Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 22

“Amamihe nke Sitere n’Elu” Ọ̀ Na-arụ Ọrụ ná Ndụ Gị?

“Amamihe nke Sitere n’Elu” Ọ̀ Na-arụ Ọrụ ná Ndụ Gị?

1-3. (a) Olee otú Solomọn si gosipụta amamihe na-enweghị atụ n’ụzọ o si dozie esemokwu metụtara onye ọ bụ ya mụrụ nwa? (b) Gịnị ka Jehova kwere nkwa inye anyị, oleekwa ajụjụ ndị na-ebilite?

Ọ BỤ ikpe tara akpụ—ụmụ nwanyị abụọ nọ na-azọ otu nwa ọhụrụ. Ụmụ nwanyị ahụ bi n’otu ụlọ, nke ọ bụla n’ime ha mụrụ nwa nwoke, nanị ụbọchị ole na ole ka otu mụsịrị nwa, onye nke ọzọ amụọ nke ya. Otu n’ime ụmụaka ahụ nwụrụ, onye nke ọ bụla n’ime ụmụ nwanyị abụọ ahụ nọ na-ekwu na ọ bụ ya mụrụ nwa nke dị ndụ. * E nweghị ndị akaebe hụrụ ihe merenụ. Ma eleghị anya e lebawo anya n’ikpe ahụ n’ụlọikpe dị ala ma e kpebighị ya. N’ikpeazụ, e wegaara Solomọn, bụ́ eze Izrel, okwu ahụ. Ọ̀ ga-enwe ike ịchọpụta nke bụ́ eziokwu?

2 Mgbe o geworo ntị ruo oge ụfọdụ ka ụmụ nwanyị ahụ nọ na-arụrịta ụka, Solomọn kwuru ka e wetara ya mma agha. Mgbe ahụ, dị ka à ga-asị na o kpebisiri ike ime ya, o nyere iwu ka a kpọwaa nwa ahụ ụzọ abụọ, nye nwanyị nke ọ bụla otu ọkara. Ozugbo ahụ, nke bụ́ nne ya n’ezie rịọrọ eze ka o kuru nwa ọhụrụ ahụ—nwa ya dị oké ọnụ ahịa—kunye nwanyị nke ọzọ. Ma nwanyị nke ọzọ nọgidere na-esi ọnwụ ka a kpọwaa nwa ahụ ụzọ abụọ. Ugbu a, Solomọn amatala nke bụ́ eziokwu. Ọ maara mmetụta ọmịiko dị nro nne na-enwe n’ebe nwa o buru n’afọ ya nọ, o jikwa ihe ahụ ọ maara mee ihe n’idozi esemokwu a. Cheedị echiche otú obi ga-esi ruo nke ahụ bụ́ nne ya ala mgbe Solomọn kunyere ya nwa ya wee sị: “Nwanyị a bụ nne ya.”—1 Ndị Eze 3:16-27.

 3 Amamihe na-enweghị atụ, ọ́ bụghị ya? Mgbe ndị mmadụ nụrụ otú Solomọn si kpebie ikpe ahụ, ha tụrụ egwu “n’ihi na ha hụrụ na amamihe Chineke dị n’ime ya.” Ee, amamihe Solomọn nwere bụ onyinye sitere n’aka Chineke. Jehova enyewo ya “obi maara ihe na nke na-aghọta ihe.” (1 Ndị Eze 3:12, 28) Ma olee banyere anyị? Anyị onwe anyị kwa, ànyị pụrụ inweta amamihe Chineke? Ee, n’ihi na Solomọn dere site n’ike mmụọ nsọ, sị: “Jehova na-enye amamihe.” (Ilu 2:6) Jehova na-ekwe nkwa inye ndị ji ezi obi na-achọ ya amamihe—ikike iji ihe ọmụma, nghọta, na izuzu eme ihe nke ọma. Olee otú anyị pụrụ isi nweta amamihe nke sitere n’elu? Oleekwa otú anyị pụrụ isi jiri ya na-eme ihe ná ndụ anyị?

“Nweta Amamihe”—N’ụzọ Dị Aṅaa?

4-7. Gịnị bụ ihe anọ a chọrọ iji nweta amamihe?

4 Ànyị ga-enwerịrị ọgụgụ isi dị ukwuu ma ọ bụ gụọ oké akwụkwọ iji nweta amamihe Chineke? Ee e. Jehova dị njikere inyetụ anyị amamihe ya n’agbanyeghị ọnọdụ anyị ma ọ bụ ókè anyị gụruru akwụkwọ. (1 Ndị Kọrint 1:26-29) Ma anyị aghaghị ibu ụzọ mee ihe, n’ihi na Bible na-agba anyị ume ‘inweta amamihe.’ (Ilu 4:7) Olee otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ?

5 Nke mbụ, ọ dị anyị mkpa ịdị na-atụ Chineke egwu. Ilu 9:10 na-ekwu, sị: “Mmalite amamihe ka egwu Jehova bụ [“nzọụkwụ mbụ n’inweta amamihe,” The New English Bible].” Egwu Chineke bụ ntọala nke ezi amamihe. N’ihi gịnị? Cheta na amamihe na-agụnye ikike iji ihe ọmụma na-eme ihe nke ọma. Ịtụ Chineke egwu abụghị ịma jijiji n’ihu ya n’ihi oké ụjọ, kama ọ bụ iji nsọpụrụ, nkwanye ùgwù, na ntụkwasị obi na-akpọrọ ya isiala. Egwu dị otú ahụ dị mma ma na-akpali akpali nke ukwuu. Ọ na-akpali anyị ime ka ndụ anyị kwekọọ n’ihe ọmụma anyị nwere banyere uche Chineke na ụzọ o si eme ihe. Ọ dịghị ụzọ ọzọ amamihe dị na ya karị anyị pụrụ ịgbaso, n’ihi na ụkpụrụ Jehova na-eme mgbe nile ka ndị na-agbaso ha rite uru kasị ukwuu.

6 Nke abụọ, anyị aghaghị ịdị umeala n’obi na ịmata ebe ike anyị jedebere. Mmadụ apụghị inwe amamihe Chineke ma ọ bụrụ na ọ dịghị umeala n’obi ma mara ebe ike ya jedebere. (Ilu  11:2) N’ihi gịnị? Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi ma mara ebe ike anyị jedebere, anyị na-adị njikere ikweta na anyị amaghị ihe nile, nakwa na echiche anyị adịghị ezi ezi mgbe nile, nakwa na ọ dị anyị mkpa ịmata ihe bụ́ uche Jehova n’okwu dịgasị iche iche. Jehova “na-emegide ndị mpako,” ma ọ na-enwe obi ụtọ inye ndị dị umeala n’obi amamihe.—Jems 4:6.

Iji nweta amamihe Chineke, anyị aghaghị itinye mgbalị iji gwupụta ya

7 Ihe nke atọ dị oké mkpa bụ ịmụ Okwu Chineke e dere ede. A na-ekpughe amamihe Jehova n’ime Okwu ya. Iji nweta amamihe ahụ, anyị aghaghị itinye mgbalị iji gwupụta ya. (Ilu 2:1-5) Ihe nke anọ a chọrọ bụ ekpere. Ọ bụrụ na anyị arịọ Chineke n’obi eziokwu maka amamihe, ọ ga-enye anyị ya n’ụba. (Jems 1:5) Ọ ga-aza ekpere anyị na-ekpe maka enyemaka nke mmụọ ya. Mmụọ ya pụkwara ime ka anyị nwee ike ịchọta akụ̀ dị oké ọnụ ahịa ndị dị n’Okwu ya, bụ́ ndị pụrụ inyere anyị aka idozi nsogbu dị iche iche, izere ihe ize ndụ, na ime mkpebi ndị amamihe dị na ha.—Luk 11:13.

8. Ọ bụrụ na anyị enwetawo amamihe Chineke n’ezie, olee otú ọ ga-esi pụta ìhè?

8 Dị ka anyị hụrụ n’Isi nke 17, amamihe Jehova dị irè. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị enwetawo amamihe Chineke n’ezie, ọ ga-apụta ìhè n’ụzọ anyị si akpa àgwà. Jems onye na-eso ụzọ kọwara mkpụrụ nke amamihe Chineke na-amịpụta mgbe o dere, sị: “Amamihe nke sitere n’elu bu ụzọ dị ọcha, na-emekwa udo, nwee ezi uche, dị njikere irube isi, jupụta n’ebere na ezi mkpụrụ, ọ dịghị eji ile mmadụ anya n’ihu na-eme nkewa, ọ dịghị ihu abụọ.” (Jems 3:17) Ka anyị na-atụle nke ọ bụla n’akụkụ ndị a nke amamihe Chineke, anyị pụrụ ịjụ onwe anyị, sị, ‘Amamihe ahụ sitere n’elu ọ̀ na-arụ ọrụ ná ndụ m?’

Ọ “Dị Ọcha, Na-emekwa Udo”

9. Gịnị ka ịdị ọcha pụtara, n’ihi gịnịkwa ka o ji bụrụ ihe dabara adaba na ịdị ọcha bụ àgwà mbụ e depụtara amamihe nwere?

9 O “bu ụzọ dị ọcha.” Ịdị ọcha pụtara enweghị ntụpọ na mmerụ, ọ bụghị nanị n’elu ahụ́ kamakwa n’ime. Bible na-ejikọta amamihe na obi, ma amamihe nke sitere n’eluigwe apụghị ịbanye n’ime obi nke echiche, ọchịchọ, na ebumnobi ọjọọ merụrụ. (Ilu 2:10; Matiu 15:19, 20) Otú ọ dị, ọ bụrụ na obi anyị  dị ọcha—ya bụ, ruo ókè ọ ga-ekwe ụmụ mmadụ na-ezughị okè omume—anyị ‘ga-esi n’ihe ọjọọ wezụga onwe anyị ma mee ezi ihe.’ (Abụ Ọma 37:27; Ilu 3:7) Ọ̀ bụ na ọ dabaghị adaba na ịdị ọcha bụ àgwà mbụ e depụtara amamihe nwere? E kwuwerị, ọ bụrụ na anyị adịghị ọcha n’omume na n’ụzọ ime mmụọ, olee otú anyị pụrụ isi gosipụta n’eziokwu àgwà ndị nke ọzọ nke amamihe sitere n’elu?

10, 11. (a) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị bụrụ ndị na-eme udo? (b) Ọ bụrụ na ị chọpụta na i mejọwo onye gị na ya na-efekọ ofufe, olee otú ị pụrụ isi gosi na ị bụ onye na-eme udo? (Leekwa ihe odide ala ala peeji.)

10 “Na-emekwa udo.” Amamihe nke sitere n’eluigwe na-akpali anyị ịchọ udo, nke bụ́ mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke. (Ndị Galeshia 5:22) Anyị na-agbalịsi ike izere ịkpaghasị ‘ihe nkekọ nke udo,’ nke na-eme ka ndị Jehova dị n’otu. (Ndị Efesọs 4:3) Anyị na-emekwa ike anyị nile ime ka udo dịghachi mgbe a kpaghasịrị ya. N’ihi gịnị ka nke a ji dị mkpa? Bible na-ekwu, sị: “Nọgidenụ . . . na-ebi n’udo; Chineke nke ịhụnanya na nke udo ga-anọnyekwara unu.” (2 Ndị Kọrint 13:11) Ọ bụrụhaala na anyị anọgide na-ebi n’udo, Chineke nke udo ga-anọnyere anyị. Ụzọ anyị si emeso ndị anyị na ha na-efekọ ofufe na-enwe mmetụta kpọmkwem ná mmekọrịta anyị na Jehova. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị bụ ndị na-eme udo? Tụlee otu ihe atụ.

11 Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ị chọpụta na i mejọwo onye gị na ya na-efekọ ofufe? Jizọs sịrị: “Ya mere, ọ bụrụ na ị na-ewega onyinye gị n’ebe ịchụàjà, i wee cheta n’ebe ahụ na o nwere ihe nwanne gị nwere megide gị, hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụàjà, pụọkwa; buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo, mgbe ahụkwa, mgbe ị bịaghachiworo, nye onyinye gị.” (Matiu 5:23, 24) Ị pụrụ itinye ndụmọdụ ahụ n’ọrụ site n’ibu ụzọ jekwuru nwanna gị. Na-eburu gịnị n’obi? ‘Ime ka gị na ya dị n’udo.’ * Iji mezuo  nke ahụ, ọ pụrụ ịdị mkpa ka i kweta na i mejọrọ ya, ọ bụghị ikwu na i mejọghị ya. Ọ bụrụ na i jekwuru ya n’ebumnobi nke ime ka gị na ya dịghachi n’udo ma nọgide na-enwe echiche ahụ, o yiri ka a pụrụ idozi nghọtahie ọ bụla, rịọ mgbaghara dị ka o kwesịrị, ma gosi mgbaghara. Mgbe i mere ihe nile ị pụrụ ime iji mee udo, ị na-egosi na amamihe Chineke na-eduzi gị.

“Nwee Ezi Uche, Dị Njikere Irube Isi”

12, 13. (a) Gịnị ka okwu a sụgharịrị “nwee ezi uche” na Jems 3:17 pụtara? (b) Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị nwere ezi uche?

12 “Nwee ezi uche.” Gịnị ka inwe ezi uche pụtara? Dị ka ndị ọkà mmụta si kwuo, okwu Grik e ji mee ihe mgbe e dere Bible bụ́ nke a sụgharịrị ịbụ “nwee ezi uche” na Jems 3:17 siri ike ịsụgharị. Ndị nsụgharị ejiriwo okwu ndị dị ka “ịdị nwayọọ,” “inwe ndidi,” na “nchebara echiche” mee ihe. Ihe odide ala ala peeji nke dị na New World Translation na-egosi na ihe ọ  pụtara n’ụzọ nkịtị bụ “ikwenye ekwenye.” Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta na akụkụ a nke amamihe ahụ sitere n’elu na-arụ ọrụ n’ime anyị?

13 Ndị Filipaị 4:5 na-ekwu, sị: “Ka inwe ezi uche unu bụrụ nke mmadụ nile maara.” Nsụgharị ọzọ na-agụ, sị: “Ka e jiri inwe ezi uche mara unu.” (The New Testament in Modern English, nke J. B. Phillips sụgharịrị) Rịba ama na ihe bụ́ okwu abụkebeghị ihe anyị na-eche banyere onwe anyị; ọ bụ otú ndị ọzọ si ele anyị anya, ihe e ji mara anyị. Onye nwere ezi uche adịghị eme mgbe nile nanị ihe iwu kwuru ma ọ bụ na-esi ọnwụ ka e mee ihe otú o si chọọ. Kama nke ahụ, ọ na-adị njikere ige ndị ọzọ ntị, mgbe o kwesịkwara ekwesị, ikwenye n’ihe ha chọrọ. Ọ na-emesokwa ndị ọzọ ihe n’ụzọ dị nwayọọ, ọ bụghị n’aka ike ma ọ bụ n’obi ọjọọ. Ọ bụ ezie na nke a dị oké mkpa nye Ndị Kraịst nile, ọ dị mkpa karịsịa nye ndị na-eje ozi dị ka ndị okenye. Ịdị nwayọọ na-adọta ndị ọzọ, na-eme ka ndị okenye bụrụ ndị a pụrụ ijekwuru. (1 Ndị Tesalonaịka 2:7, 8) Ọ ga-adị mma ka anyị nile jụọ onwe anyị sị, ‘À maara m dị ka onye na-echebara ndị ọzọ echiche, onye na-ekwenye ekwenye, na onye dị nwayọọ?’

14. Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta na anyị “dị njikere irube isi”?

14 Ọ “dị njikere irube isi.” Ọ dịghị ebe ọzọ okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “dị njikere irube isi” dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Dị ka otu ọkà mmụta si kwuo, ‘a na-ejikarị okwu a eme ihe n’ihe banyere ọzụzụ a na-enye ndị agha.’ Ọ na-enye echiche nke ịbụ onye ọ “dị mfe ime ka o kwenye” na ịbụ onye ‘na-edo onwe onye n’okpuru.’ Onye amamihe nke sitere n’elu na-achị na-ekwenye ngwa ngwa n’ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu. A maghị ya dị ka onye ọ na-abụ o kpebie ihe ọ ga-eme, ọ gaghị ekwe ka ihe ọ bụla bụ́ ihe mere eme, nke megidere ihe o bu n’obi, mee ya ịgbanwe echiche ya. Kama nke ahụ, ọ na-eme mgbanwe ngwa ngwa mgbe e gosiri ya ihe àmà doro anya sitere n’Akwụkwọ Nsọ nke na-egosi na o mewo mkpebi ma ọ bụ ruo ná nkwubi okwu na-ezighị ezi. Ọ̀ bụ ihe ahụ ka ndị ọzọ ji mara gị?

 “Jupụta n’Ebere na Ezi Mkpụrụ”

15. Gịnị bụ ebere, n’ihi gịnịkwa ka o ji daba adaba na e hotakọtara “ebere” na “ezi mkpụrụ” na Jems 3:17?

15 “Jupụta n’ebere na ezi mkpụrụ.” * Ebere bụ akụkụ dị mkpa nke amamihe ahụ sitere n’elu, n’ihi na e kwuru na amamihe dị otú ahụ ‘jupụtara n’ebere.’ Rịba ama na e hotakọtara “ebere” na “ezi mkpụrụ.” Nke a dabara adaba, n’ihi na n’ime Bible, ebere na-ezokarị aka n’ime ihe iji gosi nchegbu maka ndị ọzọ, ọmịiko nke na-arụpụta ọtụtụ omume obiọma. Otu akwụkwọ e ji eme nnyocha na-akọwa ebere dị ka “inwe mwute n’ihi ọnọdụ ọjọọ mmadụ nọ na ya na ịgbalị ime ihe banyere ya.” N’ihi ya, amamihe Chineke abụghị nke na-enweghị mmetụta, nke obi tara mmiri, ma ọ bụ nke a gụtara n’akwụkwọ. Kama nke ahụ, ọ na-egosi ịhụnanya, na-esite n’obi, ma na-egosi mmetụta. Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta na anyị jupụtara n’ebere?

16, 17. (a) Tụkwasị n’inwe ịhụnanya n’ebe Chineke nọ, gịnị na-akpali anyị ikere òkè n’ọrụ nkwusa, n’ihi gịnịkwa? (b) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ isi gosi na anyị jupụtara n’ebere?

16 N’ezie, otu ụzọ dị mkpa isi mee ya bụ izi ndị ọzọ ozi ọma Alaeze Chineke. Gịnị na-akpali anyị ịrụ ọrụ a? N’ụzọ bụ́ isi, ọ bụ ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ. Ma, ebere, ma ọ bụ ọmịiko maka ndị ọzọ, na-akwalikwa anyị. (Matiu 22:37-39) Ọtụtụ ndị taa bụ ndị ‘a gbara akpụkpọ, chụsasịakwa, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.’ (Matiu 9:36) Ndị ọzụzụ atụrụ okpukpe ụgha elegharawo ha anya ma mee ka ha kpuo ìsì n’ụzọ ime mmụọ. N’ihi ya, ha amaghị banyere ndụmọdụ amamihe dị na ya nke dị n’Okwu Chineke ma ọ bụ ngọzi ndị Alaeze ahụ ga-eweta n’ụwa a n’isi nso. Mgbe anyị si otú a na-atụgharị uche ná mkpa ime mmụọ nke ndị gbara anyị gburugburu nwere, ọmịiko si anyị n’obi na-akpali anyị ime ihe nile anyị nwere ike ime iji kọọrọ ha banyere nzube ịhụnanya nke Jehova.

Mgbe anyị na-emere ndị ọzọ ebere ma ọ bụ na-egosi ha ọmịiko, anyị na-egosipụta “amamihe nke sitere n’elu”

17 N’ụzọ ndị ọzọ dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ isi gosi na anyị jupụtara n’ebere? Cheta ihe atụ Jizọs banyere onye Sameria ahụ  nke hụrụ onye njem tọgbọ n’akụkụ ụzọ, bụ́ onye a pụnaara ihe ma tie ihe. N’ịbụ onye nwere ọmịiko, onye Sameria ahụ “mesoro ya ihe n’obi ebere,” kechie ọnyá nke onye ahụ e merụrụ ahụ́ ma lekọta ya. (Luk 10:29-37) Nke a ọ́ dịghị egosi na ebere na-agụnye inyere ndị nọ ná mkpa aka n’ụzọ pụtara ìhè? Bible na-agwa anyị ka anyị “na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ nile nọ, ma karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ.” (Ndị Galeshia 6:10) Tụlee ụfọdụ ọnọdụ pụrụ ịdapụta. Ọ pụrụ ịdị onye kwere ekwe ibe anyị nke meworo agadi mkpa ka a na-ebuga ya nzukọ Ndị Kraịst ma na-ebulata ya. Nwanyị di ya nwụrụ nke nọ n’ọgbakọ pụrụ ịchọ enyemaka n’idozi ihe ndị mebiri emebi n’ụlọ ya. (Jems 1:27) “Okwu ọma” pụrụ ịdị onye dara mbà n’obi mkpa iji mee ka obi dị ya mma. (Ilu 12:25) Mgbe anyị gosiri ebere n’ụzọ ndị dị otú ahụ, anyị na-enye ihe àmà na-egosi na amamihe nke sitere n’elu na-arụ ọrụ n’ime anyị.

“Ọ Dịghị Eji Ile Mmadụ Anya n’Ihu Na-eme Nkewa, Ọ Dịghị Ihu Abụọ”

18. Ọ bụrụ na amamihe nke sitere n’elu na-eduzi anyị, gịnị ka anyị na-aghaghị ịgbalịsi ike iwepụ n’obi anyị, n’ihi gịnịkwa?

18 “Ọ dịghị eji ile mmadụ anya n’ihu na-eme nkewa.” Amamihe Chineke na-emeri ajọ mbunobi megide agbụrụ ụfọdụ na mpako n’ihi mba mmadụ si na ya. Ọ bụrụ na amamihe dị otú ahụ na-eduzi anyị, anyị ga-agbalịsi ike iwepụ n’ime obi anyị, omume ọ bụla nke imelara mmadụ ihe. (Jems 2:9) Anyị adịghị emelara ndị ọzọ ihe n’ihi otú ha gụruru akwụkwọ, otú ha nweruru ego, ma ọ bụ ibu ọrụ ha nwere n’ọgbakọ; anyị adịghịkwa eleda onye nke ọ bụla n’ime ndị anyị na ha na-efekọ ofufe anya n’agbanyeghị otú o yiri ka ha dịruru ala. Ọ bụrụ na Jehova egosiwo ndị dị otú ahụ ịhụnanya ya, n’ezie anyị kwesịrị ile ha anya dị ka ndị ruru eru ịbụ ndị anyị ga-ahụ n’anya.

19, 20. (a) Olee otú e si nweta okwu Grik maka “onye ihu abụọ”? (b) Olee otú anyị si egosipụta “mmetụta ụmụnna nke ihu abụọ na-adịghị ya,” n’ihi gịnịkwa ka nke a ji dị mkpa?

19 “Ọ dịghị ihu abụọ.” Okwu Grik maka “onye ihu abụọ” pụrụ izo aka n’ebe “onye na-eme ihe nkiri nke mere otu akụkụ n’ihe nkiri” nọ. N’oge ochie, ndị Gris na ndị Rom na-eme ihe nkiri  na-eyi ihe mkpuchi ihu buru ibu mgbe ha na-eme ihe nkiri. N’ihi ya, a malitere iji okwu Grik maka “onye ihu abụọ” na-eme ihe maka onye na-eme ka ọ bụ ihe ọ na-abụghị, ma ọ bụ onye na-aghọ aghụghọ. Akụkụ a nke amamihe Chineke kwesịrị imetụta, ọ bụghị nanị otú anyị si emeso ndị anyị na ha na-efekọ ofufe, kamakwa mmetụta anyị n’ebe ha nọ.

20 Pita onyeozi kwuru na ‘isi anyị na-erubere eziokwu ahụ’ kwesịrị ịrụpụta “inwe mmetụta ụmụnna nke ihu abụọ na-adịghị ya.” (1 Pita 1:22) Ee, mmetụta ịhụnanya anyị nwere n’ebe ụmụnna anyị nọ agaghị abụ ma ọlị ihe na-esighị n’obi. Anyị adịghị eyi ihe mkpuchi ihu ma ọ bụ na-eme ka anyị bụ ihe anyị na-abụghị iji ghọgbuo ndị ọzọ. Mmetụta ịhụnanya anyị aghaghị ịbụ nke ọma ya, nke si anyị n’obi. Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ, ndị kwere ekwe ibe anyị ga-atụkwasị anyị obi, n’ihi na ha ga-ama na anyị bụ ihe anyị na-egosi na anyị bụ. Ụdị ime ihe n’eziokwu ahụ na-eme ka Ndị Kraịst na-enwe mmekọrịta nke e ji eziokwu na-eme ihe na ya, nke na ha pụrụ ịgwa ibe ha obi ha, ọ na-enyekwa aka eme ka ndị nọ n’ọgbakọ na-atụkwasịrịta ibe ha obi.

 “Chebe Ezi Amamihe”

21, 22. (a) Olee otú Solomọn si daa n’ichebe amamihe? (b) Olee otú anyị pụrụ isi chebe amamihe, oleekwa uru anyị ga-erite n’ime otú ahụ?

21 Amamihe Chineke bụ onyinye si n’aka Jehova nke anyị kwesịrị ichebe. Solomọn kwuru, sị: “Nwa m, . . . chebe [ezi amamihe, NW] na izuzu.” (Ilu 3:21) N’ụzọ dị mwute, Solomọn n’onwe ya emeghị nke ahụ. Ọ nọgidere na-abụ onye maara ihe ogologo oge nile o nwere obi na-anụ ihe. Ma n’ikpeazụ, ọtụtụ ndị nwunye ya bụ́ ndị ala ọzọ mere ka obi ya si n’ofufe dị ọcha nke Jehova pụọ. (1 Ndị Eze 11:1-8) Ihe ọ rụpụtaara Solomọn na-egosi na ihe ọmụma abachaghị uru ma ọ bụrụ na anyị ejighị ya mee ihe nke ọma.

22 Olee otú anyị pụrụ isi chebe ezi amamihe? Ọ bụghị nanị na anyị aghaghị ịdị na-agụchi Bible na akwụkwọ ndị dabeere na Bible anya, ndị “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-ewepụta, kama anyị aghaghịkwa ịgbalịsi ike ịdị na-etinye ihe anyị na-amụta n’ọrụ. (Matiu 24:45) Anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji na-etinye amamihe Chineke n’ọrụ. Ọ na-eme ka anyị bie ndụ ka mma ugbu a. Ọ na-eme ka anyị nwee ike ‘ijidesi aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie’—ndụ n’ime ụwa ọhụrụ Chineke. (1 Timoti 6:19) Nke kasịkwa nke, ịzụlite amamihe nke sitere n’elu na-eme ka anyị bịarukwuo isi iyi nke amamihe nile, bụ́ Jehova Chineke, nso.

^ par. 1 Dị ka 1 Ndị Eze 3:16 si kwuo, ụmụ nwanyị abụọ ahụ bụ ndị akwụna. Akwụkwọ bụ́ Insight on the Scriptures na-ekwu, sị: “Ọ pụrụ ịbụ na ụmụ nwanyị a bụ ndị akwụna, ọ bụghị n’echiche nke iji ya na-achụ ego, kama ha bụ ụmụ nwanyị kwaworo iko, ha pụrụ ịbụ ndị inyom bụ́ ndị Juu ma ọ bụ, ikekwe ha pụrụ nnọọ ịbụ ụmụ nwanyị ndị si mba ọzọ.”—Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

^ par. 11 Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ ‘mee ka gị na ya dị n’udo’ sitere na ngwaa pụtara “‘ịgbanwe ihe, inyerịta ihe,’ n’ihi ya kwa, ‘ikpezi.’” Ya mere ebumnobi gị bụ ịgbanwe, iwepụ iwe n’obi onye ahụ e mejọrọ, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee.—Ndị Rom 12:18.

^ par. 15 Nsụgharị ọzọ sụgharịrị okwu ndị a ịbụ “jupụta n’ọmịiko na ọrụ ọma.”—A Translation in the Language of the People, nke Charles B. Williams sụgharịrị.