Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 IHE ODIDE NTỤKWASỊ

Ihe Mere Ezi Ndị Kraịst Adịghị Eji Obe Efe Ofufe

Ihe Mere Ezi Ndị Kraịst Adịghị Eji Obe Efe Ofufe

ỌTỤTỤ nde ndị mmadụ na-asọpụrụ ma na-akwanyere obe ùgwù. Akwụkwọ bụ́ The Encyclopædia Britannica kpọrọ obe “ihe oyiyi bụ́ isi e ji eme ihe n’okpukpe Ndị Kraịst.” Otú ọ dị, ezi Ndị Kraịst adịghị eji obe efe ofufe. N’ihi gịnị?

Otu ezigbo ihe mere na ha adịghị eme otú ahụ bụ na Jizọs Kraịst anwụghị n’elu obe. Okwu Grik a na-asụgharịkarị ịbụ “obe” bụ stau·rosʹ. N’ụzọ bụ́ isi, ọ pụtara “osisi kwụ ọtọ.” The Companion Bible na-akọwa, sị: “[Stau·rosʹ] apụtatụghị osisi abụọ nke e ji otu n’ime ha tụbichie nke ọzọ . . . Ọ dịghị ihe ọ bụla dị n’asụsụ Grik ahụ e ji dee [Agba Ọhụrụ] nke na-egosidị na ọ bụ osisi abụọ.”

 N’ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ, ndị so dee Bible jiri okwu ọzọ mee ihe maka ihe e ji kpọgbuo Jizọs. Ọ bụ okwu Grik bụ́ xyʹlon. (Ọrụ 5:30; 10:39; 13:29; Ndị Galeshia 3:13; 1 Pita 2:24) Okwu a pụtara nanị “ogwe osisi” ma ọ bụ “okpiri.”

N’ịkọwa ihe mere e ji akpọgbukarị ndị mmadu n’otu osisi kwụ ọtọ, akwụkwọ bụ́ Das Kreuz und die Kreuzigung (Obe na Mkpọgide n’Obe), nke Hermann Fulda dere, na-ekwu, sị: “A dịghị enwetakebe osisi n’ebe ndị ahụ a họọrọ ịnọ egbu ndị mmadụ n’ihu ọha. N’ihi ya, a na-egwunye otu ogwe osisi n’ala. A na-achịli ndị omekome aka elu ma kegide ma ọ bụ kpọgide ha n’osisi a.”

Otú ọ dị, ọ bụ n’Okwu Chineke ka a na-enweta ihe àmà kasị doo anya. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Kraịst, site n’ịzụrụ anyị, tọhapụrụ anyị n’ọbụbụ ọnụ nke Iwu ahụ site n’ịghọ ọbụbụ ọnụ n’ọnọdụ anyị, n’ihi na e dere, sị: ‘Onye a bụrụ ọnụ ka onye ọ bụla a kwụbara n’osisi bụ.’” (Ndị Galeshia 3:13) N’ebe a, Pọl na-ehota Deuterọnọmi 21:22, 23, bụ́ nke na-ezo aka n’ụzọ doro anya n’ebe osisi dị, ọ bụghị obe. Ebe ọ bụ na ihe dị otú ahụ e ji akpọgbu mmadụ na-eme ka mmadụ bụrụ “ọbụbụ ọnụ,” ọ gaghị ekwesị ekwesị Ndị Kraịst iji onyinyo nke Kraịst a kpọgburu akpọgbu chọọ ụlọ ha mma.

E nweghị ihe àmà ọ bụla na-egosi na n’ime afọ 300 mbụ gaferenụ mgbe Kraịst nwụsịrị, na ndị na-azọrọ na ha bụ Ndị Kraịst jiri obe mee ihe mgbe ha na-efe ofufe. Otú ọ dị, na narị afọ nke anọ, Eze Ukwu na-ekpere arụsị bụ́ Constantine ghọrọ onye òtù nke Iso Ụzọ Kraịst nke na-adịghịzi agbaso ụkpụrụ Kraịst, ọ kwalitekwara iji obe eme ihe na ya. Ihe ọ sọkwara ya bụrụ ebumnobi Constantine, ọ dịghị ihe jikọrọ Jizọs Kraịst na obe. N’eziokwu, obe sitere n’aka ndị ọgọ mmụọ. New Catholic Encyclopedia na-ekweta, sị: “Ndị dịrị ndụ tupu oge Ndị Kraịst nakwa ndị na-abụghị Ndị Kraịst jichara obe mee ihe.” Akwụkwọ ndị ọzọ jikọkwara obe na ife ihe ndị e kere eke ofufe nakwa ememe mmekọahụ nke ndị ọgọ mmụọ.

Gịnịzi mere e ji anabata iji ihe oyiyi a nke ndị ọgọ mmụọ eme ihe? Ma eleghị anya, ọ bụ iji mee ka ọ dịrị ndị ọgọ mmụọ mfe ịnakwere “Iso Ụzọ Kraịst.” Otú ọ dị, Bible katọrọ n’ụzọ doro anya ife ihe oyiyi ọ bụla nke ndị ọgọ mmụọ ofufe. (2 Ndị Kọrint  6:14-18) Akwụkwọ Nsọ machibidokwara ụdị ikpere arụsị nile. (Ọpụpụ 20:4, 5; 1 Ndị Kọrint 10:14) N’ihi ya, e nwere ezigbo ihe mere na ezi Ndị Kraịst adịghị eji obe eme ihe mgbe ha na-efe ofufe. *

^ par. 9 Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere obe, lee Ụlọ Nche nke November 15, 1992, peeji nke 7, bụ́ nke Ndịàmà Jehova bipụtara.