Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 20

“O Nwere Obi nke Maara Ihe”—Ma Ọ Dị Umeala n’Obi

“O Nwere Obi nke Maara Ihe”—Ma Ọ Dị Umeala n’Obi

1-3. Gịnị mere anyị pụrụ iji jide n’aka na Jehova dị umeala n’obi?

OTU nna chọrọ ịkụziri obere nwa ya otu ihe dị oké mkpa. Ọ chọsiri ike iru ya n’obi. Olee otú ọ ga-esi mee ya? Ò kwesịrị iguzo nnọọ ọtọ n’ụzọ na-emenye nwa ahụ egwu ma kwuo okwu n’olu ike? Ka ò kwesịrị ihulatatụ ala otú nwatakịrị ahụ hà ma gwa ya okwu n’ụzọ dị nro, nke na-adọrọ mmasị? N’ezie, nna nke maara ihe ma dị umeala n’obi ga-ahọrọ iji ụzọ dị nro mee ihe.

2 Ụdị Nna dị aṅaa ka Jehova bụ—onye dị mpako ka ọ̀ bụ onye dị umeala n’obi, onye na-enweghị obi ebere ka ọ bụ onye dị nro? Jehova maara ihe nile, onye kasị nwee amamihe. Otú ọ dị, ị̀ chọpụtawo na inwe ihe ọmụma na ọgụgụ isi adịkebeghị eme ndị mmadụ ka ha dị umeala n’obi? Dị ka Bible na-ekwu, “ihe ọmụma na-afụli elu.” (1 Ndị Kọrint 3:19; 8:1) Ma Jehova, bụ́ onye “nwere obi nke maara ihe,” dịkwa umeala n’obi. (Job 9:4) Ọ bụghị na ọkwá ya dị ala n’ụzọ ọ bụla ma ọ bụkwanụ na ọ dịghị ebube, kama ọ dịghị mpako. N’ihi gịnị ka o ji dị otú ahụ?

3 Jehova dị nsọ. N’ihi ya, mpako, bụ́ àgwà na-emerụ emerụ, adịghị n’ime ya. (Mak 7:20-22) Ọzọ, rịba ama ihe Jeremaịa onye amụma gwara Jehova: “Mkpụrụ obi gị [Jehova n’onwe ya] aghaghị ihulata n’elu n’isi m.” * (Abụ Ákwá 3:20, NW) Cheedị echiche banyere nke ahụ! Jehova, bụ́ Eze Onyenwe eluigwe na ala, dị njikere “ihulata,” ma ọ bụ iwetu onwe ya ala otú Jeremaịa  hà, iji gee mmadụ ahụ na-ezughị okè ntị ma meere ya ihe ọ chọrọ. (Abụ Ọma 113:7) Ee, Jehova dị umeala n’obi. Ma gịnị ka ịdị umeala n’obi Chineke gụnyere? Olee ihe jikọrọ ya na amamihe? N’ihi gịnịkwa ka o ji dị anyị mkpa?

Otú Jehova Si Egosipụta na Ọ Dị Umeala n’Obi

4, 5. (a) Gịnị bụ ịdị umeala n’obi, olee otú e si egosipụta ya, n’ihi gịnịkwa ka ọ na-adịghị mgbe e kwesịrị ịghọtahie ya dị ka adịghị ike ma ọ bụ enweghị obi ike? (b) Olee otú Jehova si gosi ịdị umeala n’obi n’ụzọ o si mesoo Devid ihe, ruokwa ókè ha aṅaa ka ịdị umeala n’obi Jehova dịruru anyị mkpa?

4 Ịdị umeala n’obi bụ adịghị nganga na mpako. N’ịbụ àgwà na-esite n’obi, a na-egosipụta ịdị umeala n’obi site n’àgwà ndị dị ka ịdị nwayọọ, ndidi, na ezi uche. (Ndị Galeshia 5:22, 23) Otú ọ dị, ọ dịghị mgbe e kwesịrị iwere àgwà ndị a na-amasị Chineke dị ka adịghị ike ma ọ bụ enweghị obi ike. Ha adịghị emegide iwe ezi omume Jehova na ojiji ọ na-eji ike ibibi ihe eme ihe. Kama nke ahụ, site n’ịdị umeala n’obi ya nakwa ịdị nwayọọ ya, Jehova na-egosipụta ike dị ukwuu o nwere, bụ́ ikike o nwere inwe njide onwe onye zuru okè. (Aịsaịa 42:14) Olee ihe jikọrọ ịdị umeala  n’obi na amamihe? Otu akwụkwọ e ji eme nnyocha na Bible na-ekwu, sị: “Ná nchịkọta, a na-akọwa ịdị umeala n’obi . . . dị ka achọghị ọdịmma onwe onye nanị, ọ bụkwa ebe dị mkpa amamihe nile dabeere.” Ya mere, a pụghị inwe ezi amamihe ma ọ bụrụ na ịdị umeala n’obi adịghị. Olee otú ịdị umeala n’obi Jehova si abara anyị uru?

Nna maara ihe na-eji ịdị umeala n’obi na ụzọ dị nwayọọ na-emeso ụmụ ya ihe

5 Eze Devid bụkuru Jehova abụ, sị: “I nyewokwa m ọta nzọpụta Gị: aka nri Gị na-akwagidekwa m, umeala n’obi nke Gị na-emekwa m ka m baa ụba.” (Abụ Ọma 18:35) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, Jehova weturu onwe ya ala iji mee ihe n’ihi mmadụ nkịtị a na-ezughị okè, na-echebe ma na-enyere ya aka site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị. Devid ghọtara na ọ bụrụ na ọ ga-enweta nzọpụta—nakwa ọbụna mesịa dị ukwuu dị ka eze—ọ ga-abụ nanị n’ihi njikere Jehova dị iwetu Onwe Ya ala n’ụzọ dị otú a. N’ezie, ònye n’ime anyị ga-enwe olileanya ọ bụla maka nzọpụta ma a sị na Jehova adịghị umeala n’obi, dịrị njikere iwetu onwe ya ala iji mesoo anyị ihe dị ka Nna nke dị nro, nke na-ahụkwa n’anya?

6, 7. (a) Gịnị mere na ọ dịghị mgbe Bible kwuru na Jehova maara ebe ike ya jedebere? (b) Olee njikọ dị n’agbata ịdị nwayọọ na amamihe, ònyekwa setịpụrụ ihe nlereanya kasịnụ na nke a?

6 O kwesịrị ka a rịba ama na e nwere ọdịiche dị n’etiti ịdị umeala n’obi na mmadụ ịma ebe ike ya jedebere. Mmadụ ịma ebe ike ya jedebere bụ àgwà mara mma ụmụ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi kwesịrị ịzụlite. Dị ka ịdị umeala n’obi, e jikọtara ya na amamihe. Dị ka ihe atụ, Ilu 11:2 na-asị: “N’ebe ndị [maara ebe ike ha jedebere, NW] nọ ka amamihe dị.” Otú ọ dị, ọ dịghị mgbe ọ bụla Bible kwuru na Jehova maara ebe ike ya jedebere. N’ihi gịnị? Mmadụ ịma ebe ike ya jedebere, dị ka e si jiri ya mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ, na-egosi mmadụ ịmara n’ụzọ kwesịrị ekwesị ihe ọ na-agaghị emeli. O nweghị ihe Onye Pụrụ Ime Ihe Nile na-agaghị emeli e wezụga ihe ndị o kpebiri na ọ gaghị eme n’ihi ụkpụrụ ezi omume ya. (Mak 10:27; Taịtọs 1:2) Ọzọkwa, dị ka Onye Kasị Ihe Nile Elu, ọ dịghị onye ọ nọ n’okpuru ya. N’ihi ya, echiche nke mmadụ ịma ebe ike ya jedebere emetụtaghị Jehova ma ọlị.

7 Otú ọ dị, Jehova dị umeala n’obi, dịkwa nwayọọ. Ọ na-akụziri ndị ohu ya na ịdị nwayọọ dị oké mkpa iji nwee ezi  amamihe. Okwu ya na-ekwu banyere “ịdị nwayọọ nke dịịrị amamihe.” * (Jems 3:13) Tụlee ihe nlereanya Jehova setịpụrụ na nke a.

Jehova Ji Ịdị Umeala n’Obi Na-ekenye Ndị Ọzọ Ọrụ Ma Na-ege Ntị

8-10. (a) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe kwesịrị ịrịba ama na Jehova na-adị njikere ikenye ndị ọzọ ọrụ nakwa ige ntị? (b) Olee otú Onye Pụrụ Ime Ihe Nile siworo jiri ịdị umeala n’obi mesoo ndị mmụọ ozi ya?

8 E nwere ihe àmà na-enye obi ụtọ nke na-egosi ịdị umeala n’obi Jehova ná njikere ọ dị ikenye ndị ọzọ ọrụ nakwa ige ntị. Ọ bụ ihe ịtụnanya na ọ na-eme otú a; enyemaka ma ọ bụ ndụmọdụ adịghị Jehova mkpa. (Aịsaịa 40:13, 14; Ndị Rom 11:34, 35) N’agbanyeghị nke ahụ, Bible na-egosi anyị ugboro ugboro na Jehova na-ewedata onwe ya ala n’ụzọ ndị a.

9 Dị ka ihe atụ, tụlee otu ihe dị ịrịba ama nke mere ná ndụ Ebreham. Ebreham nwere ndị ọbịa atọ, bụ́ ndị ọ kpọrọ otu onye n’ime ha “Jehova.” N’ezie, ndị ọbịa ahụ bụ ndị mmụọ ozi, ma otu n’ime ha bịara n’aha Jehova, na-emekwa ihe n’aha Ya. Mgbe mmụọ ozi ahụ kwuru okwu ma mee ihe, ọ bụ Jehova, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, na-ekwu okwu ma na-eme ihe. Jehova si n’ụzọ dị otú a gwa Ebreham na ya anụwo “iti mkpu Sọdọm na Gọmọra.” Jehova kwuru, sị: “Ka M rịdakwa, hụ ma ọ̀ bụ dị ka iti mkpu ya si dị, nke ruru m ntị, ka ha mezuworo; ọ bụrụkwa na ọ dịghị otú a, ka M mara.” (Jenesis 18:3, 20, 21) Otú ọ dị, ozi ahụ Jehova ziri apụtaghị na Onye Pụrụ Ime Ihe Nile ‘ga-arịda’ n’onwe ya. Kama nke ahụ, ọzọkwa, o zigara ndị mmụọ ozi ịnọchite ya. (Jenesis 19:1) N’ihi gịnị? Ọ̀ bụ na Jehova, bụ́ onye na-ahụzu ihe nile apụghị ‘ịmara’ n’onwe ya ọnọdụ dị n’ógbè ahụ n’ezie? N’ezie ọ pụrụ. Ma kama nke ahụ, Jehova ji ịdị umeala n’obi nye ndị mmụọ ozi ahụ ọrụ ịchọpụta otú ọnọdụ ahụ dị na ịga hụ Lọt na ezinụlọ ya na Sọdọm.

10 Ọzọkwa, Jehova na-ege ntị. N’otu oge, ọ gwara ndị mmụọ ozi ya ka ha tụọ aro ụzọ dịgasị iche iche nke isi kwatuo ajọ Eze  Ehab. Enyemaka dị otú ahụ adịghị Jehova mkpa. Ma, o weere aro otu mmụọ ozi tụrụ ma gwa ya ka ọ gaa mee ihe ahụ ọ tụrụ aro ya. (1 Ndị Eze 22:19-22) Nke ahụ ọ́ bụghị ịdị umeala n’obi?

11, 12. Olee otú Ebreham si bịa hụ ịdị umeala n’obi Jehova?

11 Jehova dị njikere ige ọbụna ụmụ mmadụ na-ezughị okè ndị na-achọ ikwupụta nchegbu ha ntị. Dị ka ihe atụ, mgbe mbụ Jehova gwara Ebreham ebumnobi Ya ibibi Sọdọm na Gọmọra, o juru nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi anya. “Ya bụrụ Gị ihe arụ,” ka Ebreham kwuru, na-ekwukwasị: “Onyeikpe ụwa nile, Ọ́ gaghị eme ihe e kpere n’ikpe?” Ọ jụrụ ma Jehova ọ̀ ga-eme ebere ghara ibibi obodo ndị ahụ ma e nwee ike ịchọta ndị ezi omume 50 n’ebe ahụ. Jehova mesiri ya obi ike na Ya ga-eme otú ahụ. Ma Ebreham jụrụ ya ọzọ, na-ewedata ọnụ ọgụgụ ahụ ruo 45, e mesịa 40, jụrụ na-aga. N’agbanyeghị mmesi obi ike nile Jehova nyere ya, Ebreham nọgidere na-ajụ ya ruo mgbe ọnụ ọgụgụ ahụ gbadaruru n’iri. Ikekwe Ebreham aghọtachabeghị otú Jehova nweruru obi ebere. Ka o sina dị, Jehova ji ndidi na obi umeala kwere ka enyi ya na ohu ya bụ́ Ebreham kwupụta nchegbu ya n’ụzọ dị otú a.—Jenesis 18:23-33.

12 Mmadụ ole ụbụrụ na-aghọ nkọ, ndị gụrụ ezigbo akwụkwọ ga-enwe nnọọ ndidi na-ege onye ọgụgụ isi ya na-enwetụghị otú o si rutetụwa nke ha ntị? * Lee otú Chineke anyị dịruru umeala n’obi. N’otu nkwurịta okwu ahụ, Ebreham bịakwara hụ na Jehova ‘adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ.’ (Ọpụpụ 34:6) Ikekwe n’ịmata na ya ekwesịghị ịjụ Onye Kasị Ihe Nile Elu ajụjụ banyere ihe ọ chọrọ ime, Ebreham rịọrọ ugboro abụọ, sị: “Biko, ka Onyenwe anyị ghara iwe iwe dị ọkụ.” (Jenesis 18:30, 32) N’ezie, Jehova eweghị iwe dị ọkụ. O nwere n’ezie “ịdị nwayọọ nke dịịrị amamihe.”

Jehova Na-eji Ezi Uche Eme Ihe

13. Gịnị ka okwu ahụ bụ́ ‘inwe ezi uche’ pụtara dị ka e si jiri ya mee ihe na Bible, n’ihi gịnịkwa ka okwu a ji na-akọwa Jehova nke ọma?

13 Ịdị umeala n’obi Jehova na-apụtakwa ìhè n’àgwà ọzọ mara  mma—iji ezi uche eme ihe. N’ụzọ jọgburu onwe ya, àgwà a dị ụkọ n’etiti ụmụ mmadụ na-ezughị okè. Ọ bụghị nanị na Jehova dị njikere ige ihe ndị o kere eke nwere ọgụgụ isi ntị kama ọ dịkwa njikere ikwenyere ha mgbe ọ na-emegideghị ụkpụrụ ezi omume ọ bụla. Dị ka e si jiri ya mee ihe na Bible, okwu bụ́ ‘inwe ezi uche’ pụtara n’ụzọ nkịtị “ikwenye ekwenye.” Àgwà a bụkwa ihe e ji mara amamihe Chineke. Jems 3:17 na-asị: ‘Amamihe nke sitere n’elu nwere ezi uche.’ N’echiche dị aṅaa ka Jehova, onye kasị nwee amamihe na-eji ezi uche eme ihe? Otu ihe bụ na ọ na-eme mgbanwe. Cheta na aha ya na-akụziri anyị na Jehova na-eme onwe ya ka ọ ghọọ ihe ọ bụla dị mkpa iji mezuo nzube ya. (Ọpụpụ 3:14) Ọ̀ bụ na nke ahụ adịghị egosipụta mmụọ nke ime mgbanwe na inwe ezi uche?

14, 15. Ọhụụ Izikiel hụrụ banyere ụgbọ ịnyịnya eluigwe nke Jehova na-akụziri anyị gịnị banyere nzukọ eluigwe nke Jehova, oleekwa otú o si dị iche n’òtù dị iche iche dị n’ụwa?

14 E nwere otu akụkụ Bible dị ịrịba ama nke na-enyere anyị aka ịghọtatụ otú Jehova si eme mgbanwe. E mere ka Izikiel onye amụma hụ n’ọhụụ nzukọ eluigwe Jehova nke ndị mmụọ e kere eke mejupụtara. Ọ hụrụ ụgbọ ịnyịnya nke ịdị ukwuu ya na-emenye mmadụ ụjọ, bụ́ “ụgbọ” Jehova n’onwe Ya, nke ọ bụ Ya na-achịkwa ya mgbe nile. Ihe kasị adọrọ mmasị bụ otú o si aga. Nnukwute ụkwụ ndị o nwere nwegasịrị akụkụ anọ, nweekwa anya jupụtara ebe nile nke na ha nwere ike ịhụ ebe nile, ha pụkwara ịgbanwe ebe ha chere ihu ozugbo, n’akwụsịtụghị akwụsị ma ọ bụkwanụ tụgharịa atụgharịa. Nnukwute ụgbọ ịnyịnya ahụ adịghịkwa akpụ akpụ dị ka ụgbọala buru nnukwute ibu, nke mmadụ mere. Ọ pụrụ ife ọsọ dị ka àmụ̀mà, ọ pụrụ ọbụna ịtụgharị chee ihu n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe! (Ezikiel 1:1, 14-28) Ee, nzukọ Jehova na-eme mgbanwe n’ụzọ na-enweghị atụ dịkwa ka Eze pụrụ ime ihe nile nke na-achịkwa ya na-eme mgbanwe iji kwekọọ n’ọnọdụ na mkpa ndị na-agbanwe agbanwe mgbe nile bụ́ ndị ọ na-aghaghị ịhụ maka ha.

15 Nanị ihe ụmụ mmadụ pụrụ ime bụ ịgbalị iṅomi ime mgbanwe dị otú ahụ zuru okè. Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe, ụmụ mmadụ na òtù ndị ha guzobere na-ekwesi olu ike n’echiche ha kama ịdị  na-eme mgbanwe, ha na-esikarị ọnwụ kama iji ezi uche eme ihe. Iji maa atụ: Nnukwute ụgbọ mmiri na-ebu mmanụ ma ọ bụ ụgbọ okporo ígwè na-ebu ngwongwo nwere ike ibu nnọọ oké ibu ma sie ezigbo ike. Ma ọ̀ dị nke ọ bụla n’ime ha a pụrụ ịkwụsị ma ọ bụ ịnyagharị ma ihe mee na mberede? Ọ bụrụ na ihe adachie ụzọ ụgbọ okporo ígwè, ọ gaghị ekwe omume ịnyagharị ya ka o chee ihu ebe ọzọ. Ịkwụsị n’ike agaghịkwa adịrị ya mfe karị. Nnukwute ụgbọ okporo ígwè na-ebu ngwongwo pụrụ ịga ihe karịrị otu kilomita tupu ya enwee ike ịkwụsị malite na mgbe e jiri breek! N’otu aka ahụ, nnukwute ụgbọ mmiri na-ebu mmanụ pụrụ ịga ihe ruru kilomita asatọ mgbe a gbanyụsịrị injin ya tupu ya akwụsị. Ọ bụrụgodị na a gbanye injin ya ka ọ laghachiwa azụ, ụgbọ mmiri ahụ ka pụrụ ịga ihe ruru kilomita atọ n’ihu! Otú ahụ ka ọ dị òtù dị iche iche ụmụ mmadụ guzobere bụ́ ndị na-adịghị emekebe mgbanwe na ndị na-adịghị eji ezi uche eme ihe. N’ihi mpako, ndị mmadụ na-ajụkarị ime mgbanwe iji kwekọọ n’ọnọdụ na mkpa ndị na-agbanwe agbanwe. Ikwesi olu ike dị otú ahụ emewo ka ụlọ ọrụ dị iche iche daa, ọ kwatuwokwa ọbụna ọchịchị dị iche iche. (Ilu 16:18) Lee obi ụtọ anyị nwere na ma Jehova ma nzukọ ya adịghị otú ahụ ma ọlị!

Otú Jehova Si Egosi Iji Ezi Uche Eme Ihe

16. Olee otú Jehova si jiri ezi uche mee ihe n’otú o si meso Lọt ihe tupu e bibie Sọdọm na Gọmọra?

16 Chee echiche ọzọ banyere mbibi nke Sọdọm na Gọmọra. Mmụọ ozi Jehova nyere Lọt na ezinụlọ ya ntụziaka doro anya, na-asị: “Wepụga[nụ] onwe [unu] jee ugwu ahụ.” Otú ọ dị, Lọt enweghị mmasị na nke a. Ọ rịọrọ, sị: “Ee e, biko, onyenwe m.” Ebe o kwenyesiri ike na ya ga-anwụ ma ọ bụrụ na ya agbaga n’ugwu ahụ, Lọt rịọrọ ka e kwe ka ya na ezinụlọ ya gbaga n’otu obodo dị nso a na-akpọ Zoa. N’oge a, Jehova bu n’obi ibibi obodo ahụ. Ọzọkwa, e nweghị ezi ihe kpatara egwu ahụ Lọt na-atụ. N’ezie, Jehova pụrụ idebe Lọt ndụ n’ugwu ahụ! Ka o sina dị, Jehova kwenyere n’arịrịọ Lọt wee hapụ ibibi Zoa. Mmụọ ozi ahụ gwara Lọt, sị: “Lee, m hụwokwa gị ihu ọma n’okwu a.” (Jenesis  19:17-22) Nke ahụ ọ́ bụghị iji ezi uche eme ihe n’akụkụ nke Jehova?

17, 18. N’imeso ndị Ninive ihe, olee otú Jehova si gosipụta na ya na-eji ezi uche eme ihe?

17 Jehova na-anabatakwa nchegharị sitere n’obi, na-egosi obi ebere ma na-eme ihe ziri ezi mgbe nile. Cheedị echiche ihe mere mgbe e zigara Jona onye amụma n’ajọ obodo ahụ na-eme ihe ike bụ́ Ninive. Mgbe Jona gagharịrị n’okporo ámá Ninive, ozi sitere n’ike mmụọ nsọ nke ọ kpọsara dị nnọọ mfe: A ga-ebibi nnukwu obodo ahụ n’ime ụbọchị 40. Otú ọ dị, ọnọdụ gbanwere nke ukwuu. Ndị Ninive chegharịrị!—Jona, isi 3.

18 Iji otú Jehova si meghachi omume tụnyere otú Jona si meghachi omume n’ọnọdụ a gbanwerenụ ga-eme ka anyị mụta ihe. N’ebe a, Jehova mere mgbanwe, mee onwe ya ka ọ ghọọ Onye Na-agbaghara mmehie kama ịbụ “onye agha.” * (Ọpụpụ 15:3) Jona, n’aka nke ọzọ, emeghị mgbanwe, o nweghịkwa obi ebere. Kama iji ezi uche mee ihe dị ka Jehova, o meghachiri nnọọ omume dị ka ụgbọ okporo ígwè na-ebu ngwongwo ma ọ bụ nnukwute ụgbọ mmiri na-ebu mmanụ ndị e kwuru maka ha na mbụ. Ọ kpọsawo na mbibi ga-abịa, n’ihi ya mbibi aghaghị ịbịa! Otú ọ dị, Jehova ji ndidi kụziere onye amụma ya nke na-enweghị ndidi ihe ọ na-agaghị echefu echefu banyere inwe ezi uche na ebere.—Jona, isi 4.

Jehova nwere ezi uche ma na-aghọta adịghị ike anyị

19. (a) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na Jehova na-eji ezi uche eme ihe n’ihe ọ na-atụ anya ya n’aka anyị? (b) Olee otú Ilu 19:17 si egosi na Jehova bụ Nna Ukwu bụ́ ‘ezigbo onye nke nwekwara ezi uche,’ nakwa onye dị nnọọ umeala n’obi nke ukwuu?

19 N’ikpeazụ, Jehova na-egosi ezi uche n’ihe ọ na-atụ anya ya n’aka anyị. Eze Devid kwuru, sị: “Ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; Ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.” (Abụ Ọma 103:14) Jehova maara adịghị ike anyị na ezughị okè anyị karịa otú anyị onwe anyị maara. Ọ dịghị mgbe ọ na-atụ anya ka anyị mee ihe  karịa otú anyị nwere ike ime. Bible na-egosi ọdịiche dị n’etiti ndị nna ukwu bụ́ ndị “ezigbo mmadụ na ndị nwere ezi uche” na ndị “ọ na-esi ike imeta mma.” (1 Pita 2:18) Ụdị Nna Ukwu dị aṅaa ka Jehova bụ? Rịba ama ihe Ilu 19:17 na-ekwu: “Onye na-ebinye Jehova ihe ka onye na-emere onye na-enweghị ike amara bụ.” N’ụzọ doro anya, ọ bụ nanị ezigbo nna ukwu, nke ji ezi uche eme ihe ga-arịba amara ọ bụla e meere ndị na-adịghị ike ama. Tụkwasị na nke ahụ, akụkụ Akwụkwọ Nsọ a na-egosi na, n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, Onye Okike nke eluigwe na ala na-ewere ya na ya ji ụmụ mmadụ nkịtị na-eme omume obi ebere dị otú ahụ ụgwọ! Lee ịdị umeala n’obi dị ukwuu nke a bụ.

20. Mmesi obi ike dị aṅaa ka anyị nwere na Jehova na-anụ ekpere anyị ma na-aza ha?

20 Jehova na-emesokwa ndị ohu ya ihe taa n’ụzọ dị nro na n’ụzọ ezi uche dị na ya. Mgbe anyị ji okwukwe kpee ekpere, ọ na-ege anyị ntị. Ọ bụ ezie na ọ dịghị ezipụ ndị mmụọ ozi ịgwa anyị okwu, anyị ekwesịghị ikwubi na ọ dịghị aza ekpere anyị. Cheta na mgbe Pọl onyeozi gwara ndị kwere ekwe ibe ya ka ha ‘nọgide na-ekpe ekpere’ ka a tọhapụ ya n’ụlọ mkpọrọ, o kwukwasịrị: “Ka e wee weghachi m n’ebe unu nọ n’isi nso karị.” (Ndị Hibru 13:18, 19) Ya mere, ekpere anyị nwere ike n’ezie ịkpali Jehova ime ihe ngwa ngwa karịa otú ọ gaara eme ma a sị na anyị ekpeghị ekpere!—Jems 5:16.

21. Gịnị ka anyị na-ekwesịghị ikwubi ma ọlị banyere ịdị umeala n’obi Jehova, kama nke ahụ, gịnị ka anyị kwesịrị ịghọta banyere ya?

 21 N’ezie, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ụzọ ndị a Jehova si egosipụta ịdị umeala n’obi ya—ịdị nwayọọ n’obi ya, njikere ọ dị ige ntị, ndidi ya, iji ezi uche eme ihe ya—nke pụtara na Jehova na-emebi ụkpụrụ ezi omume ya. Ndị ụkọchukwu nke Krisendọm pụrụ iche na ha na-eji ezi uche eme ihe mgbe ha na-eme ka ntị na-akọ ìgwè atụrụ ha ọkọ site n’ime ka ha ghara iji ụkpụrụ omume ọma Jehova kpọrọ ihe. (2 Timoti 4:3) Ma àgwà ụmụ mmadụ nke bụ́ imebi ụkpụrụ iji nweta ihe a chọrọ ozugbo enweghị ihe jikọrọ ya na iji ezi uche eme ihe nke Chineke. Jehova dị nsọ; ọ dịghị mgbe ọ ga-emerụ ụkpụrụ ezi omume ya. (Levitikọs 11:44) Ya mere, ka anyị hụ iji ezi uche eme ihe nke Jehova n’anya n’ihi na ọ bụ ya bụ inwe ezi uche n’ezie—ihe àmà na-egosi ịdị umeala n’obi ya. Ọ́ dịghị enye nnukwute obi ụtọ iche n’echiche na Jehova Chineke, bụ́ Onye kasị mara ihe n’eluigwe na ala, dịkwa umeala n’obi n’ụzọ na-enweghị atụ? Lee ihe na-enye obi ụtọ ọ bụ ịbịaru Chineke a dị ebube ma dịrị nwayọọ n’obi nso, onye na-enwe ndidi, nke na-eji ezi uche eme ihe!

^ par. 3 Ndị odeakwụkwọ oge ochie, ma ọ bụ ndị Sopherim, gbanwere amaokwu a ka o kwuo na ọ bụ Jeremaịa na-ehulata, ọ bụghị Jehova. Ihe àmà na-egosi na ha chere na o kwesịghị ekwesị ịsị na Chineke mere ihe dị otú ahụ na-egosi ịdị umeala n’obi. N’ihi ya, ọtụtụ nsụgharị aghọtaghị isi ihe dị n’amaokwu a magburu onwe ya. Otú ọ dị, The New English Bible kwuru n’ụzọ ziri ezi na Jeremaịa na-agwa Chineke sị: “Cheta, biko cheta, ma hulatara m ala.”

^ par. 7 Nsụgharị ndị ọzọ na-asị “ịdị umeala n’obi nke na-esite n’amamihe” na “ịdị nwayọọ ahụ nke bụ́ ihe e ji mara amamihe.”

^ par. 12 N’ụzọ na-adọrọ mmasị, Bible gosiri ọdịiche dị n’etiti ndidi na ịfụli onwe onye elu. (Eklisiastis 7:8) Ndidi Jehova na-enyekwu ihe àmà na-egosi ịdị umeala n’obi ya.—2 Pita 3:9.

^ par. 18 N’Abụ Ọma 86:5, e kwuru na Jehova ‘dị mma ma na-agbaghara mmehie.’ Mgbe a sụgharịrị abụ ọma ahụ gaa n’asụsụ Grik, a sụgharịrị okwu bụ́ “na-agbaghara mmehie” ịbụ e·pi·ei·kesʹ, ma ọ bụ “inwe ezi uche.”