Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 19

‘Amamihe Chineke nke Dị n’Ihe Nzuzo Dị Nsọ’

‘Amamihe Chineke nke Dị n’Ihe Nzuzo Dị Nsọ’

1, 2. Olee “ihe nzuzo dị nsọ” nke kwesịrị ịdọrọ mmasị anyị, n’ihi gịnịkwa?

IHE NZUZO! Ọtụtụ mgbe, ọ na-esiri ụmụ mmadụ ike ịghara ikpughe ha n’ihi na ha na-akpali akpali, na-adọrọ mmasị, ma dị mgbagwoju anya. Otú ọ dị, Bible na-ekwu, sị: “Ọ bụ nsọpụrụ Chineke izobe okwu.” (Ilu 25:2) Ee, dị ka Eze Na-achị Isi na Onye Okike, n’ụzọ ziri ezi Jehova na-ezochi ihe ụfọdụ ka ihe a kpọrọ mmadụ ghara ịma ha ruo mgbe oge ọ ga-eji kpughee ha ruru.

2 Otú ọ dị, e nwere ihe nzuzo na-akpali akpali ma na-adọrọ mmasị nke Jehova kpugheworo n’ime Okwu ya. A na-akpọ ya “ihe nzuzo dị nsọ nke uche [Chineke].” (Ndị Efesọs 1:9) Ịmata ihe banyere ya ga-eme ihe karịrị imejụ ọchịchọ gị ịmata ihe. Ịmata ihe nzuzo a pụrụ iduga ná nzọpụta, meekwa ka ị ghọtatụ amamihe Jehova nke na-enweghị nsọtụ.

E Ji nke Nta nke Nta Kpughee Ya

3, 4. Olee otú amụma ahụ e dekọrọ na Jenesis 3:15 si eme ka e nwee olileanya, oleekwa ihe omimi, ma ọ bụ ‘ihe nzuzo dị nsọ’ ọ na-agụnye?

3 Mgbe Adam na Iv mehiere, ọ pụrụ iyiworị ka e mebiwo nzube Jehova nke ime ka e nwee ụwa paradaịs nke ụmụ mmadụ zuru okè bi n’ime ya. Ma Chineke mere ihe ozugbo banyere nsogbu ahụ. O kwuru, sị: “Iro ka M ga-etinyekwa n’etiti gị [agwọ ahụ] na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya: mkpụrụ ahụ ga-echifịa gị n’isi, gị onwe gị ga-echifịakwa ya n’ikiri ụkwụ.”—Jenesis 3:15.

4 Okwu ndị a bụ okwu dị mgbagwoju anya ma sie ike ịghọta. Ònye bụ nwanyị a? Ònye bụ agwọ ahụ? Ònye bụ “mkpụrụ” ahụ nke ga-echifịa agwọ ahụ n’isi? Nanị ihe Adam na Iv pụrụ ime bụ ịkọ nkọ. Otú ọ dị, okwu Chineke na-enye onye ọ  bụla kwesịrị ntụkwasị obi n’ime ụmụ di na nwunye ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi olileanya. Ezi omume ga-enwe mmeri. Nzube Jehova ga-emezu. Ma ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụ ihe nzuzo! Bible kpọrọ ya “amamihe Chineke dị n’ihe nzuzo dị nsọ.”—1 Ndị Kọrint 2:7.

5. Mee ihe atụ iji gosi ihe mere Jehova ji na-ekpughe izu nzuzo ya nke nta nke nta.

5 Dị ka ‘Onye na-ekpughe ihe nzuzo nile,’ Jehova ga-emesịa kpughee ihe ndị dị mkpa banyere otú ihe nzuzo a ga-esi mezuo. (Daniel 2:28) Ma ọ ga-eji nwayọọ nwayọọ na-ekpughe ya, nke nta nke nta. Iji maa atụ, anyị pụrụ iche echiche otú nna na-ahụ n’anya ga-esi zaghachi obere nwa ya mgbe ọ jụrụ ya sị, “Papa, olee ebe m si pụta?” Nna maara ihe ga-agwa obere nwa ahụ nanị ihe ọ ga-enwe ike ịghọta. Ka nwata ahụ na-etolitekwu, nna ya na-akọkwuru ya ihe ndị ọzọ. N’ụzọ yiri nke ahụ, Jehova na-ekpebi mgbe oge ruru ka o kpugheere ndị ya uche na nzube ya.—Ilu 4:18; Daniel 12:4.

6. (a) Gịnị na-abụ nzube nke ọgbụgba ndụ, ma ọ bụ nkwekọrịta? (b) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe kwesịrị ịrịba ama na Jehova bu ụzọ mee ihe n’ime ka ya na ụmụ mmadụ banye n’ọgbụgba ndụ?

6 Olee otú Jehova si kpughee izu nzuzo ndị dị otú ahụ? O sitere n’ọgbụgba ndụ, ma ọ bụ nkwekọrịta dị iche iche, kpughee ihe buru ibu. Ma eleghị anya, ọ dịtụwo mgbe gị na mmadụ bara ná nkwekọrịta—ikekwe maka ịzụ ụlọ, ịgbaziri ma ọ bụ ịgbazinye ego. Nkwekọrịta dị otú ahụ bụ ihe mmesi obi ike iwu kwadoro nke na-eme ka e jide n’aka na a ga-emezu ihe ndị e kwekọrịtara na ha. Ma gịnị mere ọ ga-eji dị mkpa ka Jehova na ụmụ mmadụ banye n’ọgbụgba ndụ, ma ọ bụ nwee nkwekọrịta? N’ezie, okwu o kwuru bụ mmesi obi ike zuru ezu iji jide n’aka na ọ ga-emezu nkwa ya. Nke ahụ bụ eziokwu, ma n’agbanyeghị nke ahụ, Chineke ji nnọọ nkwekọrịta iwu kwadoro mesie okwu ya ike ọtụtụ mgbe. Nkwekọrịta ndị a siri ike na-eme ka anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-ezughị okè nwee ihe  ndabere siri ike ọbụna karị mere anyị ga-eji nwee obi ike ná nkwa dị iche iche nke Jehova.—Ndị Hibru 6:16-18.

Ọgbụgba Ndụ Ya na Ebreham

7, 8. (a) Olee ọgbụgba ndụ Jehova na Ebreham gbara, na-eme ka a ghọtakwuo gịnị banyere ihe nzuzo ahụ dị nsọ? (b) Olee otú Jehova si jiri nke nta nke nta mee ka a mata usoro ọmụmụ Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa ga-esite na ya?

7 Ihe karịrị puku afọ abụọ ka a chụpụsịrị mmadụ na Paradaịs, Jehova gwara Ebreham, bụ́ ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “M ga-emekwa ka mkpụrụ gị baa ụba dị ka kpakpando nke eluigwe . . . ọ bụkwa ná mkpụrụ gị ka mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha; n’ihi na i gewo ntị n’olu m.” (Jenesis 22:17, 18) Ihe a abụghị nanị ikwe nkwa; Jehova kwuru ya dị ka ọgbụgba ndụ nke iwu kwadoro ma kwadoo ya site n’iyi ọ ṅụrụ nke ọ na-adịghị ihe pụrụ imebi ya. (Jenesis 17:1, 2; Ndị Hibru 6:13-15) Lee ihe dị ịrịba ama ọ bụ na Eze Onyenwe Anyị banyere ná nkwekọrịta n’ezie ịgọzi ihe a kpọrọ mmadụ!

‘M ga-eme ka mkpụrụ gị baa ụba dị ka kpakpando nke eluigwe’

8 Ọgbụgba ndụ Ebreham ahụ kpughere na Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa ga-abịa dị ka mmadụ, n’ihi na ọ ga-esite n’eriri Ebreham. Ma ònye ka ọ ga-abụ? Ka oge na-aga, Jehova kpughere na n’ime ụmụ Ebreham, na ọ bụ Aịzik ga-abụ nna nna nke Mkpụrụ ahụ. N’ime ụmụ abụọ Aịzik mụrụ, a họọrọ Jekọb. (Jenesis 21:12; 28:13, 14) Ka oge na-aga, Jekọb kwuru okwu ndị a bụ́ amụma banyere otu n’ime ụmụ ya 12, sị: “Mkpanaka eze agaghị esi n’ebe Juda nọ wezụga onwe ya, mkpanaka nke onye na-enye ụkpụrụ agaghị esikwa n’etiti ụkwụ ya abụọ wezụga onwe ya, ruo mgbe Shaịlo [“Onye Ọ Dịịrị”] ga-abịa; Ọ bụkwa ya ga-enwe ịṅa ntị ndị dị iche iche.” (Jenesis 49:10) Ugbu a, a matawo na Mkpụrụ ahụ ga-abụ eze, onye ga-esite n’eriri Juda!

Ọgbụgba Ndụ Ya na Izrel

9, 10. (a) Ọgbụgba ndụ dị aṅaa ka Jehova na mba Izrel gbara, nchebe dịkwa aṅaa ka ọgbụgba ndụ ahụ nyere ha? (b) Olee otú Iwu ahụ si gosi mkpa ihe mgbapụta dị ihe a kpọrọ mmadụ?

9 N’afọ 1513 T.O.A., Jehova mere ndokwa nke doziri ụzọ  maka ikpughekwu ihe ndị ọzọ banyere ihe nzuzo ahụ dị nsọ. Ya na ụmụ Ebreham, bụ́ mba Izrel, gbara ndụ. Ọ bụ ezie na ọ dịkwaghị irè ugbu a, ọgbụgba ndụ Iwu Mozis a bụ akụkụ dị oké mkpa ná nzube Jehova nke ime ka a mụọ Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa. N’ụzọ dị aṅaa? Tụlee ụzọ atọ. Nke mbụ, Iwu ahụ yiri mgbidi nke bụ́ ihe nchebe. (Ndị Efesọs 2:14) Ụkpụrụ ezi omume ndị dị n’ime iwu ahụ rụrụ ọrụ dị ka ihe mgbochi nke kewara ndị Juu na ndị Jentaịl. Ya mere, Iwu ahụ nyere aka chebe usoro ọmụmụ nke Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa. Karịsịa n’ihi nchebe ahụ, mba ahụ ka dị adị mgbe oge nke Chineke ruru ka a mụọ Mezaịa ahụ n’ebo Juda.

10 Nke abụọ, Iwu ahụ gosiri n’ụzọ doro nnọọ anya mkpa ihe mgbapụta dị ihe a kpọrọ mmadụ. Ebe ọ bụ Iwu zuru okè, o kpughere na ụmụ mmadụ enweghị ike idebe ya n’ụzọ zuru ezu. O si otú a “mee ka mmebi iwu pụta ìhè, ruo mgbe mkpụrụ ahụ ga-abịarute, bụ́ onye e kweworo nkwa ahụ.” (Ndị Galeshia 3:19) Site n’àjà ụmụ anụmanụ, Iwu ahụ kpuchiri mmehie ruo nwa oge. Ma ebe ọ bụ na “ọ dịghị ekwe ọbara ụmụ oké ehi na nke ewu omume iwepụ mmehie,” dị ka Pọl dere, nanị ihe àjà ndị a mere bụ ise onyinyo àjà mgbapụta Kraịst. (Ndị Hibru 10:1-4) Mgbe ahụ, nye ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi, ọgbụgba ndụ ahụ ghọrọ ‘onye nduzi nke na-eduga na Kraịst.’—Ndị Galeshia 3:24.

11. Ohere dị aṅaa magburu onwe ya ka ọgbụgba ndụ Iwu ahụ mere ka Izrel nwee, ma n’ihi gịnị ka o ji kwaa mba ahụ n’ozuzu ya?

11 Nke atọ, ọgbụgba ndụ ahụ mere ka mba Izrel nwee ohere magburu onwe ya. Jehova gwara ha na ọ bụrụ na ha ekwesị ntụkwasị obi n’ọgbụgba ndụ ahụ, ha ga-aghọ “alaeze ndị nchụàjà, na mba dị nsọ.” (Ọpụpụ 19:5, 6) E mesịrị si n’Izrel anụ ahụ́ nweta ndị mbụ so n’alaeze ndị nchụàjà nke eluigwe. Otú ọ dị, Izrel, n’ozuzu ya, nupụrụ isi n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, jụ Mkpụrụ ahụ bụ́ Mezaịa, ohere ahụ akwaakwa ha. Oleezi ndị a ga-eji mezuo alaeze ndị nchụàjà ahụ? Oleekwa ihe ga-ejikọ mba ahụ a gọziri agọzi na Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa? A ga-ekpughe akụkụ ndị ahụ nke ihe nzuzo ahụ dị nsọ mgbe oge Chineke ruru.

 Ọgbụgba Ndụ Alaeze nke Devid

12. Ọgbụgba ndụ dị aṅaa ka Jehova so Devid gbaa, oleekwa otú ọgbụgba ndụ ahụ si mee ka a ghọtakwuo ihe nzuzo dị nsọ nke Chineke?

12 Na narị afọ nke 11 T.O.A., Jehova mere ka a ghọtakwuo ihe nzuzo ahụ dị nsọ mgbe ọ banyere n’ọgbụgba ndụ ọzọ. O kwere Eze Devid kwesịrị ntụkwasị obi nkwa, sị: “M ga-emekwa ka o bilie, bụ́ mkpụrụ gị nke ga-anọchi gị, . . . M ga-emekwa ka alaeze ya guzosie ike. . . . M ga-emekwa ka ocheeze nke alaeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.” (2 Samuel 7:12, 13; Abụ Ọma 89:3) Ugbu a, e wedatakwuwo usoro ọmụmụ Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa ga-esi na ya pụta n’ezinụlọ Devid. Ma mmadụ nkịtị ọ̀ ga-achịli ‘ruo mgbe ebighị ebi’? (Abụ Ọma 89:20, 29, 34-36) Eze dịkwa otú ahụ bụ́ mmadụ ọ̀ ga-enwe ike ịnapụta ihe a kpọrọ mmadụ ná mmehie na ọnwụ?

13, 14. (a) Dị ka Abụ Ọma 110 si kwuo, olee nkwa Jehova kwere Eze ya e tere mmanụ? (b) Olee ihe ndị ọzọ e kpughere banyere Mkpụrụ ahụ na-abịanụ site n’ọnụ ndị amụma Jehova?

13 Site ná nduzi nke mmụọ nsọ, Devid dere, sị: “Ihe nke si n’ọnụ Jehova pụta na-asị onyenwe m, Nọdụ ala n’aka nri m, ruo mgbe M ga-edo ndị iro gị ka ihe mgbakwasị dịịrị ụkwụ gị abụọ. Jehova aṅụsiwo iyi ike, Ọ gaghị echegharịkwa uche Ya, Gị onwe gị bụ onye nchụàjà ruo mgbe ebighị ebi dị ka usoro Melkizedek si dị.” (Abụ Ọma 110:1, 4) Ihe ndị ahụ Devid kwuru na-emetụta Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa, ma ọ bụ Mezaịa ahụ, kpọmkwem. (Ọrụ 2:35, 36) Eze a ga-achị, ọ bụghị site na Jeruselem, kama site n’eluigwe, “n’aka nri” Jehova. Nke ahụ ga-eme ka ọ na-achị, ọ bụghị nanị ala Izrel, kama ụwa dum. (Abụ Ọma 2:6-8) Ọ dị ihe ọzọ e kpughere n’ebe a. Rịba ama na Jehova ṅụrụ iyi n’ụzọ siri ike na Mezaịa ahụ ga-abụ “onye nchụàjà . . . dị ka usoro Melkizedek si dị.” Dị ka Melkizedek, bụ́ onye jere ozi dị ka eze bụ́ onye nchụàjà n’oge Ebreham, ọ bụ Chineke ga-eji aka ya họpụta Mkpụrụ ahụ na-abịanụ ka ọ bụrụ Eze na Onye Nchụàjà!—Jenesis 14:17-20.

14 N’ime ọtụtụ afọ gafeworonụ, Jehova ji ndị amụma ya kpughekwuo ihe ndị ọzọ banyere ihe nzuzo ya dị nsọ. Dị ka ihe atụ, Aịzaịa kpughere na Mkpụrụ ahụ ga-anwụ ọnwụ ịchụ  àjà. (Aịsaịa 53:3-12) Maịka buru amụma ebe a ga-amụ Mezaịa ahụ. (Maịka 5:2) Ọbụna Daniel buru amụma kpọmkwem oge Mkpụrụ ahụ ga-apụta na oge ọ ga-anwụ.—Daniel 9:24-27.

E Kpughee Ihe Nzuzo ahụ Dị Nsọ!

15, 16. (a) Olee otú Ọkpara Jehova si si “na nwanyị pụta”? (b) Gịnị ka Jizọs ketara site n’aka nne na nna ya bụ́ mmadụ, oleekwa mgbe ọ pụtara dị ka Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa?

15 Otú amụma ndị a ga-esi mezuo nọgidere na-abụ ihe omimi ruo mgbe Mkpụrụ ahụ pụtara n’ezie. Ndị Galeshia 4:4 na-ekwu, sị: “Mgbe ozuzu nke oge ahụ ruru, Chineke zipụrụ Ọkpara ya, bụ́ onye si na nwanyị pụta.” N’afọ 2 T.O.A., otu mmụọ ozi gwara otu nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ́ onye Juu, aha ya bụ Meri, sị: “Lee! ị ga-atụrụ ime n’akpa nwa gị ma mụọ nwa nwoke, ị ga-akpọkwa aha ya Jizọs. Onye a ga-abụ onye ukwu, a ga-akpọkwa ya Ọkpara nke Onye Kasị Elu; Jehova Chineke ga-enyekwa ya ocheeze nke Devid bụ́ nna ya . . . Mmụọ nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye Kasị Elu ga-ekpuchikwa gị. N’ihi nke ahụkwa, a ga-akpọ onye ahụ a ga-amụ onye nsọ, Ọkpara Chineke.”—Luk 1:31, 32, 35.

16 Mgbe e mesịrị, Jehova si n’eluigwe bufee ndụ Ọkpara ya n’akpa nwa Meri, nke mere ka ọ bụrụ na o si na nwanyị pụta. Meri bụ nwanyị na-ezughị okè. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs eketaghị ezughị okè site n’aka ya, n’ihi na ọ bụ “Ọkpara Chineke.” N’otu oge ahụ, nne na nna Jizọs ndị bụ́ mmadụ, ebe ha sitere n’eriri Devid, mere ka O nwee ikike sitere n’ọmụmụ nakwa nke iwu kwadoro ịbụ onye nketa Devid. (Ọrụ 13:22, 23) Mgbe e mere Jizọs baptizim na 29 O.A., Jehova ji mmụọ nsọ tee ya mmanụ ma kwuo, sị: “Nke a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya.” (Matiu 3:16, 17) N’ikpeazụ, Mkpụrụ ahụ apụtawo! (Ndị Galeshia 3:16) Oge eruwo ka e kpughekwuo ihe banyere ihe nzuzo ahụ dị nsọ.—2 Timoti 1:10.

17. Olee otú e si mee ka a ghọtakwuo ihe Jenesis 3:15 pụtara?

17 N’oge ọ na-eje ozi ya, Jizọs mere ka a mata agwọ ahụ e kwuru maka ya na Jenesis 3:15 dị ka Setan, ka a matakwa mkpụrụ nke agwọ ahụ dị ka ụmụazụ Setan. (Matiu 23:33; Jọn  8:44) Ka oge na-aga, e kpughere otú a ga-esi gwepịa ha nile ruo mgbe ebighị ebi. (Mkpughe 20:1-3, 10, 15) A matakwara nwanyị ahụ dị ka “Jeruselem nke dị n’elu,” bụ́ nzukọ eluigwe nke Jehova, nke ndị mmụọ e kere eke mejupụtara, nke yiri nwunye. *Ndị Galeshia 4:26; Mkpughe 12:1-6.

Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ Ahụ

18. Gịnị bụ nzube nke “ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ”?

18 Ma eleghị anya e kpughere ihe kasị dị ịrịba ama n’abalị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi banyere “ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ.” (Luk 22:20) Dị ka ọgbụgba ndụ nke bu ya ụzọ, bụ́ ọgbụgba ndụ Iwu Mozis, ọgbụgba ndụ ọhụrụ a gaje ime ka e nwee “alaeze ndị nchụàjà.” (Ọpụpụ 19:6; 1 Pita 2:9) Otú ọ dị, ọgbụgba ndụ a ga-eguzobe, ọ bụghị mba anụ ahụ́, kama mba ime mmụọ, bụ́ “Izrel nke Chineke,” nke ihe ga-emejupụta ya bụ nanị ndị na-eso ụzọ Kraịst bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi. (Ndị Galeshia 6:16) Ndị a so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ga-esonyere Jizọs n’ịgọzi agbụrụ mmadụ!

19. (a) N’ihi gịnị ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ji nwee ike ime ka e nwee “alaeze ndị nchụàjà”? (b) N’ihi gịnị ka e ji na-akpọ Ndị Kraịst e tere mmanụ “ihe e kere ọhụrụ,” mmadụ olekwa ga-eso Kraịst jee ozi n’eluigwe?

19 Ma n’ihi gịnị ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ji nwee ike ime ka e nwee “alaeze ndị nchụàjà” iji gọzie ihe a kpọrọ mmadụ? Ọ bụ n’ihi na, kama ịma ndị na-eso ụzọ Kraịst ikpe dị ka ndị mmehie, o mere ka o kwe omume ịgbaghara ha mmehie ha site n’àjà ọ chụrụ. (Jeremaịa 31:31-34) Ozugbo a gụrụ ha ná ndị ezi omume n’anya Jehova, ọ na-anabata ha n’ime ezinụlọ ya nke eluigwe, ọ na-ejikwa mmụọ nsọ tee ha mmanụ. (Ndị Rom 8:15-17; 2 Ndị Kọrint 1:21) N’ụzọ dị otú a, ha na-aghọ ndị ‘a mụrụ ọzọ inwe olileanya dị ndụ, inweta ihe nketa nke  e debere n’eluigwe.’ (1 Pita 1:3, 4) Ebe ọ bụ na ọnọdụ dị otú ahụ e buliri elu bụ nnọọ ihe ọhụrụ nye ụmụ mmadụ, a na-akpọ Ndị Kraịst e tere mmanụ e ji mmụọ nsọ mụọ, “ihe e kere ọhụrụ.” (2 Ndị Kọrint 5:17) Bible na-ekpughe na 144,000 ga-emesịa soro n’ịchị ihe a kpọrọ mmadụ a gbapụtara agbapụta, site n’eluigwe.—Mkpughe 5:9, 10; 14:1-4.

20. (a) Olee ihe e kpughere banyere ihe nzuzo ahụ dị nsọ na 36 O.A.? (b) Olee ndị ga-enweta ngọzi ndị ahụ e kwere Ebreham ná nkwa?

20 Ndị a e tere mmanụ tinyere Jizọs bụ ha ghọrọ “mkpụrụ Ebreham.” * (Ndị Galeshia 3:29) Ndị mbụ a họọrọ bụ ndị Juu anụ ahụ́. Ma n’afọ 36 O.A., e kpughere akụkụ ọzọ nke ihe nzuzo ahụ dị nsọ: ndị Jentaịl, ma ọ bụ ndị na-abụghị ndị Juu, ga-esokwa nwee olileanya eluigwe ahụ. (Ndị Rom 9:6-8; 11:25, 26; Ndị Efesọs 3:5, 6) Ọ̀ bụ nanị Ndị Kraịst e tere mmanụ ga-enweta ngọzi ndị ahụ e kwere Ebreham ná nkwa? Ee e, n’ihi na àjà Jizọs chụrụ baara ụwa dum uru. (1 Jọn 2:2) Ka oge na-aga, Jehova kpughere na “oké ìgwè mmadụ” a na-ekwughị ọnụ ọgụgụ ha ga-adị ndụ gafere ọgwụgwụ usoro ihe Setan. (Mkpughe 7:9, 14) A ga-akpọlite ọtụtụ ụmụ mmadụ ndị ọzọ n’ọnwụ, na-enye ha ohere nke ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs!—Luk 23:43; Jọn 5:28, 29; Mkpughe 20:11-15; 21:3, 4.

Amamihe Chineke na Ihe Nzuzo ahụ Dị Nsọ

21, 22. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ihe nzuzo dị nsọ nke Jehova si egosipụta amamihe ya?

21 Ihe nzuzo ahụ dị nsọ bụ ngosipụta dị ịtụnanya nke “amamihe dịgasị iche iche nke Chineke.” (Ndị Efesọs 3:8-10) Lee oké amamihe Jehova gosipụtara n’ichepụta ihe nzuzo a, nakwa n’iji nnọọ nke nta nke nta na-ekpughe ya! O ji amamihe chebara erughị eru nke ụmụ mmadụ echiche, na-enye ha ohere igosipụta ihe dị ha n’obi n’ezie.—Abụ Ọma 103:14.

22 Jehova gosikwara amamihe na-enweghị atụ n’ịhọrọ Jizọs  dị ka Eze. A pụrụ ịtụkwasị Ọkpara Jehova obi karịa onye ọ bụla ọzọ e kere eke n’eluigwe na ala. N’ịdị ndụ dị ka mmadụ nke nwere anụ ahụ́ na ọbara, Jizọs tara ụdị ahụhụ dị iche iche. Ọ ghọtara n’ụzọ zuru ezu nsogbu ụmụ mmadụ na-enwe. (Ndị Hibru 5:7-9) Oleekwanụ banyere ndị ha na Jizọs ga-eso chịa? N’ime ọtụtụ narị afọ gafeworonụ, e tewo ma ndị ikom ma ndị inyom—ndị e si n’agbụrụ, asụsụ, na nzụlite nile họrọ—mmanụ. Ọ dịghị ụdị nsogbu ọ bụla nke ọ na-enwebeghị onye n’ime ha chere ya ihu ma merie ya. (Ndị Efesọs 4:22-24) Ibi n’okpuru ịchịisi nke ndị eze a bụ́kwa ndị nchụàjà, ndị nwere obi ebere, ga-abụ ihe obi ụtọ!

23. Ihe ùgwù dị aṅaa ka Ndị Kraịst nwere n’ihe banyere ihe nzuzo dị nsọ nke Jehova?

23 Pọl onyeozi dere, sị: ‘E mewo ka ihe nzuzo ahụ dị nsọ nke e zoro ezo eri usoro ihe dị iche iche gara aga na eri ọgbọ ndị gara aga, pụta ìhè nye ndị nsọ ya.’ (Ndị Kọlọsi 1:26) Ee, ndị nsọ e tere mmanụ nke Jehova abịawo ghọta ihe dị ukwuu banyere ihe nzuzo ahụ dị nsọ, ha emewokwa ka ọtụtụ nde mmadụ soro ha nwee ihe ọmụma dị otú ahụ. Lee ihe ùgwù anyị nile nwere! Jehova ‘emewo ka anyị mara ihe nzuzo dị nsọ nke uche ya.’ (Ndị Efesọs 1:9) Ka anyị na-akọrọ ndị ọzọ banyere ihe nzuzo a dị ịtụnanya, na-enyere ha aka n’otu aka ahụ inyoba anya n’amamihe na-enweghị nsọtụ nke Jehova Chineke!

^ par. 17 E kpughekwara “ihe nzuzo [ahụ] dị nsọ banyere nsọpụrụ Chineke” n’ime Jizọs. (1 Timoti 3:16) Ọ bụwo ihe nzuzo, ihe omimi, ruo ogologo oge ma ọ̀ dị onye pụrụ iguzosi ike n’ezi ihe n’ụzọ zuru okè nye Jehova. Jizọs kpughere azịza ya. O guzosiri ike n’ezi ihe n’ule nile Setan lere ya.—Matiu 4:1-11; 27:26-50.

^ par. 20 Jizọs sokwa otu ìgwè ahụ ‘gbaa ndụ maka alaeze.’ (Luk 22:29, 30) Ya bụ na Jizọs so “ìgwè atụrụ nta” banye ná nkwekọrịta na ha ga-eso ya chịa n’eluigwe dị ka akụkụ nke abụọ nke mkpụrụ Ebreham.—Luk 12:32.