Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nke A Ọ̀ Bụ Ihe Chineke Zubere?

Nke A Ọ̀ Bụ Ihe Chineke Zubere?

Ọ BỤRỤ na ị gụọ akwụkwọ akụkọ, ma ọ bụ kirie televishọn, ma ọ bụ gee redio, ị ga-achọpụta na akụkọ banyere mpụ, agha, na iyi ọha egwu jupụtara na ha! Chegodị echiche banyere nsogbu ndị nke i nwere. Ma eleghị anya, ọrịa ma ọ bụ ọnwụ nke onye ị hụrụ n’anya na-egbu gị mgbu n’obi. Ị pụrụ inwe mmetụta yiri nke ezi mmadụ ahụ́ bụ́ Job, bụ́ onye sịrị na ‘ahụhụ juru ya afọ.’—Job 10:15.

Jụọ onwe gị, sị:

  • Nke a ọ̀ bụ ihe Chineke zubere maka m nakwa maka ihe nile a kpọrọ mmadụ?

  • Olee ebe m pụrụ inweta enyemaka iji nagide nsogbu m nile?

  • È nwere olileanya na ọ dị mgbe anyị ga-enwe udo n’ụwa?

Bible na-aza ajụjụ ndị a n’ụzọ na-eju afọ.

 BIBLE NA-AKỤZI NA CHINEKE GA-EME KA E NWEE MGBANWE NDỊ A N’ỤWA.

Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.”—Mkpughe 21:4.

“Onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele.”—Aịsaịa 35:6

“A ga-emeghe anya ndị ìsì.”—Aịsaịa 35:5.

 ‘Ndị nile nọ n’ili ncheta ga-apụta.’—Jọn 5:28, 29

“Onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.”—Aịsaịa 33:24.

“Ọtụtụ ọka [ga-adị] n’ala.”—Abụ Ọma 72:16.

 RITE URU N’IHE NDỊ BIBLE NA-AKỤZI

Adịla ngwa iwere ihe ndị dị na peeji ndị bu ụzọ dị ka nanị nrọ efu. Chineke ekwewo nkwa ime ihe ndị a, Bible na-akọwakwa otú ọ ga-esi mee ha.

Ma Bible na-eme ihe karịrị nke ahụ. Ọ na-ekwu ihe ga-enyere gị aka ibi ndụ na-eju afọ n’ezie ọbụna ugbu a. Chetụdị banyere nchegbu na nsogbu ndị i nwere. Ha pụrụ ịgụnye nsogbu ego, nsogbu ezinụlọ, ahụ́ adịghị ike, ma ọ bụ ọnwụ nke onye ị hụrụ n’anya. Bible pụrụ inyere gị aka ịnagide nsogbu taa, ọ pụkwara iwetara gị nkasi obi site n’ịza ajụjụ ndị dị ka ndị a:

  • N’ihi gịnị ka anyị ji ata ahụhụ?

  • Olee otú anyị pụrụ isi nagide nchegbu nke ndụ?

  • Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ndụ ezinụlọ anyị bụrụ nke na-enye obi ụtọ karị?

  • Gịnị na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ?

  • Ànyị ga-ahụ ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ọzọ?

  • Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na Chineke ga-emezu nkwa ya maka ọdịnihu?

 Ọgụgụ ị na-agụ akwụkwọ a gosiri na ọ ga-amasị gị ịmata ihe Bible na-akụzi. Akwụkwọ a ga-enyere gị aka. Ị ga-ahụ na paragraf nke ọ bụla nwere ajụjụ ya na ya kwekọrọ n’ala ala peeji. Ọ masịwo ọtụtụ nde mmadụ iji ajụjụ na azịza eme ihe mgbe ha na Ndịàmà Jehova na-ekwurịta banyere Bible. Anyị nwere olileanya na ọ ga-amasịkwa gị. Ka Chineke gọzie gị ka ị na-enwe ahụmahụ na-akpali akpali ugbu a na nke na-enye afọ ojuju nke ịmụta ihe Bible na-akụzi n’ezie!