mmadụ banyere Jehova. Obi ọ̀ ga-esi gị ike ịna-agwa ndị mmadụ banyere Jehova?— Ọ bụrụ na ị tụghị ụjọ, i nwere ike inyere mmadụ aka ka ọ dị ndụ.

GỤỌ EBE NDỊ A NA BAỊBỤL GỊ