Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 21

Jizọs Ekpughee “Amamihe Sitere na Chineke”

Jizọs Ekpughee “Amamihe Sitere na Chineke”

1-3. Olee otú ndị bụbu ndị agbata obi Jizọs si meghachi omume n’ihe ọ na-ezi, gịnịkwa ka ha na-aghọtaghị banyere ya?

IBOBO nwụrụ ndị na-ege ya ntị n’ahụ́. Nwa okorobịa ahụ bụ́ Jizọs guzo n’ihu ha n’ụlọ nzukọ, na-ezi ihe. Ọ bụghị onye ọhụrụ nye ha—ọ nọ n’obodo ha too, ruokwa ọtụtụ afọ, ọ rụrụ ọrụ n’etiti ha dị ka onye ọkwá nkà. Ikekwe ụfọdụ n’ime ha bi n’ụlọ Jizọs soro wuo, ma ọ bụkwanụ, ọ pụrụ ịbụ na ha ji ọgụ na yok ndị o ji aka ya mepụta na-akọ ala ha. * Ma olee otú ha ga-esi meghachi omume n’ihe onye a bụbu onye ọkwá nkà na-ezi?

2 O juru ihe ka ọtụtụ ná ndị ahụ na-ege ya ntị anya, ha wee na-ajụ, sị: “Olee ebe nwoke a si nweta amamihe a?” Ma ha kwukwara, sị: “Onye a bụ ọkwá nkà ahụ, nwa Meri.” (Matiu 13:54-58; Mak 6:1-3) N’ụzọ dị mwute, ndị bụbu ndị agbata obi Jizọs nọ na-eche, sị, ‘Anyị na ọkwá nkà a bi n’ebe a.’ N’agbanyeghị amamihe dị n’ihe ọ na-ekwu, ha jụrụ Ya. Ha amaghị na ọ bụghị ya nwe amamihe ọ na-ekesa.

3 Olee ebe Jizọs si nweta amamihe a? “Ihe m na-ezi abụghị nke m,” ka o kwuru, “kama ọ bụ nke onye zitere m.” (Jọn 7:16) Pọl onyeozi kọwara na Jizọs ‘aghọworo anyị amamihe sitere na Chineke.’ (1 Ndị Kọrint 1:30) E si n’aka Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, kpughee amamihe Jehova. N’ezie, nke a bụ eziokwu ruo n’ókè nke na Jizọs pụrụ ikwu, sị: “Mụ na Nna m bụ otu.” (Jọn 10:30) Ka anyị nyochaa akụkụ atọ ebe Jizọs gosipụtara “amamihe sitere na Chineke.”

 Ihe Ọ Kụziri

4. (a) Gịnị bụ isiokwu nke ozi Jizọs, n’ihi gịnịkwa ka nke ahụ ji dị oké mkpa? (b) N’ihi gịnị ka ndụmọdụ Jizọs ji dị irè mgbe nile bụrụkwa maka ọdịmma kasịnụ nke ndị gere ya ntị?

4 Nke mbụ, tụlee ihe Jizọs kụziri. Isiokwu nke ozi ya bụ “ozi ọma banyere alaeze.” (Luk 4:43) Nke ahụ dị oké mkpa n’ihi òkè Alaeze ahụ ga-ekere n’igosipụta oruru o ruuru Jehova ịbụ eze nakwa n’iwetara ihe a kpọrọ mmadụ ngọzi na-adịgide adịgide. N’izi ihe ya, Jizọs nyekwara ndụmọdụ amamihe dị na ya maka ndụ a na-adị kwa ụbọchị. O gosipụtara na ya bụ “Onye Ebube, Onye ndụmọdụ” ahụ e buru n’amụma. (Aịsaịa 9:6) N’ezie, olee otú ndụmọdụ ya ga-esi ghara ịdị ebube? Ọ maara Okwu na uche Chineke nke ọma, nwee nghọta miri emi banyere ọdịdị ụmụ mmadụ, nweekwa ịhụnanya miri emi n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ. N’ihi ya, ndụmọdụ ya dị irè mgbe nile bụrụkwa maka ọdịmma kasịnụ nke ndị gere ya ntị. Jizọs kwuru “okwu nke ndụ ebighị ebi.” Ee, ndụmọdụ ya na-eduga ná nzọpụta ma ọ bụrụ na a gbasoo ya.—Jọn 6:68.

5. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị Jizọs kwuru okwu maka ha n’Ozizi Elu Ugwu ahụ?

5 Ozizi Elu Ugwu ahụ bụ ihe atụ kwesịrị ịrịba ama nke amamihe na-enweghị atụ dị n’izi ihe Jizọs. Ozizi Elu Ugwu a, dị ka e si dekọọ ya na Matiu 5:3–7:27, ma eleghị anya ga-ewe nanị minit 20 iji zie ya. Otú ọ dị, ndụmọdụ dị n’ime ya na-adị irè n’oge ọ bụla—ọ dị mkpa taa dị ka ọ dị mgbe mbụ e nyere ya. Jizọs kwuru okwu banyere ọtụtụ ihe, gụnyere ụzọ isi meziwanye mmekọrịta anyị na ndị ọzọ (5:23-26, 38-42; 7:1-5, 12), ụzọ isi nọgide na-adị ọcha n’omume (5:27-32), na ụzọ isi na-ebi ndụ nwere nzube (6:19-24; 7:24-27). Ma ihe Jizọs mere abụghị nanị ịgwa ndị na-ege ya ntị ihe amamihe dị na ya ime; o gosiri ha ya site n’inye nkọwa, iso ha tụgharịa uche, na inye ha ihe àmà.

6-8. (a) Olee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ Jizọs kwuru mere a ga-eji zere nchegbu? (b) Gịnị na-egosi na ndụmọdụ Jizọs nyere na-egosipụta amamihe si n’elu?

 6 Dị ka ihe atụ, cheedị echiche banyere ndụmọdụ amamihe dị na ya nke Jizọs nyere banyere ụzọ isi merie inwe nchegbu maka ihe onwunwe, dị ka e kwuru na Matiu isi 6. “Kwụsịnụ ichegbu onwe unu banyere mkpụrụ obi unu maka ihe unu ga-eri ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ, ma ọ bụ banyere ahụ́ unu maka ihe unu ga-eyi,” ka Jizọs na-adụ anyị n’ọdụ. (Amaokwu 25) Ihe oriri na uwe bụ mkpa ndị bụ́ isi, ọ bụkwa nnọọ ihe kwesịrị ekwesị bụ́ mmadụ ichegbu onwe ya banyere inweta ihe ndị a. Ma Jizọs na-agwa anyị ka anyị ‘kwụsị ichegbu onwe anyị’ banyere ihe ndị dị otú ahụ. * N’ihi gịnị?

7 Gee ntị n’ezi ịrụ ụka Jizọs bụ́ nke na-eme ka e kwenye. Ebe Jehova nyeworo anyị ndụ na ahụ́, ọ̀ bụ na ọ pụghị inye anyị ihe oriri iji na-azụ ndụ ahụ na uwe a ga-eyikwasị n’ahụ́ ahụ? (Amaokwu 25) Ọ bụrụ na Chineke na-enye ụmụ nnụnụ nri ma na-eme ka okooko osisi maa mma, lee ka ọ ga-esi lekọta ụmụ mmadụ na-efe ya ofufe karị! (Amaokwu 26, 28-30) N’ezie, ọ baghịkwa uru inwewe nchegbu na-enweghị isi. Ọ gaghị enwe ike ịgbatịkwu ndụ anyị ọbụna nke nta. * (Amaokwu 27) Olee otú anyị pụrụ isi zere inwe nchegbu? Jizọs na-adụ anyị ọdụ, sị: Nọgidenụ na-ebute ofufe Chineke ụzọ ná ndụ. Ndị na-eme otú ahụ pụrụ inwe obi ike na Nna ha nke eluigwe ‘ga-atụkwasịrị’ ha ihe ndị dị ha mkpa kwa ụbọchị. (Amaokwu 33) N’ikpeazụ, Jizọs tụrụ aro dị irè karịsịa—chewe maka ụbọchị nke ị hụrụ. Gịnị mere ị ga-eji buru nchegbu nke echi tụkwasị na nke taa? (Amaokwu 34) E wezụga nke ahụ, gịnị mere ị ga-eji na-echegbu onwe gị n’ụzọ na-enweghị isi  maka ihe ndị nwedịrị ike ha agaghị eme eme? Itinye ndụmọdụ dị otú ahụ amamihe dị na ya n’ọrụ pụrụ igbochiri anyị oké nhụsianya n’ime ụwa a nke nrụgide jupụtara na ya.

8 N’ụzọ doro anya, ndụmọdụ ahụ Jizọs nyere dị irè taa dịkwa ka ọ dị mgbe e nyere ya ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 gara aga. Nke ahụ ọ́ bụghị ihe àmà na-egosi na ọ bụ amamihe si n’elu? Ọbụna ndụmọdụ kasị mma nke ndị ndụmọdụ bụ́ mmadụ nyere na-adị na-aghọ ihe oge ya gafeworo, n’oge na-adịghịkwa anya a na-agbanwegharị ma ọ bụ dochie ya. Otú ọ dị, ihe ndị Jizọs kụziri ka dị irè taa, mgbe ọtụtụ afọ gafesịworo. Ma nke ahụ ekwesịghị iju anyị anya, n’ihi na Onye Ebube na Onye Ndụmọdụ a kwuru “ihe Chineke kwuru.”—Jọn 3:34.

Ụzọ O Si Zie Ihe

9. Gịnị ka ụfọdụ ndị agha kwuru banyere izi ihe Jizọs, n’ihi gịnịkwa ka nke a na-ejighị bụrụ ikwubiga okwu ókè?

9 Akụkụ nke abụọ ebe Jizọs gosipụtara amamihe Chineke bụ n’ụzọ o si zie ihe. N’otu oge, ụfọdụ ndị agha, bụ́ ndị e zipụrụ ka ha gaa jide ya gba aka lọta, na-asị: “Ọ dịbeghị mgbe mmadụ ọzọ kwuru okwu otú a.” (Jọn 7:45, 46) Nke a abụghị ikwubiga okwu ókè. N’ime mmadụ nile dịworo ndụ, ọ bụ Jizọs, bụ́ onye si “n’ógbè dị n’elu,” nwere ihe ọmụma na ahụmahụ kasịnụ ọ ga-eji mee ihe. (Jọn 8:23) N’ezie, o ziri ihe n’ụzọ mmadụ ọ bụla ọzọ na-apụghị isi zie ihe. Tụlee nanị ụzọ abụọ n’ime ụzọ ndị Onye Ozizi a maara ihe ji mee ihe.

“Ụzọ o si ezi ihe juru ìgwè mmadụ ahụ anya”

10, 11. (a) N’ihi gịnị ka otú Jizọs si eji ihe atụ eme ihe pụrụ iji ju anyị anya? (b) Gịnị bụ ilu, ihe atụ dịgasịkwa aṅaa na-egosi ihe mere ilu ndị Jizọs ji mee ihe ji dị nnọọ irè n’izi ihe?

10 Iji ihe atụ eme ihe n’ụzọ dị irè. A gwara anyị na “Jizọs ji ihe atụ dị iche iche gwa ìgwè mmadụ ahụ” okwu. “N’ezie, ọ dịghị agwa ha okwu ma ọ bụrụ na o jighị ihe atụ.” (Matiu 13:34) Nkà na-enweghị atụ o nwere n’iji ihe ndị na-eme kwa ụbọchị akụzi eziokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ na-eju anyị anya n’ezie. Ndị ọrụ ugbo na-agha mkpụrụ, ndị inyom na-akwadebe ime achịcha, ụmụaka na-egwuri egwu n’ọmà ahịa,  ndị ọkụ azụ̀ na-adọgote ụgbụ ha, ndị ọzụzụ atụrụ na-achọ atụrụ furu efu—ihe ndị a bụ ihe ndị na-ege ya ntị hụworo ọtụtụ ugboro. Mgbe e jikọtara eziokwu dị mkpa na ihe ndị a maara nke ọma, eziokwu dị otú ahụ na-agbami mkpọrọgwụ ngwa ngwa n’uche na n’obi.—Matiu 11:16-19; 13:3-8, 33, 47-50; 18:12-14.

11 Ọtụtụ mgbe, Jizọs ji ilu, bụ́ akụkọ ndị dị mkpirikpi e si na ha amụta eziokwu ime mmụọ ma ọ bụ eziokwu ndị metụtara omume, mee ihe. Ebe ọ bụ na ọ na-adị mfe ịghọta na icheta akụkọ karịa echiche nkịtị, ilu ndị ahụ nyere aka mee ka a ghara ichefu ozizi Jizọs ngwa ngwa. N’ọtụtụ ilu ndị ahụ, Jizọs ji okwu ndị doro nnọọ anya, ndị a na-apụghị ichefu ngwa ngwa kọwaa Nna ya. Dị ka ihe atụ, olee onye na-agaghị aghọta isi ihe dị n’ilu nwa mmefu ahụ—na mgbe onye kpafuru akpafu gosiri ezi nchegharị, Jehova ga-enwe obi ebere n’ebe ọ nọ ma jiri obiọma nabataghachi ya?—Luk 15:11-32.

12. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Jizọs si jiri ajụjụ mee ihe n’ozizi ya? (b) Olee otú Jizọs si mechie ndị na-agbagha ebe ikike ya sitere ọnụ?

12 Iji ajụjụ eme ihe n’ụzọ nkà. Jizọs ji ajụjụ mee ka ndị na-ege ya ntị ruo ná nkwubi okwu nke ha, nyochaa ebumnobi ha, ma ọ bụ mee mkpebi. (Matiu 12:24-30; 17:24-27; 22:41-46) Mgbe ndị ndú okpukpe nọ na-agbagha ma ọ̀ bụ Chineke nyere ya ikike, Jizọs zara, sị: “Baptizim Jọn mere, ò sitere n’eluigwe ka ò sitere n’aka mmadụ?” N’ịbụ ndị ajụjụ ahụ riri ọnụ, ha kwurịtara n’etiti onwe ha, sị: “Ọ bụrụ na anyị asị, ‘Site n’eluigwe,’ ọ ga-asị anyị, ‘Gịnịzi mere unu ekwereghị ya?’ Ma, ọ bụrụ na anyị asị, ‘Site n’aka mmadụ,’ anyị nwere ìgwè mmadụ anyị ga-atụ egwu, n’ihi na ha nile weere Jọn dị ka onye amụma.” N’ikpeazụ, ha zara, sị: “Anyị amaghị.” (Mak 11:27-33; Matiu 21:23-27) Jizọs ji ajụjụ dị mfe mechie ha ọnụ ma kpughee aghụghọ dị ha n’obi.

13-15. Olee otú ilu banyere onye Sameria ahụ bụ́ ezi onye agbata obi si gosipụta amamihe Jizọs nwere?

13 Mgbe ụfọdụ Jizọs ji ihe karịrị otu ụzọ mee ihe n’otu mgbe site n’iwebata ajụjụ ndị na-akpali iche echiche n’ihe atụ ya. Mgbe otu ọkàiwu bụ́ onye Juu jụrụ Jizọs ihe a chọrọ n’aka  mmadụ iji nweta ndụ ebighị ebi, Jizọs zooro ya aka n’Iwu Mozis, bụ́ nke nyere iwu ka a hụ Chineke na onye agbata obi n’anya. Ebe ọ na-achọ igosi na ya bụ onye ezi omume, nwoke ahụ jụrụ, sị: “Ònye n’ezie bụ onye agbata obi m?” Jizọs zara ya site n’ịkọrọ ya otu akụkọ. Otu nwoke bụ́ onye Juu nọ na-eme njem nanị ya mgbe ndị na-apụnara mmadụ ihe, bụ́ ndị hapụrụ ya ọdị ndụ ọnwụ ka mma, wakporo ya. Ndị Juu abụọ gafetara, onye nchụàjà bu ụzọ gafeta, e mesịa onye Livaị agafeta. Ha abụọ leghaara ya anya. Ma mgbe e mesịrị, otu onye Sameria bịarutere ebe ahụ. N’ịbụ onye ọmịiko kpaliri, o jiri nwayọọ hichaa ma kechie ebe ndị e merụrụ nwoke ahụ ahụ́ ma jiri ịhụnanya buru nwoke ahụ gaa n’ebe ọ na-adịghị ihe ga-eme ya, n’ụlọ ndị njem, bụ́ ebe ọ ga-enwe ike ịnọ gbakee. Ka ọ kọsịrị akụkọ ya, Jizọs jụrụ onye ahụ jụrụ ya ajụjụ, sị: “Ònye n’ime mmadụ atọ a yiri gị onye meworo onwe ya onye agbata obi nke nwoke ahụ dabara n’aka ndị na-apụnara mmadụ ihe?” A manyere nwoke ahụ ịza, sị: “Onye ahụ nke mesoro ya ihe n’obi ebere.”—Luk 10:25-37.

14 Olee otú ilu ahụ si gosipụta amamihe Jizọs nwere? N’oge Jizọs, ndị Juu na-eji okwu bụ́ “onye agbata obi” eme ihe nanị maka ndị na-agbaso omenala ha—ọ bụghị maka ndị Sameria ma ọlị. (Jọn 4:9) A sị na Jizọs kwuru n’akụkọ ahụ na ọ bụ onye Sameria ka e merụrụ ahụ́ nakwa na ọ bụ onye Juu nyeere ya aka, nke ahụ ọ̀ gaara agbanwe ajọ mbunobi ahụ? Jizọs ji amamihe hazie akụkọ ahụ ka ọ bụrụ onye Sameria lekọtara onye Juu n’ụzọ obiọma. Rịbakwa ama ajụjụ Jizọs jụrụ mgbe ọ kọsịrị akụkọ ahụ. Ọ gbanwere ihe okwu ahụ bụ́ “onye agbata obi” pụtara. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ihe ọkàiwu ahụ jụrụ bụ: ‘Ònye ka m kwesịrị ịhụ n’anya dị ka onye agbata obi m?’ Ma Jizọs jụrụ, sị: “Ònye n’ime mmadụ atọ a yiri gị onye meworo onwe ya onye agbata obi?” Jizọs lekwasịrị anya, ọ bụghị n’ebe onye ahụ e gosiri obiọma nọ, bụ́ onye ahụ e merụrụ ahụ́, kama n’ebe onye gosiri obiọma nọ, bụ́ onye Sameria ahụ. Ezi onye agbata obi na-ebu ụzọ egosi ndị ọzọ ịhụnanya n’agbanyeghị agbụrụ ha si na ya. Ọ dịghị otú Jizọs gaara esiworị mee ka isi ihe ọ na-ekwu doo anya karị.

 15 Ọ̀ bụ ihe ijuanya na “ụzọ [Jizọs] si ezi ihe” juru ndị mmadụ anya, na a dọtakwara ha n’ebe ọ nọ? (Matiu 7:28, 29) N’otu oge, “ìgwè mmadụ buru ibu” nọ ya nso ruo ụbọchị atọ, ọbụna n’erighị nri!—Mak 8:1, 2.

Ụzọ Ndụ Ya

16. N’ụzọ dị aṅaa ka Jizọs si nye “ihe àmà a na-ahụ anya” na ọ bụ amamihe Chineke na-eduzi ya?

16 Akụkụ nke atọ ebe Jizọs gosipụtara amamihe Jehova bụ n’ụzọ o si bie ndụ. Amamihe na-arụpụta ihe; ọ dị irè. “Ònye n’etiti unu maara ihe?” ka onye na-eso ụzọ bụ́ Jems jụrụ. O jizi aka ya zaa ajụjụ ya, na-asị: “Ka omume ọma ya nye ihe àmà a na-ahụ anya banyere ya.” (Jems 3:13, The New English Bible) Otú Jizọs si kpaa àgwà nyere “ihe àmà a na-ahụ anya” na amamihe Chineke na-eduzi ya. Ka anyị tụlee ụzọ o si gosipụta na ọ na-echezi echiche, ma n’ụzọ o si bie ndụ ma n’ụzọ o si mesoo ndị ọzọ.

17. Olee ihe ndị na-egosi na Jizọs nwere nguzo zuru okè?

17 Ị̀ chọpụtawo na ndị na-adịghị eji ezi echiche eme ihe na-emebiga ihe ókè ọtụtụ mgbe? Ee, a chọrọ amamihe iji guzozie eguzozie. N’igosipụta amamihe sitere n’aka Chineke, Jizọs emeghị ihe n’ụzọ na-erughị otú o kwesịrị ma ọ bụ mebiga ihe ókè. Nke kasị nke, o debere ihe ime mmụọ n’ọnọdụ mbụ ná ndụ ya. O mikpuru onwe ya nke ukwuu n’ọrụ ikwusa ozi ọma ahụ. Ọ sịrị: “Ọ bụ n’ihi nzube a ka m jiworo pụta.” (Mak 1:38) Dị ka o kwesịrị ịdị, ihe onwunwe abụghị nnọọ ihe kasị mkpa nye ya; o yiri ka ihe onwunwe o nwere ọ dị nnọọ nta. (Matiu 8:20) Otú ọ dị, ọ bụghị onye na-anapụ onwe ya ihe ụtọ nile. Dị ka Nna ya, bụ́ “Chineke onye obi ụtọ,” Jizọs bụ onye na-enwe obi ụtọ, o mekwara ka ndị ọzọ nwee obi ụtọ. (1 Timoti 1:11; 6:15) Mgbe ọ gara otu oriri agbamakwụkwọ—ememe a na-akụ egwú, na-agụ egwú ma na-aṅụrị ọṅụ ma e mewe ya—ọ gaghị ebe ahụ ịga mee ka ememe ahụ ghara ịtọkwa ndị mmadụ ụtọ. Mgbe mmanya gwụrụ, o mere mmiri ka ọ ghọọ mmanya mara nnọọ mma, bụ́ ihe ọṅụṅụ nke “na-eme ka obi mmadụ ṅụrịa.” (Abụ Ọma 104:15; Jọn 2: 1-11) Jizọs zara ọtụtụ òkù a kpọrọ ya ịga rie ihe, ọtụtụ mgbekwa, o ziri ihe n’oge ndị ahụ.—Luk 10:38-42; 14:1-6.

18. Olee otú Jizọs si gosipụta iji ezi echiche eme ihe n’ụzọ na-enweghị ntụpọ n’ụzọ o si mesoo ndị na-eso ụzọ ya ihe?

18 Jizọs gosipụtara na o ji ezi echiche mee ihe mgbe nile n’ụzọ o si mesoo ndị ọzọ ihe. Nghọta ọ ghọtara ọdịdị mmadụ mere ka ọ ghọta ndị na-eso ụzọ ya nke ọma. Ọ maara nke ọma na ha ezughị okè. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ chọpụtara àgwà ọma ndị ha nwere. Ọ hụrụ ihe ndị ikom a Jehova dọtara nwere ike ime. (Jọn 6:44) N’agbanyeghị mmejọ ha, Jizọs gosipụtara na ya dị njikere ịtụkwasị ha obi. N’igosipụta ntụkwasị obi ahụ, o nyefere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ na-abụghị obere ọrụ. O nyere ha ọrụ ikwusa ozi ọma ahụ, o nwekwara obi ike na ha nwere ikike ịrụzu ọrụ ahụ. (Matiu 28:19, 20) Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi na-agba akaebe na ha ji ikwesị ntụkwasị obi rụzuo ọrụ ahụ o nyere ha iwu ịrụ. (Ọrụ 2:41, 42; 4:33; 5:27-32) Ya mere, o doro anya na Jizọs ịtụkwasị ha obi bụ ihe amamihe dị na ya.

19. Olee otú Jizọs si gosipụta na ya ‘nwere obi dị nwayọọ ma dị umeala n’obi’?

19 Dị ka anyị hụrụ n’Isi nke 20, Bible na-ejikọta ịdị umeala n’obi na ịdị nwayọọ na amamihe. N’ezie, Jehova na-esetịpụ ihe nlereanya kasị mma ma a bịa na nke a. Ma olee banyere Jizọs? Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ ịhụ ịdị umeala n’obi Jizọs gosipụtara n’ụzọ o si mesoo ndị na-eso ụzọ ya ihe. Dị ka nwoke  zuru okè, ọ karịrị ha. N’agbanyeghị nke ahụ, o ledaghị ndị na-eso ụzọ ya anya. Ọ dịghị mgbe ọ gbalịrị ime ka ha nwee mmetụta na ha erughị ka ya ma ọ bụ na ha enweghị nkà ndị a chọrọ. Kama nke ahụ, o bu adịghị ike ha n’uche ma nwee ndidi ná mmejọ ha. (Mak 14:34-38; Jọn 16:12) Ọ́ bụghị ihe kwesịrị ịrịba ama na ahụ́ ruru ọbụna ụmụaka ala mgbe ha na Jizọs nọ? N’ezie, a dọtara ha n’ebe ọ nọ n’ihi na ha ghọtara na ‘o nwere obi dị nwayọọ, ma dị umeala n’obi.’—Matiu 11:29; Mak 10:13-16.

20. Olee otú Jizọs si gosi iji ezi uche eme ihe n’otú o si mesoo nwanyị Jentaịl ahụ mmụọ ọjọọ ji nwa ya?

20 Jizọs gosiri ịdị umeala n’obi Chineke n’ụzọ ọzọkwa dị mkpa. O ji ezi uche mee ihe, ma ọ bụ na-ekwenye ekwenye mgbe ebere mere ka ime otú ahụ bụrụ ihe kwesịrị ekwesị. Dị ka ihe atụ, cheta mgbe otu nwanyị onye Jentaịl rịọrọ ya ka ọ gwọọ nwa ya nwanyị mmụọ ọjọọ jisiri aka ike. N’ụzọ atọ dịgasị nnọọ iche, Jizọs gosiri ná mmalite na ya agaghị enyere ya aka—nke mbụ, site n’azaghị ya ihe ọ bụla; nke abụọ, site n’ikwu hoo haa na e zitere ya maka ndị Juu, ọ bụghị maka ndị Jentaịl; nke atọ kwa, site n’inye ihe atụ nke ji obiọma mee ka otu isi ihe ahụ pụta ìhè. Otú ọ dị, nwanyị ahụ nọgidesiri ike na-arịọ ya, na-enye ihe àmà na-egosi na o nwere okwukwe na-enweghị atụ. N’ihi ọnọdụ a dị iche, gịnị ka Jizọs mere? O mere kpọmkwem ihe ọ sịburu na ya agaghị eme. Ọ gwọrọ nwa nwanyị ahụ. (Matiu 15:21-28) Nke ahụ bụ ịdị umeala n’obi dị ịrịba ama, ọ́ bụghị ya? Chetakwa na ezi amamihe na-adabere n’ịdị umeala n’obi.

21. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji gbalịsie ike iṅomi ụdị onye Jizọs bụ, okwu ọnụ ya, na ụzọ o si mee ihe?

21 Lee ka anyị kwesịrị isi nwee ekele na Oziọma ndị ahụ na-ekpughere anyị ihe ndị nwoke ahụ kasị mara ihe nke dịtụworo ndụ kwuru na ihe ndị o mere! Ka anyị cheta na Jizọs yiri Nna ya n’omume n’ụzọ nile. Site n’iṅomi ụdị onye Jizọs bụ, okwu ọnụ ya, na ụzọ o si mee ihe, anyị ga na-azụlite amamihe si n’elu. N’isiakwụkwọ na-esonụ, anyị ga-ahụ otú anyị pụrụ isi tinye amamihe Chineke n’ọrụ ná ndụ anyị.

^ par. 1 N’oge Bible, a na-ego ndị ọkwa nkà iwu ụlọ, ịrụ ihe ndị e ji ebi n’ụlọ, na ịrụ ihe ndị e ji arụ ọrụ ugbo. Justin Martyr, nke narị afọ nke abụọ O.A., dere banyere Jizọs, sị: “Ọ bụ omume ya bụ́ ịrụ ọrụ dị ka ọkwá nkà mgbe ọ nọ n’etiti ụmụ mmadụ, na-arụpụta ọgụ na yok.”

^ par. 6 Ngwaa Grik a sụgharịrị “na-echegbu” pụtara “ịdọpụ uche.” Dị ka e si jiri ya mee ihe na Matiu 6:25, ọ na-ezo aka n’egwu na-akpata nchegbu nke na-adọpụ ma ọ bụ na-aghasasị uche mmadụ, na-eme ka ndụ bụrụ ihe na-adịghị enye ọṅụ.

^ par. 7 N’ezie, nnyocha ndị ọkà mmụta sayensị mere egosiwo na oké nchegbu na nrụgide pụrụ ime ka anyị nwee ọrịa obi na ọtụtụ ọrịa ndị ọzọ pụrụ ime ka ndụ dịkwuo mkpụmkpụ.